Etu Ezinaụlọ, ikwu, ibe na ndị enyi si kwaa arịrị n'akwamoozu Mr. Ibu

Otu n’ime ndị nwunye ya atọ bụ Ifeyinwa Okafor kwuru na ya lụrụ Mr. Ibu n’afọ 1994 mana ha gbasara n’afọ 1997 dịka ọ mụchara otu nwa aha ya bụ Onyebuchi Daniel.
Dịka o siri kọwaa, ọ bụ ya bụ nwunye mbụ Mr. Ibu lụrụ tupu ha enwee esemookwu nke mere o ji kuru nwa ya laa.
Ọ sịrị na ya malitere ịzụ nwa ahụ naanị ya ruo oge ọ gụchara akwụkwọ sekọndrị bụ mgbe ọ lakuuru nna ya na Legọs steeti maka agụmaakwụkwọ mahadum.

Ọ kọwara na Mr. Ibu kpọrọ ya n’ekwentị ma rịọ ya mgbaghara oge ọrịa ya malitere.
Ifeyinwa Okafor kwuru na obi agbawaala ya n’ihi nnukwu ahụhụ na ihe ụfụ Mr. Ibu gabigara n’ihi ọrịa dịka ọ rịọrọ ka Chukwu nara mkpụrụobi ya na ndokwa.
Nwunye ya nke atọ bụ Stella-Maris Okafor kwuru na obi adịghị ya na ụmụ ya atọ mma kemgbe di ya na nna ha nwụrụ.
Stella-Maris Okafor mụtaara Mr. Ibu ụmụnwoke abụọ na otu nwaanyị.


Peter Obi agaala mgbaru be Mr. Ibu

Onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka 2023 bụ Peter Obi agaala mgbaru n'oliliozu Maazị John Okafor e ji Mr. Ibu mara.
Obi kọwara ọnwụ Mr. Ibu dịka nnukwu ihe mwute na nke na-agbawa obi ma kpọọ mmadụ niile oku ka ha na-ebi ndụ kwụ ọtọ oge niile.
N'oge ọ na-ekwu okwu Peter Obi sịrị "ọnwụ Mr. Ibu bụ nnukwu ihe mwute na nke iru uju mana anyị abụghị Chukwu".

Ebe foto si, bbc
"Ihe anyị ga-eme bụ ị dị na-ekele Chukwu ma na-arịọ ya ka o mee ka nwanne anyị nwee ezumiike ebe ọ bụ na ọ masịrị ya ịkpọrọ ya ugbua".
"Ka onye ọbụla mara na anyị niile ga-anwụ otu ụbọchị, ya mere ka onye ọbụla dị ndụ na-ebi ndụ kwụ ọtọ ma na-emekwa ihe ga-eweta udo na ịhụnaanya," ka Peter Obi gbakwunyere.

Etu emume akwamoozu John Okafor si akpọtụ n'Enugwu

Taa bụ Fraịde 28 Juun 2024 ka a ga-ahazi emume akwamoozu omee ejije a maara nke ọma bụ Maazị John Okafor, onye e ji Mr Ibu mara.
Ebe akwamoozu ahụ ga-akpọtụ bụ n'ezinaụlọ ya dị n'Amurri, okpuruọchịchị Nkanu West nke Enugwu steeti.
Nwaamadị ahụ gbara afọ iri isii na atọ (63) nwụrụ n'ụbọchị Satọde 2 Maachị 2024 dịka o nwechara obi nkuchi bụ ‘Cardiac arrest’.
Mr. Ibu nwụrụ n’ụlọọgwụ dị na Legọs bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ n’ụkwụ e bere ya n’ọnwa Nọvemba afọ 2023.
Ọ dara n'ute ọrịa n'afọ gara aga nke mere e jiri bepu ya otu ụkwụ n'ụlọọgwụ bụkwanụ ebe ọ nọ ruo oge ọnwụ ya.
Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Mr. Ibu
- Ezigbo aha ya bụ John Ikechukwu Okafor (Mr Ibu), ọ bụ nwaafọ Amurri, Nkanu West nke Enugwu steeti.
- O nwere ụmụnne mana onye nke a maara nke ọma bụ nwanne ya nwaanyị Queen Chioma Egboh.
- Ọ gara ụlọakwụkwọ College of Education, Yola ma mechaa gbahapụ agụmaakwụkwọ ya n’ihi nsogbu ego. Ka emesịrị, ọ natara ọzụzụ n’ụlọakwụkwọ Institute of Management and Technology, Enugwu.
- Tupu ya abanye n’ịkpa ndị mmadụ obi ụtọ, ọ bụụrụ onye na-alụ ọgụ ‘Shotokan Karate’ dịka o ruru n’ọkwa ‘black belt’ mgbe ọ ka dị naanị afọ 16.
- Ọnọdụ ahụike ya bịara dị njọ n’afọ 2022 nke mere ka afọ ya zaa. O boro ebubo n’oge ahụ na otu n’ime ndị ikwu na ibe ya kwụrụ onye ọrụ ya ụgwọ ka o nye ya nsị n’otu mmemme ọ gara. Ka e mesịrị, o nwetara onwe ya n’otu ụlọọgwụ onye nkịtị nwe.
- Afọ 13 gara aga Mr Ibu lụrụ nwunye ya nke abụọ bụ Stella-Maris Okafor ma mụta ụmụ atọ nke gụnyere ndị nwoke abụọ bụ Emmanuel na Jay Jay tinyekwara otu nwaanyị bụ Chelsea.










