You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee aha ndị Igbo echefuru echefu anaghịzị akpọ ụmụaka ugbua
Asụsụ Igbo bụ otu n’ime njirimara eji mara ndị Igbo bụ ndị si na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa.
A ga-ahụta ndị n’asụ asụsụ Igbo na steeti dịka Imo, Abia, Enugwu, Ebonyi, Anambra, Delta, Rivas, AkwaIbom na ụfọdụ ebe na Benue Steeti.
Kama e nwere ọtụtụ ihe na-echere asụsụ Igbo aka mgba.
Nke kachasị bụ asụsụ Bekee na okpukperechi nke Kraịst nke ndị ọcha webatara ma guziere ndị Igbo.
Ọ bụ asụsụ bekee ka ọtụtụ ndị ji akparịta ụka ma e ji kwa ya ekuziri ụmụaka ihe site na nwata nke mere na a na-asụ ya karịa asụsụ Igbo.
Nke ọzọ abụrụ na ọtụtụ ndi nabatara okpukperechi nke Kraịst na-agbanwe aha ha ma nke ụmụ ha ma na-aza aha Bekee hiwere isi na okpukperechi a.
Nke a butere isi akụkọ anyị dịka ọtụtụ aha eji mara ndị Igbo oge gboo bụ ihe na-ala ala, ụfọdụ alaala kpamkpam!
Oge gboo, aha ndị Igbo na-enye ụmụ ha bụ aha dị omimi nke ihe ọ pụtara doro mmadụ niile anya.
Ụfọdụ aha a na-enye nwa amụrụ ọhụrụ bụ etu maọbụ ọnọdụ siri dị mgbe a mụrụ ya bụ nwata, ebe ụfọdụ bụ iji kwanyere nne maọbụ nna ugwu.
Ụfọdụ mgbe aha ndị a bụ nke eji akwanyere chi ha ugwu.
Lee ụfọdụ aha ndị Igbo na-aza oge gboo :
Akuagwu - Akụ na anaghị agwụ agwụ
Ahamefule - Nke a pụtara na agaghị echefu onye ahụ maọbụ na ama ya agaghị echi.
Anurunkem - Aha a na-ajụ ma enwere onye mara ihe ọ gabigara
Akankem - Aha dịka ajụjụ, Ọ bụ maka ọnọdụ m ka ị na-ekwu?
Afọọma - Ya na Ihuoma bụ otu ihe
Agwajimma - Agwa bụ mma mmadụ
Ahunanyaekwe - Ihe anya hụrụ ka mma iji gbaa ama
Chukwueke - Nke apụtara na ọ bụ Chukwu na-eke mmadụ
Chukwuegboogu - Aha a pụtara na ọ bụ Chukwu na-eweta udo
Chianuorumogu - Nke a bụ aha na-arịọ ka Chi onye ahụ lụọrọ ya ọgụ.
Chiagbanarinam - Nke a na-ekwu ka chị onye ahụ nonyere ya oge niile
Enyidiya - Nke abụ aha ụmụ nwaanyị na-egosi etu ya na dị ya si nwee ihunanya.
Ekemma - Nwata nwaanyị a mụrụ n'ụbọchị Eke.
na-ewetere ya,
Ihebuzoaju - Onye a na-ebu ụzọ achọta maọbụ ajụ ihe
Iheukwumere - Nke apụtara na oke mmadụ lọrọ onye ahụ uwa maọbụ na onye ahụ ga-abụ oke mmadụ
Ikweagwụ - Aha a pụtara na onye ahụ ga-enwe ike
Ihejiaba - Ihe mejipụtara akụ na ụba mmadụ
Nwaazụnahia - Aha pụtara na nwa dị oke mkpa ma na anaghị azụta nwa azụta
Nnaụgbọmma - Nna maọbụ onye na-eweta ihe ọma
Nnọchirionye - Aha pụtara na onye apụtara ụwa ị chọrọ nke ya na-enweghị onye ya na ya na-azọ ihe ọbụla.
Nwaogazirlila - Nwa ọ ga-agara nke ọma
Nwammuo -
Mgbaeke - Nke a bụ aha nwaanyị a mụrụ ụbọchị eke
Mkpachukwugboro - Nke a bụ aha na-egosi na onye ahụ bụ ngozi Chukwu jiri gboo mkpa.
Mgbaafọ - Nke a bụ aha nwaanyị a mụrụ ụbọchị afọ
Mgbanwkọ - Nke a bụ aha nwaanyị a mụrụ ụbọchị nkwọ
Mgbaorie - Nke a bụ aha nwaanyị a mụrụ ụbọchị eke
Ọnụhiaraodo - Aha pụtara na ọ bụ ihe mmadụ kwuru mere na onye ọzọ emeghị ihe ọma ọ chọrọ ịmere ya
Ọbụmneke - Nke a gosiri na mmadụ nabatara onwe ya
Oriemma - Nke abụ aha nwaanyị amụrụ ụbọchị orie.
Ọnụnekwu - Nke apụtara na ọ bụ ọnụ kwuru, maọbụ na ọ bụ ọnụ na-ebute okwu.
Ọnụzuruike - Aha pụtara ka mmadụ cgee uche tupu o kwuo okwu.
Ohajiriụka - Nke apụtara na ọ bụ ọha na-edozi esemokwu
Ọgọnna - Nke a pụtara na nna nwata na-ahụ ya dịka onyinye ọma
Ogoesookwu - Aha na-ekwu na ọgọ anaghị ebute esemokwu
Ogomegbunam - Obi ebere m agaghị egbu m
Onukwufo - Nke apụtara na ọ bụ ọnụ kwuru, maọbụ na ọ bụ ọnụ na-ebute okwu.
Uwaagaotuihu
Urubedi - Nke abụ aha ndị Igbo ji egosi na-alụdịnanwunye bara oke uru
Ụwaanụakwa - Ụwa anaghị anụ akwa mmadụ oge ụfọdụ
Ụwaadịghịkaechere - Aha na-ekwu na ọbụghị ihe mmadụ na-atụanya ka ụwa