Ihe m ji hapụ ọrụ ‘Telecoms’ mepụtawa ‘Yogurt’ – Kingsley Mbah
Otu nwoke aha ya bụ Kingsley Chukwumerije Mbah akọwala ihe mere o ji hapụ ọrụ na-enye ya ezigbo ego wụbazie ọrụ nke ya onwe ya bụ ọrụ mmepụta mmiri ara ehi gbara ụka Bekee na-akpọ ‘Yogurt’. Maazị Mbah kọwara etu mkpebi ime nke a siri ghara ịdịrị ya mfe n’ihi na mgbe ahụ ọ maghị ma ya bụ atụmatụ aga amịta mkpụrụ.

O kwukwara na ọrụ nke mmepụta ‘Yoghurt’ a abụrụla ezigbo ihe uru dịịrị ya na ezinaụlọ ya, ọkachasị nwunye bụ onye malitere ya bụ ọrụ kpọmkwem tupu ọ gawa mba Amerịka maka agụmakwụkwọ ya.
O nyere ndị ntorobịa nwere atụmatụ imelite ọrụ nke ha ọtụtụ ndụmọdụ banyere etu ha ga-esi meri ọtụtụ ihe ndị na-echere ụlọọrụ ndị ka na-etolite etolite aka mgba na Naịjirịa.
Na mkparịtaụka a Maazị Mbah na BBC Igbo nwere, o kọwakwara etu ya na nwunye ya si malite ọrụ n’ime obi ụlọ ha ma gbagide mbọ ruo ugbua nke bụ na ha e nweela ndị ọrụ ruru asaa nakwa ndị ọrụ ngo karịrị abụọ.
O kọwakwara etu ha siri malite ire ngwa ahịa naanị na Legọs steeti ma mwụbaa na-erezị ya bụ ngwa ahịa na steeti Naịjriịa karịrị 14.
Kirie ihe onyonyo a ka ịhụ ihe ndị Maazị Mbah na nwunye ya kwuru n’uju ebe a.
Ndị mere akụkọ a bụ Makuochi Okafor na Vining Ogu.



