Etu ọbara si gbagbuo nwata dị naanị otu ọnwa mgbe a na-ebi ya ukwu

Ebe foto si, Getty Images
Obere nwata dị naanị otu ọnwa anwụọla site n'ọbara gbagburu ya mgbe a na-ebi ya ukwu na mba Gambia dịka ndị uweojii si kwuo.
N'ozi ndị uweojii wepụtara, ụmụnwaanyị abụọ aka ha dị n'ọdachi ahụ nọ n'aka ndị uweojii mpaghara Wellingara ugbua.
Ha kwuru na "nnyocha e mere gosiri na e biri nwata ahụ ukwu, nke mere o ji na-agba nnukwu ọbara.
"E buuru ya gawa n'ụlọọgwụ bụ ebe a nọ kwupụta ọnwụ ya".
A machiri ibi nwaanyị ukwu na mba Gambia, n'afọ gara aga ndị ụlọomeiwu kagburu atụmatụ chọrọ ka iwepụ iwu ahụ machiri ya.
Iwu a kwuru na ndị ọbụla biri nwaanyị ukwu ga-aka mkpọrọ afọ atọ mana ọ bụrụ na nwata ahụ nwụọ n'ihi ya na a ga-atụ ha mkpọrọ mkpụrụọka.
Ọtụtụ ndị mmadụ ma out akatọọla agwa ndị a kamgbe ndị uweojii wepụtara ozi ahụ.
Otu na-ahụ makai kike dịịrị onye a kpọrọ Edward Francis Small Centre for Rights and Justice kelere ndị uweojii maka nwuchi ndị aka ha dị na ya ma kwuo na ọ ga-eme ka ndị ọzọ mụrụ akọ.
Ha kwuru na "anyị na-akpọku mịnịstrị na-ahụ maka ụmụaka ka ha kwalite mgbasaozi owuwe anya iji maa ọha maara ma na-eleba anya maka ndị na-ada iwu a ka ụdịrị ihe ghara ime ọzọ"
Otu ọzọ a kpọro Women in Leadership and Liberation (WILL) boro gọọmenti ebubo na ha dara n'ichekwa ụmụaka ndị a.
Ha gbakwụnyere na "omenala abụghị ihe ịkụnye aka, ọdịnala abụghị ihe mkpuchi, nke a bụ mwakpo kpọmkwem".
Fatou Baldeh bụ onye chọpụtara otu WILL gwara BBC na "Nne na nna cheere na ọ bụrụ ebepu ahụ nwa ha nwaanyị na ha ga-agbake ngwa ngwa, na ọ dịịrị ha mfe ịleghara anya ka ndị mmadụ ghara ịma".

Ebe foto si, AFP via Getty Images
N'ọnwa Julaị afọ 2024, ndị omeiwu mba Gambia kụchapụrụ atụmatụ iwu chọrọ ka a tụgharịa mmachi ibi ukwu e mere n'afọ 2015.
Gambia so na mba iri kachasị ebi ụmụnwaanyị ukwu n'ogogo 73%, nke metụtara ụmụnwaanyị dị afọ 15 ruo 49 dịka United Nations si kwuo.
Amnesty International kwuru na a na-ebi ụmụaka nwaanyị atọ n'ime anọ ukwu na mba ahụ tupu ha eruo afọ isii.
A na-ebupụ ire ọtụ ụmụnwaanyị ndị a ma dụchie ya ka ha nan woke ghara ị na-enwe mmekọ maọbụ ka ha ghara ị na-anụ ụtọ mmekọ ha na nwoke.








