Chidinma Ajoku : Gọọmentị Legọs akpụpụla onye nwe 'container' dagburu nwada a ụlọikpe maka igbu ọchụ
Gọọmentị Legọs steeti akpụpụla mmadụ abụọ ụlọikpe maka kọntena dagburu mmadụ atọ na steeti ahụ n'ọnwa gara aga.
Mmadụ abụọ ahụ bụ onye na-anya ụgbọala bu kọntena ahụ, aha ya bụ Sodiq Okanlawon, nakwa onye nwe ya bụ ụgbọala aha ya bụ Wasiu Lekan.
Gọọmentị kpụpụrụ ha ụlọikpe dị na Igbosere ma bo ha ebubo igbu ọchụ.
Mmadụ atọ - Chidimma Ajoku, Chima Nnaekpe na otu onye ọzọ - nwụrụ oge kọntena ahụ dakwasara n'elu ụgbọala ha nọ n'ime ya.
Oge a kpụpụrụ mmadụ abụọ a ụlọikpe, ha kwuru na aka ha dị ọcha.
Ọkaikpe Mobolanle Okikiolu-Ighile nyere iwu ka e jichie ha n'ụlọ ndị uweojii ruo mgbe e mere ha nnyocha maka ọrịa coronavirus tupu a kpụga ha n'ụlọ mkpọrọ.
O yigharịrị ụbọchị a ga-amalite ikpe ahụ ka ọ bụrụ ụbọchị 24 nakwa 26 nke ọnwa Ọgọst.
Ihe merenụ
N'ụbọchị Jụlaị 26 nke afọ 202 ka ụgbọala ukwu bu kọntena dagburu Chidinma Ajoku na onye ọrụ ya bụ Chima Nnaekpe n'ụzọ Ilasa dị na Legọs.
Ọ bụ nwagbọghọ dị afọ 27 gụrụ akwụkwọ na Mahadum Babcock ma na-arụ ọrụ na Nigeria Airport Authority dị na Legọs.
Nne Chidinma bụ Chineze Ajoku kọwara etu o siri chọpụta maka ọnwụ nwa ya. O kwukwara maka olileanya o nwere ebe nwa ya nọ nakwa etu Chidinma si akwado ịga mba ofesi ime 'Masters'. Nwanne ya bụ Obinna kwuru na ọ nabatebeghi ọnwụ ya.
Odoziaku Chineze kwuru maka etu n'oge Babatunde Fashola, onye bụbu gọvanọ Legos, nnukwu ụgbọala a kpọrọ 'trailer' na Bekee anaghị apụta n'ụzọ mgbe ndị mmadụ na-agagharị, n'ihi e tinyere iwu kwụsịrị ya, na o bụ n'abalị ka ha ji apụta.
O kwukwara ka gọomentị tinye uchu ugbua n'ịkwụsị ha ka ụdịrị mberede a hapụ ị dapụtara onye ọzọ.
Fredric Oladiende bụ kọmishọna na-ahụ maka njem ụgbọala na Legọs Steetị gwara mgbe BBC Igbo na ọ bụ nsogbu gọọmentị maara maka ya.
Na ha na-eme nzukọ ụzọ a ga-eji gboo nsogbu a.
Ndị mere ya: Chioma Nkemdilim Daramola na Nnamdi Agbanelo.