Akuma Kalu: Etu 'container' si dagbuo nwoke na-akwado ịga China

Ebe foto si, Uche Kalu Mang
Arịrị na akwa arịị ejula ọnụ ezinaụlọ otu nwoke ochiegoachụ ego nke ụgbọala na-ebub ibu dagburu na nsonso a.
Akuma Kalu, onye Abiriba dị n'Okpuru Ọchịchị Ohafia, Abia steeti nwụrụ dịka ụgbọala 'contaner' bu ibu dagidere ụgbọala ọkwọ aga ọdọụgbọelu Pọtakọt n'Okpuru Ọchịchị Etche dị na Rivas Stetei i ga-banye ụgbọelu n'aga Abuja.
Otu dị ezinaụlọ nso achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ya bụ akụkọ ọnwụ bụ eziokwu.
O kwuru sị na nwa amadi ahụ chọpụrụ idote ụgbọala ya n'ọdọụgbọelu gaa Abuja ebe ọ na-aga okwu asambodo njem(Visa) Chaina oge o zutere ọnwụ ya.
"Ọ na-akwado ịga Chaina maka azụmahịa tupu ọdachie a adapụta."
"Kemgbe ọdachi a, onye ọbụla n'ezinaụlọ nọ n'iru ụjụ."

Ebe foto si, Uche Kalu/Facebook
Ọ gara n'ihu kọwaa nwa amadi ahụ ji otu nwa ma rụtụ aka ka o sirinwụọ.
Ọ sịrị, "Ọ bụ onye na-atụ ahịa."
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"Ọ na-aga Chaina kwa mgbe,kwa mgbe maka azụmahịa."
"Ọ na-akwado ịga Chaina maka ahịa."
"Ọ nọ n'ụzọ ịga Pọtakọt ebe ọ ga-esi gawa Abuja okwu akwụkwọ njem ya"
"Ebumnaobi ya bụ ịhapụ ụgbọala ya n'ọdọụgbọelu dị na Pọtakọt, ma burukwa ụgbọala ahụ ma ọ lọghachitewe Aba site Abuja."
Akụkọ na-ewu na soshal midia kwuru na otu nwoke bi n'Umuogele, Ovom dị n'Okpuru Ọchịchị n'Abia steeti mabụụ onye so n'otu jikọrọ 'Umuogele Landlords' Association ' nwụrụ dịka 'ụgbọala na-ebu ibu dagburu ya.
N'iru ụjụ ya, otutụ ndị ezịnaụlọ ya nakwa ndị enyi nwaamadi ahụ zo=ịpụtara ozi n'ọbaozi soshal midia.
Uchendu Kalu Mang kwuru n'ozi o wepụtaran'akara Facebook ya tụrụ arịrị na ọnwụ Akuma, nwanne ya nwoke na-abia afọ ise nna ha hapụrụ ụwa.
“Nna m taa ka o mere afọ ise na ọnwa iri ị hapụrụ m n'ajọ ụwa a."
"Ọnwụ abịala ọzọ, bịa buru ọdụdụ nwa gị, Akụma."
"Ọnụ emere m gị gịnị?"
'Ụgbọala na-ebu ibu ịdagbu mmadụ ataala isi ọtụtụ mmadụ na Naijiria.
Ụfọdụ na-abụ n'ihi ọnọdụ ọjọọ okporoụzọ, ụfọdụ bụ ndị ọkwọgbọala edoghị anya kpatara ya.
N'afọ 2020, Gọọmentị Legọs steeti kpụpụrụ ọkwọụgbọala ibu ụlọikpe maka iji ụgbọala ya gbuo mmadụ.












