Eji azụaka kwee ekele bụ naanị nke ndị chiri echichi n'ala Igbo

Eji azụaka kwee ekele bụ naanị nke ndị chiri echichi n'ala Igbo

Ugbua, ọtụtụ ụmụ ntorobia anaghịzị maka nke bụ nke. ọtụtụ n'ime ha na-eji aka nkịtị a na ibe ha azụaka. Mana nke a ezighi ezi, maka na ụdịrị ekele a bụ maka ndị chiri echichi, ndi gburu ehi mgbe gboo, ndị gburu agụ, na ndị obodo ji eje mba. Ya mere Igbo ji atụ ilu n'asị na ọ bụ mma onye nwere ka o ji a na-aka. Nze Ifeanyichukwu Obidike kwuru na "ọ bụ arụ onye echighi ọzọ ikwe onye chiri ọzọ azụaka".

O kwuru na anaghị eji aka nkịtị ekwe n'ụdịrị aka ahụ. "A na-eji mma, mkporo, nza maọbụ ọdụenyi, mkpọ maọbụ njirimara ndị ọzọ. Nke a bụ maka iji chekwaa onwe ha". Ọka mmụta Chigozie Nnabuihe kwuru na mgbe gboo, "ọ bụ naanị ndị chiri ọzọ, ndị gburu ịnyịnya gbuo ehi bụ ndị na-ana azụaka".

O kwukwara na ụmụnwanyị na ụmụaka anaghị a na-azụaka. Onye echighi echichi na onye chiri echichi nwereike ịna aka abụọ maọbụ otu tupu ha ekwezuo ya n'ihu aka. kirie akụkọ a n'uju.