Ihe ndị nwere agba na-ekwu maka ọnwụ Peace Anyiam-Osigwe, nwe 'AMAA Awards'

Ọtụtụ ndị welitere isi na Naijiria atụọla arịrị maka ọnwụ onye hiwere nzere 'AMAA Awards bụ Peace Anyiam-Osigwe.

Anyiam-Osigwe nwụrụ na nsonso dịka ọ rịachara ahụ nwa oge.

Ụta m na-ata onwe m... Chioma Akpota

Omee ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Chioma Akkpota tara ikikere eze na ya esochighị mkpnkkata ya na Osigwe nwere ikpeazụ tupu ọnwụ.

“Abalị abụọ a ka m na-agbalị ikweta na ị hapụla anyị.

Okwu kọrọ m n’ọnụ, Peace. Ụwatụụwa m, m ga na-ata onwe m ụta na m esochighị nkata ikpeazụ mụ na gị nwere.”

Peace Anyiam-Osigwe bụ otu n'ime ide ji Nollywood -Sanwo-Olu

Aka na-achị Legọs Steeti bụ Babajide Sanwo-Olu, kọwara nnukwu nnwaada Anyiam Osigwe dịka 'otu n'ime ide ji Nollywood:.

N'ozi iti aka n'obi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Gboyega Akosile, Sonwo-Olu tiri otu njikọrọ ndị na-emepụta ejije(Association of Movie Producers and the entire Nollywood industry) aka n'obi n'aha ezinaụlọ ya nakwa ndị Legọs steeti..Osi ahụ sịrị, " Peace Anyiam-Osigwe lara mmụọ bụ otu n'ime ide ji Nollywood na Naijiria."

" O jupụtara na nka ma bụụ otu ndị mmepụta ejije kachasị mma, ọ bụghị naanị na Naijiria kama n'Afrịka."

O jikwa onyenye Chukwu nyere ya kwalite ọha mmadụ."

Peace Anyiam-Osigwe, onye Nollywood a ma ama alaala mmụọ

Peace Ogechi Anyiam-Osigwe, nwa ada mmepụta ejije Nollywood mara, alaala mmụọ.

Nwa ada Anyiam-Osigwe bụ onye hibere emume nturuugo 'Africa Movie Academy Awards' (AMAA) nakwa ụlọọrụ Africa Film Academy, bụ nke na-ewu na mpaghara Afrịka niile.

Ozi si n'aka ndị ezinaụlọ ya kwuru na "Peace bụ Ada n'ezinụlọ Anyiam-Osigwe, ma bụrụkwa mmadụ pụrụ iche, onye nwere obi ọma, ezigbo onye ndu nakwa onye ma etu o si achụ ihe dị ya mkpa ma nweta ya".

"Anyị bụ ndị ezinaụlọ ya ga na-agba mbọ ịhụ na ọrụ ya niile ga na-aga n'ihu."

Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na ndụ

  • Aha nne na nna ya bụ Emmanuel Onyechere na Dorathy Osigwe Anyiam-Osigwe
  • Ọ bụ onye Nkwere dị n'Imo Steeti mana nne ya si n'ezinụlọ Edozie dị n'Egbu, Owerri
  • Ọ bụ ya bụ naanị nwaanyị nne na nna ya mụrụ
  • Ọ bụ ya bụ nwa nke ikpeazụ
  • O nwetara ọzụzụ dịka ọkaiwu n'ihi na nne ya chọrọ ka ọ bụrụ onye ọkaiwu mana ihe na-amasị ya bụ ịgụ na ide akwụkwọ, nakwa imepụta ihe nkiri
  • Dịka ọ gụchara akwụkwọ ọkaiwu, ọ hapụrụ ya banye ọrụ ime ejije
  • O mepụtara ejije mbụ ya oge ọ dị afọ 16