Ndị mmadụ che na ọkụ ga-adọgbu m mgbe m na-amụ ọrụ 'electrician' - Adaeze Chukwuneke
Ndị mmadụ che na ọkụ ga-adọgbu m mgbe m na-amụ ọrụ 'electrician' - Adaeze Chukwuneke
Adaeze Chukwuneke bú nwaanyị na-arụ ọrụ dịka onye na-atọda ọkụ latrik n'ụlọ.
Chukwuneke kwuru na enweghị ihe ịbụ nwaanyị gbochiri ya ịrụ ya bụ ọrụ.
O kwuru na agbanyeghị na nna ya bụ onye ọkụ latrịk, kama na ọ bụ mgbe ọ nọ na mahadum ka ọ hụrụ ebe a na-arụ ya bụ ọrụ ọ were masị ya.

O kwuru na ihe chere ya aka mgba ụfodụ mgbe bụ na ọbụghị ebe niile akpọrọ ya maka ọrụ ka naanị ya ga-eso gaa n'ihi na ọ bụ nwaanyị, o kwuru sị, " a na m akpọ onye ọrụ m aga ụfọdụ ebe a kpọrọ m ọrụ n'ihi na m bụ nwaanyị".
Ọ kọwara na ọ na-eji ụmunwoke abụọ maọbụ atọ ka ha tinyere ya aka n'ọrụ.
Chukwuneke kwuru ka ụmụ nwanyị ibe ya ndị nọ nkịtị bido aka ọrụ ma sị kwa na ọ dị njikere ikuziri onye ọbụla chọrọ ịmụta ọrụ ọ na-arụ.






