Ntụliaka Gana - kedụ ihe na-eme?

Ngụkọ ntụliaka 2012

Ebe foto si, AFP

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Gana eruola inwe onyeisiala ọhụrụ dịka ha mechara ntụliaka n'ọnwa Disemba - osote onyeisiala ha nke ugbua bụ Mahamudu Bawumia na onye bụbu onyeisi obodo bụ John Mahama bụ mmadụ abụọ nọ nwereike imeri ntụliaka ahụ.

Nana Akufo-Addo a họpụtara nke mbụ n'afọ 2016 na-akwado ịgaru n'isi njedebe n'ọchịchị ya nke ugboro abụọ.

Njirimara ntuliaka Ghana BBC rụpụtara

Kedụ mgbe a na-ahazi ntụliaka ozuru ọha ọnụ?

N'ụbọchị Satọde 7 Disemba, ụmụafọ Gana ruru nde iri na asatọ na ụma asatọ (18.8m) debanyere aha maka ịtụ vootu ga-enwe ike sonye na ntụliaka nke itolu kemgbe anabatara ntụliaka nwere ọtụtụ pati na mmalite afọ ndị 1990 ha.

N'ime afọ iri atọ gara aga, mba ahụ enweela ọgbara ntụliaka gara n'ụzọ udo nke ọtụtụ mmadụ kwara ngụ na ya.

A maara mba Gana nke ọma maka inyefe ọchịchị n'ụzọ a haziri nke ọma.

Gịnị ka ndị Gana na-atụliri aka?

N'ụbọchị ntụliaka, a ga-enwe ụzọ ntụliaka abụọ n'otu oge:

  • Onyeisiala - ha dị mmadụ 12 na-azọ ya
  • Ndị omeiwu - ndị mmadụ ga-ahọrọ ndị omeiwu ha n'ọgbọ ntụliaka 275 dị na mba ahụ.

Onye ga-abụ onyeisiala ọhụrụ na Gana?

Mahamudu Bawumia na John Mahama

Ebe foto si, AFP

Ọ bụ eziokwu na mmadụ iri na abụọ (12) na-azọ ọkwa onyeisiala Gana, naanị abụọ bụ ndị nwere ohere inweta mmeri. Kemgbe a malitere ịnabata ọtụtụ pati na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba ahụ n'afọ 1992, ọ bụ naanị ndị sitere na pati National Democratic Congress (NDC) maọbụ the New Patriotic Party (NPP) na-enweta mmeri.

Mmadụ abụọ ndị nọ n'ihu bụ:

  • Mahamudu Bawumia (NPP) - Dịka ọ na-agaala ozi ka osote Akufo-Addo afọ asatọ, nwoke ahụ gbara afọ iri isii na otu (61) gụrụ ọmụmụ okwu akụnaụba na mahadum Oxford nwereike ime ihe akụkọ dịka onyeisiala Alakụba mbụ mba ahụ ga-enwe. Onye ahụ bụbu osote onyeisi ụlọakụ etiti Gana bụ onye a maara nke ọma maka iti ịgba n'okwu ego. Mana nke ahụ nwereike ibutere ya ọdịda dịka ọtụtụ mmadụ na-akọcha ya maka oge Gana danyere na nsogbu akụnaụba n'okpuru nlekọta ya.
  • John Mahama (NDC) – Inweta mmeri na ntụliaka a ga-abụ oge nlọghachi maka nwoke ahụ gbara afọ iri isii na ise (65) bụụrụ onyeisiala afọ anọ na ọkara malite n'afọ 2012 ma mechaa daa n'oge ntụliaka afọ 2016. Oge ọ nọ n'ọchịchị, a kpọrọ ya "Mr Dumsor", nke na-arụtụ aka n'ụkọ ọkụ latrik mejupụtara oge ọ nọ n'ọchịchị. N'etiti nsogbu akụnaụba ọjọọ dị ugbua, Mahama ekwela nkwa iweta mgbanwe ngwangwa na mba ahụ chọrọ onye ndu aka siri ike ịnọ n'isi ọchịchị ya.

Ndị nke ọzọ, aha ha na-eme mkpọtụ gụnyere:

  • Nana Kwame Bediako – Nwoke ahụ na-azụ ahịa a maara dịka "Cheddar" enweghị ihe mgbakwasaụkwụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mana o metụtala ọtụtụ mmadụ na soshal midịa ma dọtakwa ndị nkwado na-eto eto.
  • Alan Kyerematen – Onye ahụ bụbu minista a maara dịka "Alan Cash" hapụrụ NPP afọ gara aga oge o nyechara mkpesa na ntụliaka imeụlọ bụ nke lara otu akụkụ megide ya. O nwereike ịdọta ụfọdụ ndị nkwado NPP n'obi pati ahụ dị na mpaghara Ashanti.

Kedụ ihe ndị bụ okwu a kpụ n'ọnụ?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ajụjụ gbasara ọnọdụ akụnaụba kachasị bụrụ ihe na-echegbu ndị mmadụ dịka ntụliaka ahụ na-abịaru nso, ọkachasị ọnọdụ obibi ndụ na-akawanye njọ. Na ngwụcha afọ 2022, ọtanisi ruru pasenti iri ise na anọ (54%). Ọ gbatuola kemgbe ahụ mana ọnụego ngwaahịa ka na-agbago.

