Labour party primaries: Ka anyị tighachị Naịjiria n'aka ndị nwe ya - Peter Obi

Peter Obi

Ebe foto si, Getty Images

Peter Obi ekeleela ndị Naịjiria ọkachasị ndị pati ọhụrụ ya bụ Labour Party, dịka ọ zọtara ọkọlọtọ pati ahụ iji zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023.

N'okwu nnabata o kwuru mgbe o meriri ntuliaka imeụlọ ha mere, Obi kwuru na oge eruola mgbe a ga-etighachị Naịjiria n'aka ndị nwe ya - gụnyere ndị ọrụ ugbo, ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ, ndị ọrụ aka, ndị ọrụ, ndị ọrụ larala ezumiike nka nakwa ndị Naịjiria ndị ọzọ na-amaghị ebe inye aka ha ga-esi bịa.

O kwuru na ọ ghọtara na ije a ga-abụ nke a ga-agbakọta aka eje, nke ndị ọkachasị metụta - ndị ntorobịa - ga-eso hụ na e jere.

Peter Obi emeriela ntuliaka imeụlọ Labour Party

Peter Obi

Obi nwetara vootu iri itoolu na isii (96) n'ime 98 a tụrụ n'ọgbọ ebe a nọ mee ntuliaka imeụlọ nke ndị Labour Party.

N'agbanyeghi na Pat Utomi rituru n'iso zọọ ya bụ ọkwa, o nwetere otu vootu n'ime ya bụ vootu 98 a tụrụ.

Peter Obi na ndị ọzọ ga-emezi ntuliaka ugbua

Peter Obi na Pat Utomi

Ebe foto si, Labour Party Facebook

Egwu adagharịala na ntuliaka imeụlọ otu labour Party na-eme taa n'Asaba, Delta steeti, dịka otu nwaanyị so azọ ọkwa onye ga-efere Labour Party ọkọlọtọ bụ Olufolahan Olubisola Emmanuel-Tella na ntuliaka onyeisiala tinyerela Peter Obi aja na garị.

Labour Pati họrọburu Peter Obi dịka ndị ọzọ nile so azọ rituru iji nye ya ohere ka o fee ọkọlọtọ Labour Party.

Mmadụ anọ so na-azọ ọkwa ahụ bụ: Ọkammụta Pat Utomi, Sampson Uchenna Charles, Faduri Oluwadare Joseph na Olufolahan Olubisola Emmanuel-Tella.

Emmanuel-Tella bụ nanị nwaanyị na-azọ ọkwa ahụ na Labour Party gbara isi akwara na a ga-emerịrị ntuliaka iji họpụta onye ga-efe ya bụ ọkọlọtọ, kama irituru Peter Obi ka ọ bụrụ onye nwetara ya.

N'ihi nke a, Labour Party ekwela ka steeti niile họpụta mmadụ anọ maọbụ ise ga-anọchite anya (delegates) ma tụọ vootu.

Aha onyonyo, Peter Obi

Mara na otu pati 'Labour Party' nyeburu Peter Obi ikike dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala na 2023, dịka ndị niile pụtaburu ịzọ ya bụ ọkwa rịtuburu ya.

Pat Utomi na-azọbụ ọkwa ahụ wepụrụ onye ya ma kwado Peter Obi.

'Labour Party' ahọrọla Peter Obi dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala na 2023

Peter Obi

Ebe foto si, Labour Party Facebook

Otu pati 'Labour Party' enyela Peter Obi ikike dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala na 2023.

Nke a mere n'ọgbakọ imeụlọ nke Labour Party hiwere n'Asaba, isi obodo Delta steeti taa maka ịhọpụta onye ga-azọ ọkwa onyeisiala.

Cheta na Peter Obi bụ aka chịburu Anambra steeti si Peoples Democratic Party (PDP) wụba Labour Party n'ụbọchị 27 nke ọnwa Mee 2022, dịka o kwuru na ọtụtụ ihe ndị na-emegasị na PDP ugbua mere o jiri raa ya ahụ ịga n'ihu isonye na pati ahụ.

Ọ hapụrụ PDP n'ụbọchị 25 ma banye Labour Party na 27 nke ọnwa Mee, 2022.