Prince Andrew : Anyị anaghị enyocha Nwaeze maka ebubo metụtara Epstein - 'Met Police'

Ebe foto si, Reuters
Ndị uweojii London dị na mba Briten a ma dịka, 'Metropolitan Police' ekwuola na ha anaghị enyocha ebubo e boro Nwaeze na elekọta York (Duke of York) metụtara nwoke lara mmụọ a ma dịka onye na-emetọ ụmụaka a kpọrọ, Jeffrey Epstein.
N'akwụkwọ ụlọikpe mba Amerịka gosiri na-aeboro Nwaeze Andrew ebubo ịnwụ nwaanyị n'ara n'ụlọ Epstein's house bụ nke ọ gọburu agụgọ sị na ọ bụghị eziokwu.
ụlọọrụ ndịuweojii Met sịrị, na ha ga-elebanye anya n'ozi 'ọhụrụ' ' na nke 'metụtara' ma ọ bụrụ na o nwee ndị wetara okwu ahụ n'ihu ha.
Nwaeze Andrew so na ndị nwere agba aha ha dị n'akwụkwọ ụlọikpe nke a gbara n'anwụ na nsonso a na mba Amerịka.
Aha Prince Andrew na Bill Clinton dị n'akwụkwọ ụlọikpe maka ebubo metụtara mmetọ ụmụaka

Bill Clinton na Nwaeze mba Briten bụ Nwaeze Andrew so na ndị nwere agba aha ya dị n'akwụkwọ a gbara n'ụlọikpe megide otu nwoke a kpọrọ Jeffrey Epstein ama make imetọ ọtụtụ ndị mmadụ.
Akwụkwọ ikpe nke a gbara n'anwụ ọhụrụ a bụ akwụkwọ n'ikpe megide Ghislaine Maxwell, bụ enyị nwaanyị Epstein bụ onye a tụrụ mkpọrọ maka inyere Epstein aka n'imetọ ụmụaka ụmụnwaanyị ọ na-emetọ.
Aha ndị ọzọ dị n'akwụkwọ ikpe ahụ gụnyere ọgụ egwu Michael Jackson na onye anwansi a ma ma bụ David Copperfield, mana o nweghị ihe ọjọọ a sị na ha mere.
E boro Okparaeze Andrew ebubo ịnwụ nwaanyị n'ara mana ọ gọrọ agụgọ
Ụfọdụ n'ime ndị kafrịrị mmadụ 100 aha ha dị n'akwụkwọ ahụ ụlọikpe ahụ bụ ndị boro maka ndị ọzọ maọbụ ndị a kpọrọ akaebe.
Mana o nweghị ihe dara gbowam akwụkwọ ahụ gosiri banyere Epstein, bụ onye nwụrụ na mkpọrọ dịka a na-ekpe ya ikpe maka ịgba mgbere mmadụ maka imetọ ha.
Akwụkw ụllọikpe ahụ nke dị ibe akwụkwọ 900 pụtara ihe n'ụbọchị Wenezde dịka Ọkaikpe New York bụ Loretta Preska nyere iwu ka ewepụtara ya ọha, sị na ụlọntaakụkọ agbaala ọtụtụ aha dị na ya n'anwụ a, ebe ndị ọzọ pụtara ihe oge a na-ekpe enyi Epstein bụ Ghislaine Maxwell ikpe.
Akwụkwọ ikpe ahụ gosiri ndị nwere agba ha na Epstein bụ onye kwetara ere n'ikpe ya na ọ na-akwado ịgba ndị etoghị eto akwụna.
Ọkaikpe Preska sịrị na ọtụtụ ndị ọzọ etighị mkpu sị sị ewepụtala akwụkwọ ahụ.
O nyekwara iwu ka a ghara ịgba aha ụfọdụ n'anwụ n'ihi na o nwere ike ịgba ndị emetọrọ n'anwụ.
A na-atụ anya na akwụkwọ ndị ọzọ ga-apụta n'abalị ole na ole na-abịa.
Ebubo na Nwaeze Andrew nwụrụ nwaanyị n'ara

Ebe foto si, Reuters
Akwụkwọ ụlọikpe e wepụtara ọhụrụ a gụnyere ebe Johanna Sjoberg, bụ onye boro ebubo na Nwaeze Andrew nwụrụ ya n'ara dịka ọ dọnọrọ ala n'oche n'ụlọ Epstein dị na Manhattan n'afọ 2001.
Obieze mba Briten (Buckingham Palace)gọburu sị na ebubo ya "Abụghị eziokwu ma ncha".
N'akwụkwọ ikpe nke ewepụtara n'akụkọ ndị n'akwụkwọ akụkọ, Nwada Sjoberg boro ebubo na Nwaeze tinyere ya aka n'ara oge ya na Virginia Giuffre( bụ onue ọzọ bokwara ebubo).
N'afọ 2022, Obieze Briten kwuru Nwaada Giuffre nde kwuru nde iji dozie ụka dịka nwada ahụ gbara Nwaeze Andrew akwụkwọ sị na o metọrọ ya oge ya dị afọ 17.
Nwaeze Andrew kwuru na ya ya ahụbeghị Nwada Giuffre mbụ ma gọọ agụgọ na ebubo nwa ada ahụ boro ya.
Bill Clinton na njem ya

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Aha aka chịburu mba Amerịka bụ Bill Clinton dị n'akwụkwọ ụlọikpe n'ikpe metụtarab Epstein mana o nweghị ihe gosiri na o mere ihe megidere iwu.
Oge a kpọtụrụ ya, ndị na-ekwuchitere ya rụtụrụ aka n'ozi mgbasaozi o wepụtara n'afọ 2019 sị, "o nweghị ihe ọ ma" banyere mpụ Epstein.
Dịka akwụkwọ si kwuo, Ms Sjoberg gbara akaebe na Epstein otu ugboro na ' ụdị ụmụnwaanyị na-amasị Clinton bụ" ndị na-eto eto".
Clinton na nwatanwaanyị na-amụ ọrụ n'obi Onyeisiala Amerịka yịrị oge ọ bụ onyeisiala.
Akwụkwọ gosiri ebe Maxwell kwuru n'ezie na Clinton ji ụgbọeleu Epstein mee njem mana ọ maghị ụgboro ole.
Clinton mere njem n'ụlọelu Epstein n'ihe a kpọrọ nyem enyemaka gaa Afrịka na mbido afọ 200s bụ oge o toro Epstein dịka onye ọrụ ebere n'etinye uchu n'ihe ọ na-eme. mana o mechara gbaara ya ọzọ.
N'ozi mgbasaozi ahụ Clinton wepụtara n'afọ 2019, kwuru na njem ndị ahụ o ji ụgbọely Epstein mee, na ya na ndị ọrụ ya na ndị na-akwado ya si n'ụlọrụ ebere 'Clinton Foundation' so mee ya bụ njem.
Ozi ahụ sịrị, "Ndị uweojii nzuzo na-eche ya so mee njem nile ahụ."












