Ihe Dave Umahi kwuru maka ndị uweojii chụsara ndị nkwado Peter Obi n'Ebonyi

Ebe foto si, State Govt
Aka na-achị Ebonyi Steeti bụ Gọvanọ David Umahi ekwuola na aka ya adịghị na nchụsa ndị uweojii chụsara ndị ntorobịa na-eme ngagharị iji gosi nkwado ha maka Peter Obi, onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na 'Labour Party.
Umahi kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi nke onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Chooks Okoh.
O kwuru na ya amaghị maka ihe a ndị uweojii mere, ọ bụghịkwa ya nyere ha ikike ka ha chụsaa ndị mmadụ.
Chooks Okoh kwuru sị: "Ọ bụghị eziokwu na Gọvanọ Ebonyi Steeti nyere ndị uweojii iwu ka ha chụsaa ndịnkwado Labour pati."
"Gọvanọ bụ onye kwenyesiri ike n'ọchịchị onye kwuo uche ya, ọ bụrụ na ndị uweojii chụsara ndị mmadụ, ndị uweojii ka ọ dị n'aka ịkọwa ihe mere ha ji chụsaa ndị mmadụ."
Ndị nkwado Obi nupuru isi - Umahi

Ebe foto si, Twitter
Gọvanọ Umahi kọwara na gọọmentị nyere ikike ka ndị nkwado 'Labour Party' nọrọ n'ama egwuregwu dị n'Abakiliki wee mee ọgbakọ ha, mana ha nupuru isi.
"Kama ndị Labour party ga-akwụ ụgwọ gọọmentị sị ha kwụọ iji nọrọ n'ama egwuregwu Abakiliki, ha na ndị isi ha pụtara n'okporo ụzọ.
"Nke a kpatara oke kpachi kpachi ụzọ nke tinyere ndị njem na-agara onwe ha na nnukwu ihe nhịahụ."
"Ọ bụ nke a mere ndị uweojii ji tinye aka iji hụ na ha weghachiri udo, ma gbochie ọgbaaghara."
Umahi rịọrọ ndị mmadụ ka ha na-erube isi n'iwu gọọmentị iji hụ na udo na-achị.
O kwuru na enweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọ na-atajiri anya, kama ọ na-ekpere onye ọbụla n'ime ha ekpere ọma na ọganihu.
Ndị uweojii ewerela 'tear gas' chụsaa ndị nkwado Labour Pati n'Ebonyi steeti

Ebe foto si, Twitter
Ndị uweojii n'Ebonyi steet ejirila anwụrụ ose chụsaa ndị mmadụ pụtara igosi nkwado ha maka 'Labour Party' nakwa onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na pati ahụ bụ Peter Obi.
Ndị a pụtara ime ngagharị nkwado gbakọrọ n'ebe a na-akpọ 'Mile 50' iji malite njem ha, mana ndị uweojii gbochiri ha.
Ebonyi steeti abụghị steeti mbụ ndị ntorobịa na-ahazi ngagharị nkwado a, mana kamgbe ha malitere, enwebeghị steeti akụkọ pụtara na ha na ndị uweojii takọtara isi.
Ụdị ngagharị a emeela na Ondo Steeti, Plateau, Taraba, Nasarawa, Anambra, Enugwu, Imo na steeti ndị ọzọ dị icheiche.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onyonyo ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri ebe ndị uweojii gbara anwụrụ ose, dịka ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị "nke a bụ mmegbu aka ike".
O dobeghị anya ihe kpatara ndị uweojii ji akwụsị ndị ntorobịa a na-eme ngagharị.
BBC Igbo gbalịrị ịkpọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi Steeti bụ Chris Anyanwu, mana ekwentị ya gbanyụrụ agbanyụ.
Kọmishọna mgbasaozi Ebonyi Steeti bụ Uchenna Orji gwara BBC Igbo na ya agaghị etinyenwu ọnụ n'okwu a maka na ọ bụ ihe dịịrị ndị uweojii.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana akụkọ kwuru na ndị ntorobịa ahụ mechara gbakọọ ọzọ ma bidokwa ngagharị ha.
Ụfọdụ onyonyo na soshal midia gosiri ebe ndị mmadụ na-agagharị na-agụ egwu ma na-egosi nkwado ha maka Peter Obi.
Ngagharịa na-aga n'ihu taa n'Owere - Imo steeti, Yenagoa - Bayelsa steeti, Umuahia - Abia steeti, Plateau,

Ebe foto si, Twitter
Ngagharị nkwado maka Peter Obi
Peter Obi bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nọbu n'otu All Progressives Grand Alliance' ebe ọ nọ merịe ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti nke 2003.
Obi mechara banye 'Peoples Democratic Party' ebe ọ nọrọ zọọ ọkwa Osote Onyeisiala Naịjirịa na 2019.
Ugbua ọ nọzi na 'Labour Party' dịka onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na pati ahụ, maka ntuliaka nke a ga-eme na 2023.
Ọtụtụ ndị ntorobịa egosila nkwado maka Mazi Peter Obi n'ihi na ha kwuru na ọ pụrụ iche n'ime ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ.
Ndị ntorobịa ahaziela ngagharị na steeti dị icheiche iji gosi nkwado ha maka Peter Obi.
Akụkọ na-ekwu na ọ bụghị Peter Obi maọbụ Labour Pati na-ewepụta ego iji kwadoo ngagharị ndị a, kama ọ bụ ndị mmadụ na-eji ego ha akwado ya.
Ndị ọzọ na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 gụnyere: Bola Ahmed Tinubu nke pati APC; Atiku Abubakar nke PDP; Rabiu Kwankwanso nke 'New Nigeria Peoples Party'; na ndị ọzọ.










