'National Grid' dara, kulie, gịnị ka ọ pụtara?

Ebe foto si, Press Association
Ụnyaahụ bụ wenezde, ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Julaị ka gọọmentị Naịjirịa kwuru na "National Grid" dara nke ugboro isii ya kemgbe Jenụwarị 2022.
Nke a gbagwojuru ndị mmadụ anya, mere ụfọdụ ji ajụ ajụjụ sị, "kedụ ka 'national grid' ga-esi daa n'ụtụtụ kulie n'abalị?
Onye ọkachamara n'ihe gbasara okwu ọkụ latrik bụ Ilo Faustinus Chinedu kọwara na "ọbụghị igweọkụ na-ada".
Ọ sị na ọ bụ ọkụ gwụrụ n'aka ndị na-arụpụta ya bụ Generation Company of Nigeria, GenCos, maọbụ na ndị na-ego ọkụ bụ ndị Disco enweghị ego ha ji egozụ ọkụ.
Gịnị mere ọkụ ji agwụ n'aka ndị GenCos?

Ilo kwuru na ihe mere ọkụ ji agwụ n'aka ndị GenCos dị ọtụtụ.
Nke mbụ bụ na ndị na-ere ọkụ bụ Distribution Companies of Nigeria, Discos, anaghị eretezu ego ọkụ a na-ego maka ndị ohi ọkụ na mpụ na aghụghọ dị n'ọrụ ọkụ.
Ilo sị na ọ bụ ụzọ abụọ ka gọọmentị si enwete ọkụ ha na-ekesa.
Mbụ bụ site na mmiri nke Bekee kpọrọ 'Hydro electricity'. Abụọ bụru site n'igweọkụ n'eri gasị.
Ọ bụrụ na enweghị gasị ebe o zuruoke na mgbe a chọrọ ya, ọkụ agaghị adị.
Ọ bụrụkwanụ na-enweghị mmiri n'uju na Kanji dam bụ ebe a na-arụpụta ọkụ, ọkụ agaghị adị.
Ọ bụrukwanụ na-enweta ọkụ ndị mmadụ zuchaa ya n'ohi, ndị na-ekesa ọkụ bụ Discos agaghị enwe ego ha ji egote ọkụ ọzọ.
N'ụdị a, ọbụrụgodị n'ọkụ jụ ebe a na-arụpụta ya, ndị Disco agaghị enwe ego ha ji egota ya bụ ọkụ.
Ọzọ, ọbụrụ na ndị mmadụ zụọ akụrụngwa waya maọbụ igweọkụ maọbụ ihe ndị ọzọ e ji esesa ọkụ, ọkụ agaghị adị.
Gịnị mere ndị mmadụ ejighị a
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ilo sị na ihe mere ndị mmadị ji ezu ohi ọkụ maọbụ zuru akarụngwa ọkụ ree bụ na ha ka na-ahụta ọkụ ka uru ha kwesiri irita na gọọmentị.
Ọ sị na oge nke ahụ agaala maka gọọmentị ereela ụlọọrụ na-emepụta ya bụ okụ.
"ndị mmadụ anaghị ahụ uru dị n'igwụ ụgwọ ọku. Mana ọkụ abụghịzị 'national cake a na-eke ghara ịkwụ ụgwọ".
Ọ sị na ugbua, onye ọbụla na-atazị ahụhụ ohi ọkụ a ụfọdụ na-ezu".
Ọ sị na ihe ọzọ na-eme ka ndị mmadụ ghara ịgwụ ụgwọ ọkụ bụ oke 'bill' a na-ezitere ha.
Ọ kọwara na ọ bụrụ na ndị mmadụ ahụghị ọkụ ruru ego ha na-akwụ, na ha agaghịzị akwụ ụgwọ ọzọ.
Nke atọ bụ ndị mmadụ enweghị ezi nghọta maka uru ọ bara ịgwụ ụgwọ ọkụ.
Na "ọ bụrụ na ndị mmadụ hụ ka ụgwọọkụ na mmepe obodo siri jikọta, ha ga akwụ ụgwọọkụ".
Ilo kwukwara na ọ nwere ndị ajọ mmadụ nwere ya bụ izu ohi ọkụ dịka akaọrụ, naọ nweghị ihe emere ka ha nghara izu ọkụ. Na ndị dị otu a mwere ndị Disco anaghị eretezu ego ọkụ ha iji gote ọkụ ọzọ n'aka ndị GenCo.
GenCo kọwara na ụbọchị Wenezde na ọkụ tipịara site 300MW ruo 40 MW site n'ehihie ruo n'abalị.









