Etu m si bụrụ ọkaibe n'ọrụ 'Mechanic' ụgbọala – Ukamaka Maluze
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
Otu nwaagbọghọ na-eme ihe na-atụ ọha n’anya akọwala ihe kara ya obi o jiri wụba ọrụ na-atụ ụmụnwoke n’ọnụ ọ fọdụzie ụmụnwaanyị.
Nwada Ukamaka Maluze malitere inwe mmasị n’ọrụ ịrụzị na nhazị ụgbọala nke Bekee na-akpọ ọrụ ‘mechanic’ mgbe ọ dị naanị afọ 15.
Ka o si kwuo, mmasị a malitere dịka ya na nne ya na-eresi ndị ọrụ ngo nakwa ndị ọrụ ‘mechanic’ nrị n’akụkụ Benue.
O kwukwara na ịgba nkiri ka ọ nọ na-eme ebe ahụ ma sizie n’ụzọ malite ịmụta ọrụ ahụ.
Nwada Maluze kwukwara na n’ihi ọ ka bụ nwata mgbe ahụ, ndị kuziri ya ọrụ ahụ anaghị ya ego ma kuziere ya ya bụ ọrụ n’efu.
Ukoamaka bụ onye Eziagu, Enugu steeti mana o bizi n’Owerri, Imo steeti ebe ọ na-arụ ya bụ ọrụ n’uju ugbua.


Agbanyeghị na o nweghị ụlọọrụ nke ya, ọ na-eji ọba ozi ịntanetị enweta ndị ọ na-arụrụ ụgbọala ha ma kwukwa na ọ na-aga be ndị ụgbọala mebiri ma ha kpọtụ ya n’ekwentị maọbụ n’ọba ozi intanetị ya.
Enweghị ego ịrụ isi ụlọọrụ nke ya egbochighi ya imezu ebumnobi ya n’ọrụ ahụ.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ihe na-echere ya aka mgba n’ọrụ ahụ ọkachasị dịka ọ bụ nwaanyị mana ọ naghị ekwe ka ihe ndị ahụ kụdaa mmụọ kama ọ na-aga n’ihu na-agba mbọ.

Ukamaka onye dịzị afọ 24 ugbua kwuru na ụmụnwaanyị ibe ya anaghị enwe emesa ya enyi n’ihi ha na-elele ya dịka onye na-eme ihe dị aṅa.
O kwukwara na etu ọrụ ahụ siri bụrụ ihe na-adịghị mfe ime na-emekwa ọ naghị enwe efe eso ụmụnwaanyị ibe ha na-eme ngagharị n’obodo.
Agbanyeghi nke a, ọ sị na ọ naghị ele ihu onye ọbụla anya ma abịa n'okwu akaraka ya.
Nwada Maluze dụrụ ọha ndụmọdụ banyere ifu ntutu taa n’okwu mmadụ imezu ihe ọ ma bụ akaraka ya.
Kirie ihe onyonyo dị n'elu akụkọ a ka ị nụrụ ihe o kwuru n’uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu.



