Placenta and umbilical cord: Gịnị mere ichi na eriri otubo jiri dị mkpa n'omenaala ndị Igbo?

    • Onye dere ya, Chioma Nkemdilim Daramola
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Ndị Igbo na-ahụ afọ ime na ọmụmụ nwa dịka ihe ndị na-agbanwe ndụ, nke gafere ihe a na-ahụ n'anya, ma metụta ime mmụọ.

A na-ahụ ihe ndị a n’ihe dị iche iche ha na-eme ma na nkwenye ha gbasara ihe e ji nwaanyị eme, onwunwe ike ọmụmụ na ọmụmụ nwa.

Dịka Ọkammụta V.E. Egwuatu, bụ dọkịta n’ihe gbasara amụmamụ ọmụmụ, kwuru na nyocha na ndepụta ya gbasara ọmụmụ nwa dịka o siri metụta ndị Igbo, na ịbụ nne so n’isi omenala ndị Igbo.

Ọkammụta Egwuatu kwukwara na ndị Igbo hụrụ nwaanyị na-enweghi ike ịmụ nwa ka nsọ ala.

Maka nke a, a na-echekwa ma gbochie nwaanyị dị ime ime ọtụtụ ihe nwereike itinye ya maọbụ nwa dị ya n’afọ n nsogbu.

Iji ma atụ, e nwere ụfọdụ nri nwaanyị dị ime anaghị eri maka na o nwereike ibute ime ọpụpụ.

N’otu aka ahụ, a na-ahụ ichi na eriri otubo dịka ihe ndị dị nsọ n’oge gboo ma ruo taa.

Gịnị bụ ichi na eriri otubo?

Ichi (placenta) bụ akụkụ ahụ na-enye nwa nri, mmiri ọṅụnụ na ufere ndụ dị mkpa ga-eme ka nwa dị ndụ ma too ọfụma.

Eriri otubo (umbilical cord) bụ akụ ndụ jịkọtara ichi na nwa nọ n’afọ. Ọ dị ka paịpụ si na nne enye nwa ndụ.

Ihe mere ichi na eriri otubo jiri dị mkpa n’ala Igbo

Ọkammụta Ogechukwu Ezekwem Williams kwuru na ọtụtụ ndị na-eji nwa (traditional birth attendants maọbụ midwives na Bekee) kwenyere na ọmụmụ nwa bụ oge nwaanyị na-amụ nwa nọ n’etiti ndụ na ọnwụ.

Maka nke a, e nwere ememe okpukpe dị iche iche a na-eme maka nwa na-apụta ụwa.

Nwaanyị mụpụtacha nwa, ọ ga-amụpụtakwa ichi tupu onye na-eji nwa ebipu eriri otubo.

N’ụfọdụ ebe, nwa ahụ ga-eberiri akwa tupu eme nke a.

Ọzọkwa, ọ bụrụ na nwa ahụ ebeghi akwa, a gaghị ama ọkwa na nwa ọhụrụ abịala, maka a na-ahụ nwa pụtara ụwa ọhụrụ ka mmụọ.

Mgbe nwata ahụ bere akwa ka a na-ama nọ ọ dị ndụ.

N’otụtụ ebe n’ala Igbo, a na-eji agụba ebi eriri otubo.

Ọ bụ onye ezinaụlọ nwaanyị mụrụ nwa ka a na-enye akụ ndụ ndị a maka na ha danye n’aka ndị iro, ha nwereike iji ha gwọọ ọgwụ ga-eme nne na nwa ọrịa.

A na-eli ichi na eriri otubo ebe a mụrụ nwa ahụ, maọbụ ebe dị ebe ahụ nso, ma kunye osisi dịka osisi nkwụ, ụkwa, ojoko, unere, ube maọbụ ụdara ebe ahụ.

A na-agụnye osisi ahụ aha nwa ọhụrụ ahụ.

Ndị Igbo kwenyere na mkpụrụ niile osisi nwa ahụ mịpụtara na-egosi na nwa ga-eme nke ọma na ndụ ya.

Osisi ahụ na-ejikọ nwa ahụ na ala, ma jịkọkwa ya na be nna ya.

N’ọgbara ọhụrụ a, a mụọ nwa n’ebe na-adịghị be nna ya nso, ụfọdụ nne na nna na ndị be ha na-eme njem laghachi n’ala nna ha n’obodo ili ichi na eriri otubo ahụ.