Ọrịa 'gigantism' mere ka m bụrụ onye kachasị ogologo na Ghana – Sulemana Abdul

Aha onyonyo, A bụ m nwoke kachaa too ogologo na Gana - Sulemana Abdul Samed
Ọrịa 'gigantism' mere ka m bụrụ onye kachasị ogologo na Ghana – Sulemana Abdul

Nwafọ mba Ghana bụ Suleman Abdul Samed, a maara dịka Awuche bụ nwoke kachasị too ogologo na mba ha.

Ọ kọwara etu ọrịa ito ogologo a kpọrọ 'gigantism' jiri mee ka ọ bụrụ onye kachasị ogologo na mba Ghana.

Abdul sị na ọ bụ n'afọ 2015 ka ọ malitere itokwu ogologo, na o hichara ụra teeta ma chọpụta na ire na akụkụ ahụ ya ndị ọzọ ebuola ibu.

Ọ sị na kamgbe ahụ na ọ na-etokwu ogologo kwa ọnwa anọ ọbụla, na ogologo ya ugbua dị fit itoolu na ọkara isii (9.6ft)

Abdul sị na ndị ọrụ ahụike sị na ọ ga-aga n'ụlọọgwụ ka a waa ụrụ ma wepụta akụrụnwa 'hormone' na-eme ka ọ na-eto oke ogologo.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọnọdụ ya emeela ka ọ bụrụ onye a ma ama na mba Ghana nakwa n'ụwa.

Ọ sị na ebe ọbụla ọ gara, ndị mmadụ na-achọ ka ya na see foto.

Ihe na-ebute ọrịa 'gigantism' bụ otito toro na 'pituitary gland' nke na-eme ka ahụ mepụta 'hormone' na-ebute ito ogologo akwụsịghị akwụsị.

A bụ m nwoke kachaa too ogologo na Gana - Sulemana Abdul Samed
Nkọwa foto, A bụ m nwoke kachaa too ogologo na Gana - Sulemana Abdul Samed

Onye tụgharịrị akụkọ a bụ Chioma Nkemdilim Daramola.