Ndị ekperima egbuola onye ọzọ n'Anambra steeti, gbupu ya isi

Emeka Nelson Achukwu

Ebe foto si, Nelson Achukwu/Facebook

A hụla ozu Nelson Emeka Achukwu, bụbu onye omeiwu Anambra steeti, onye ndị ekperima tọọrọ, gbuo ya, ma bepụ ys isi.

Achukwu rụburu ọrụ dịka onye omeiwu nọchitere anya mpaghara Nnewi South nke Anambra steeti.

Akụkọ kwuru na ndị ekperima tọọrọ ya n'ụbọchị itoolu nke ọnwa June, mana a hụrụ ozu ya e bepụrụ isi n'ụbọchị Tuzde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa June 2022.

Ndị ojiegbe

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ndi ojiegbe

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Toochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.

"A tọọrọ nwa amadị ahụ n'elekere iri nke abalị ụbọchị itoolu nke ọnwa Jun," Ikenga kwuru.

"Anyị malitere ịgba mbọ ịchọta ya ma zọpụta ya, mana a chọtara ozu ya n'oke ala dị n'etiti Uke na Ukpor."

"Anyị agaghị akwụsị mbọ anyị na-agba ruo mgbe anyị nwụchiri ndị niile aka ha dị n'ihe a."

Chetakwa na o rubeghi ọnwa abụọ ndị ekperima tọọrọ ma gbuo nwa amadi aha ya bụ Okechukwu Okoye, onye omeiwu na-anọchi anya mpaghara Aguata North n'ụlọomeiwu Anambra steeti, nakwa onye enyemaka ya.

Ndị ekperima ahụ bepụkwara Okoye isi.

Onye bụ Nelson Emeka Achukwu?

Nelson Achukwu

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Foto oge Nelson Achukwu tozuru ịbụ onye ọkaiwu na Naịjirịa
  • Emeka Achukwu bụ onye Ukpor, dị n'okpuru ọchịchị nnewi South
  • Ọ bụ onye ọkaiwu na onye ndọrọndọrọ ọchịchị
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka
  • Aha otutu ya bụ 'Ogbatulenyi'
  • O meriri ntuliaka dịka onye omeiwu Anambra steeti n'afọ 2003
  • Ọ bụkwa onye oji ego achụ ego, dịka akụkọ kwuru na o nwere ụlọahịa ebe a na-ere mmanụ ụgbọala, ụlọọrụ na-emepụta mmiri ọṅụṅụ, na ihe ndị ọzọ.
  • Akụkọ kwuru na ndị ntọ atọrọbuola ya onwa olemole gara aga ma mecha tọhapụ ya
  • Akụkọ na-ekwukwa na ndị ezinụlọ Achikwu akwụọla ndị ekperima ahụ nde naịra iri na ise, mana ha kachiri ntị gbuo ya.