Eji azụaka kwee ekele bụ naanị nke ndị chiri echichi n'ala Igbo

Aha onyonyo, Igbo Culture: Eji azụaka kwee ekele bụ naanị nke ndị chiri echichi n'ala Igbo.
Eji azụaka kwee ekele bụ naanị nke ndị chiri echichi n'ala Igbo
Ndị Igbo na-ana azụaka
Nkọwa foto, Etu ndị Igbo si ana azụaka

Ugbua, ọtụtụ ụmụ ntorobia anaghịzị maka nke bụ nke. ọtụtụ n'ime ha na-eji aka nkịtị a na ibe ha azụaka. Mana nke a ezighi ezi, maka na ụdịrị ekele a bụ maka ndị chiri echichi, ndi gburu ehi mgbe gboo, ndị gburu agụ, na ndị obodo ji eje mba. Ya mere Igbo ji atụ ilu n'asị na ọ bụ mma onye nwere ka o ji a na-aka. Nze Ifeanyichukwu Obidike kwuru na "ọ bụ arụ onye echighi ọzọ ikwe onye chiri ọzọ azụaka".

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ndị na-ekele onwe ha

O kwuru na anaghị eji aka nkịtị ekwe n'ụdịrị aka ahụ. "A na-eji mma, mkporo, nza maọbụ ọdụenyi, mkpọ maọbụ njirimara ndị ọzọ. Nke a bụ maka iji chekwaa onwe ha". Ọka mmụta Chigozie Nnabuihe kwuru na mgbe gboo, "ọ bụ naanị ndị chiri ọzọ, ndị gburu ịnyịnya gbuo ehi bụ ndị na-ana azụaka".

Nwaanyị na-ekele onye ichie

O kwukwara na ụmụnwanyị na ụmụaka anaghị a na-azụaka. Onye echighi echichi na onye chiri echichi nwereike ịna aka abụọ maọbụ otu tupu ha ekwezuo ya n'ihu aka. kirie akụkọ a n'uju.