Etu m si bụrụ ọkaibe n'ọrụ 'Mechanic' ụgbọala – Ukamaka Maluze

Aha onyonyo, Ụmụnwaanyị ibe m na-agbara m ọsọ maka na m bụ ‘mechanic’ – Ukoamaka Maluze
Etu m si bụrụ ọkaibe n'ọrụ 'Mechanic' ụgbọala – Ukamaka Maluze
    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Otu nwaagbọghọ na-eme ihe na-atụ ọha n’anya akọwala ihe kara ya obi o jiri wụba ọrụ na-atụ ụmụnwoke n’ọnụ ọ fọdụzie ụmụnwaanyị.

Nwada Ukamaka Maluze malitere inwe mmasị n’ọrụ ịrụzị na nhazị ụgbọala nke Bekee na-akpọ ọrụ ‘mechanic’ mgbe ọ dị naanị afọ 15.

Ka o si kwuo, mmasị a malitere dịka ya na nne ya na-eresi ndị ọrụ ngo nakwa ndị ọrụ ‘mechanic’ nrị n’akụkụ Benue.

O kwukwara na ịgba nkiri ka ọ nọ na-eme ebe ahụ ma sizie n’ụzọ malite ịmụta ọrụ ahụ.

Nwada Maluze kwukwara na n’ihi ọ ka bụ nwata mgbe ahụ, ndị kuziri ya ọrụ ahụ anaghị ya ego ma kuziere ya ya bụ ọrụ n’efu.

Ukoamaka bụ onye Eziagu, Enugu steeti mana o bizi n’Owerri, Imo steeti ebe ọ na-arụ ya bụ ọrụ n’uju ugbua.

Ukamaka Maluze kwuru na ọ naghị ele ihu onye ọbụla anya ma abịa n'okwu akaraka ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ukamaka Maluze kwuru na ọ naghị ele ihu onye ọbụla anya ma abịa n'okwu akaraka ya.

Agbanyeghị na o nweghị ụlọọrụ nke ya, ọ na-eji ọba ozi ịntanetị enweta ndị ọ na-arụrụ ụgbọala ha ma kwukwa na ọ na-aga be ndị ụgbọala mebiri ma ha kpọtụ ya n’ekwentị maọbụ n’ọba ozi intanetị ya.

Enweghị ego ịrụ isi ụlọọrụ nke ya egbochighi ya imezu ebumnobi ya n’ọrụ ahụ.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ihe na-echere ya aka mgba n’ọrụ ahụ ọkachasị dịka ọ bụ nwaanyị mana ọ naghị ekwe ka ihe ndị ahụ kụdaa mmụọ kama ọ na-aga n’ihu na-agba mbọ.

Ndị ọrụ mechanic na-ahazịrị ndị mmadụ ụgbọala ha.
Nkọwa foto, Ndị ọrụ mechanic na-ahazịrị ndị mmadụ ụgbọala ha.

Ukamaka onye dịzị afọ 24 ugbua kwuru na ụmụnwaanyị ibe ya anaghị enwe emesa ya enyi n’ihi ha na-elele ya dịka onye na-eme ihe dị aṅa.

O kwukwara na etu ọrụ ahụ siri bụrụ ihe na-adịghị mfe ime na-emekwa ọ naghị enwe efe eso ụmụnwaanyị ibe ha na-eme ngagharị n’obodo.

Agbanyeghi nke a, ọ sị na ọ naghị ele ihu onye ọbụla anya ma abịa n'okwu akaraka ya.

Nwada Maluze dụrụ ọha ndụmọdụ banyere ifu ntutu taa n’okwu mmadụ imezu ihe ọ ma bụ akaraka ya.

Kirie ihe onyonyo dị n'elu akụkọ a ka ị nụrụ ihe o kwuru n’uju.

Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu.