Ndị omekome agbaala otu agadi nwaanyị okụ na mwakpo ha mere n’Ihube, Imo steeti

Akụkọ apụtala na ndị omekome wakporo be onye bụbu onyeisi ngalaba ndị uweojii nke 'Department of Security Service (DSS)' bụ Emeka Ngwu ma gbaa ya ọkụ n'Imo steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n’ụtụtụ Tuzde dịka o kwuru na okụ gbagburu otu nwaanyị nọ n’ime ụlọ ahụ.
O kwuru na ha na-eche na ndị mere ihe a bụ ndị otu Ipob/ESN.
End of Akụkọ ntuliaka ndị dị mkpa
N’okwu ya, ọ kwuru:
“Ndị a ji ogbunigwe arụrụarụ tụba n’ime ụlọ ya ma gbaa otu agadị nwaanyị nọ ebe ahụ.”
"Ya bụ nwaanyị nọ n'ụlọ ahụ na-arụhụ ụra mgbe ndị a sunyere ụlọ ahụ ọkụ."
“Anyị ebupụla ihe fọrọ n’ozu ya nke gbarịrị ọkụ ebe ahụ ugbua dịka anyị na-eme nnyocha.”
"Anyị e burula okwu a gaa ngalaba nnyocha anyị nke 'State Criminal Department' n'Imo steeti."
“Ana m agwa unu na anyị ga-ama imi n’ala nwụchie ndị kpara mkpa mkpa a.”
O kwuru na nnyocha ha ugbua gosiri na ọ bụ naanị agadị nwaanyị ahụ bụ ka ya bụ ọkụ gbagburu mana ụfọdụ akụkụ na-efegharị na-ekwu na mmadụ anọ ndị ọzọ nwụrụ n’ime ọkụ so mwakpo a.
O kwukwara na amabeghị onye agadị nwaanyị ahụ bụ ugbua n’ihi na ọkụ ahụ gbarịrị ya agbaịrị.
Akụkọ ọzọ pụtakwara kwuru na ndị omekome gbara be Nnamdi Obiaraeri bụ onye rụbụrụ ọkụ dịka Kọmịshọna egwuregwu na ndị ntorobịa nakwa Kọmịshọna ala na mmepe obodo n’oge ọchịchị Ikedi Ohakim na Rochas Okorocha.
Chetakwa na Obiaraeri bụ onye na-azọrọ Labour Party ọkwa n’okpuruọchịchị Okigwe.
Agbakwara be kọmịshọna egwuregwu na ndị ntorobịa n’Imo steeti bụ Emeka Okoronkwo okụ na mwakpo mere na Tuzde.
Mkpa mkpa a niile kpara n’obodo Amagu Ihube dị okpuru ọchịchị Okigwe.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ọnọdụ nchekwa n’akụkụ Ihube

Ebe foto si, Screengrab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọtụtụ akụkọ metụtara mwakpo, ntọrọ ndị mmadụ nakwa enweghị ezi nchekwa malitere isi n’akụkụ Ihube Okigwe dapụta n’ebe ngwụcha afọ 2022.
Cheta na ọ bụ n’akụkụ Ihube ka akụkụ si metụtara ntọrọ otu nwaanyị ndị agha Naịjirịa ndị omekome kpọrọ onwe ha ndị ‘Unknown gunmen’ jidere, kpaa ọtọ ma wepụta ihe onyonyo ya na soshal midia.
Ndị agha Naịjirịa kwuru na ka na-achọ nwaada ahụ bụ onye otu ha aha ya bụ PP Johnson nke a tọọrọ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Disemba 2022.
A tọọrọ Johnson dịka ọ si ọzụzụ ndị agha pụta ebe e nyere ya ọkwa Lietenant ma gaa ileta nnenne ya n'Aku-Okigwe mgbe atọọrọya.
Nke a na-eso ihe onyonyo nke gosiri ebe ndị tọọrọ ya na-ekwu na ịtọrọ nwata nwaanyị a so n'usoro ha ji achọta nwereonwe Biafra.
Na ya bụ ihe onyonyo ahụ pụtara mgbe ahụ, ndị otu ahu kọwara na ha ga-emekwa nwaafọ Igbo ọbụla ụdịrị ihe a e mere nwaada ma ha gaa n’ihu na-arụrụ Naịjirịa ọrụ ọ kachasị site n’ịbanye otu ndị agha Naịjirịa.
Ha kwuru ugboro ugboro ha ga-egbufu ya bụ nwaada dịka ha kọwara na ha esila Abia steeti ebe a sị a tọọrọ ya bụ nwaada ma nọrọzịe n’ime ọhịa dị n’Enugu steeti.
Ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa
Ọ bụghị akụkọ ọhụrụ na ọnọdụ enweghi ezi nchekwa bụ okwu akpụ n'ọnụ n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ugbua.
Ọnọdụ a malitere na-akawanye njọ kemgbe ebe afọ 2021. Ọtụtụ ihe dị egwu malitere ime na mpaghara ahụ nke a gụnyere mwakpo ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa, ogbugbu ndị uweojii na ndị agha, ntọrọ mmadụ na ihe ndị ọzọ.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ otu 'Indigenous People of Biafra' nakwa ndị ọrụ nchekwa ha bụ Eastern Security Network (ESN) nke bụ ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara ahụ, na-eme mwakpo ndị a nakwa ntọrọ ndị a.
Mana Ipob ekwuola ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.
Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ n'ụlọọrụ 'Department of State Services', nke bụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa.
Gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ya na Kenya na-afọ 2021 ma kpọlata ya Naịjirịa.
E boro Kanu ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu nakwa onye na-achọ ịkwatu ọchịchịonye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Mana n'ọdị nso a ka ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo ndị ahụ ma kwuo na e kwesịrị ịtọhapụ Mazi Kanu ka ọ laa.
Ndị gọvanọ steeti ndị nọ ebe ekwuola ugboro ugboro, ma gwa ọha na ha dị njikere n'ọrọ ibuso ndị na-eme mkwapo ndị a agha.
Ndị ọrụ nchekwa wụchiri akụkụ steeti dị na mpaghara adị iche iche dịka a na-anwụchi ụfọdụ ndị ojiegbe a na-akpa ike mana ọ dị ka ya bụ ọnọdụ enweghị nchekwa ka na aga n'ihu.