Ụlọakụ mbaụwa kwuru na ihe ruru ndị Gana narị puku asatọ na iri ise (850,000) nwereike ịbụ ndị akwabanyere n'ụbịam n'afọ 2022 n'ihi ọnụego ngwaahịa na-arị elu. "Ndị ọhụrụ a dara ogbenye" sonyeere nde mmadụ isii (6m) ndị bụụrụ ogbenye.

Na ngwụcha 2022, ego gọọmenti abụrụla nke eripịara dịka naanị ihe obere fọdụrụ n'akpaego mba ahụ, nke manyere Gana ịgakwuru ụlọọrụ International Monetary Fund (IMF) maka enyemaka.

  • Etu ụlọakụ etiti Gana siri tufuo ijeri dọla ise ($5bn) n'ime otu afọ

Anamachọọrụ dị n'etiti ndị ntorobịa nakwa mgbapụ ụmụafọ Gana ndị na-achọ ohere dị mma abụrụla ihe ndị a na-ahụ na nso nso a.

NDC akwaala arịrị maka emeghị nke ọma ma kpọọ oku ka ahazigharịa ihe.

Ndị nchịkọta NPP kwuru na ha ehiwela akụnaụba siri ike nke "na-achọ iweta mgbanwe".

  • Mmetụta gbasara gburugburu obibi n'ihi igwupụta ọlaedo n'ụzọ iwu megidere – dịka a maara ya na mba ahụ dịka "galamsey" - ọ bụrụla okwu a kpụ n'ọnụ. E meela ọtụtụ mkpesa gbasara omume ahụ bụ nke jiri kemikal ọjọọ metọọ ọtụtụ osimiri dịka a na-eche maka ntụliaka.
  • Ụbụ ọlaedo ebutela mbibi gburugburu ebe obibi

Pati ndị gbapụtara ihe kwetara na okwu ahụ bụ nke kwesịrị ka elebara ya anya, mana dịka NPP na-ekwu na ọ dị mkpa ka akụnaụba nabata ka ụfọdụ ndị na-egwu ọlaedo obere gaa n'ihu, NDC na-akpọ oku ka etinye iwu na usoro tara akpụ ma gbochiekwa inye ndị ọhụrụ ikike.

Kedụ ka ntụliaka si arụ ọrụ?

Ntụliaka 2020

Ebe foto si, AFP

Iji nweta mmeri na ntụliaka onyeisiala agba nke mbụ, onye na-azọ ọkwa ga-enweta ihe karịrị ọkara vootu niile a tụrụ. Ọ bụrụ na enweghị onye ruru ogogo a chọrọ, a ga-ahazi agbanke abụọ n'etiti mmadụ abụọ ndị kachasị nweta ọnụọgụ vootu na ngwụcha ọnwa Disemba.

Nke ndị omeiwu bụ dabere n'onye ga-ebu ụzọ nweta ọnụọgụ vootu a chọrọ n'ọgbọ ntụliaka ọbụla, ọ bụrụgodu ma o rughị pasenti iri ise (50%).

N'ụbọchị ntụliaka, onye ọbụla ga-atụ vootu ga-eji epekele vootu ntụliaka pụta n'ogige ntụliaka e nyere ya bụ ebe a ga-anọ nyochaa akaraaka ha ma nyekwa ha akwụkwọ e ji abịnye aka abụọ. A ga-ete onye ọbụla tụrụ vootu uri na mkpịsịaka iji gbochie ya ịtụ vootu nke ugboro abụọ.

Gịnị merela na tụliaka ndị gara aga?

Kemgbe afọ 1992, Gana na-enwe ntụliaka onyeisiala tara akpụ.

N'afọ 2008, ihe na-erughị ọkara pasenti kewapụrụ mmadụ abụọ na-azọ ọkwa ahụ n'agba nke abụọ.

Na ntụliaka ahụ ka afọ anọ gara, onye nwetara mmeri bụ Mahama gafere pasenti iri ise (50%) n'agba nke mbụ.

Mpụtara ntụliaka ahụ mere ka NPP nye mkpesa n'ụlọikpe ma kwuo na e ji akwụkwọ mpụtara ntụliaka mee ihe egwuruegwu n'ụfọdụ ogige ntụliaka. Nke ahụ achịtaghị aja mana o mere ka ụlọọrụ na-ahazi ntụliaka tinye ụkpụrụ ọhụrụ iji wulite nkwụwaakaọtọ.

Ndị na-ele ka ntụliaka si aga etoola ụzọ e si ahazi ntụliaka na mba ahụ ọtụtụ oge.

Kedụ mgbe anyị ga-amata mpụtara ntụliaka?

Site na ntụliaka ndị gara aga, ụlọọrụ na-ahazi ntụliaka ga-ekwupụta mpụtara ya n'ụbọchị 10 nke ọnwa Disemba.

Njirimara Ghana