Etu anyị si mepụta akwa 'Goddess Drip' na-ewu ebe niile.

Etu anyị si mepụta akwa 'Goddess Drip' na-ewu ebe niile.

Udoaku Eze na Chigozie Ndubuisi bụ ụmụagbọhọ abụọ na-emesi ihe ike n’ihe gbasara ịchepụta na ịmepụta akwa.

Ha gwara BBC Igbo na ha bidoro ịnwe mmasị maka akwa kamgbe ha bụ ụmụakwụkwọ.

Ụlọọrụ ha aha ya bụ ‘Udoaku’ akwaala akwa nke ọtụtụ ndị ama ama nke gụnyere Toke Makinwa, Moet Abebe na Linda Ikeji yirila uwe ha.

Udoakụ

Ha kọwara BBC Igbo etu ha siri site n’azụụlọ ha ma nwee ụlọọrụ ha na-emepụịta akwa ha ugbua nke dị n’Abuja.

Ha kwukwara maka etu akwa ha chepụtara ma mepụta nke a kpọrọ ‘Goddess Drip” siri gazuo ebe niile kama enweghị onye ma na ọ bụ ha mere ya.

Kirie akụkọ ha n’uju ebe a.