Ọzọ title in Igbo Land: Ihe mere ichi ọzọ n'ala Igbo ji bụrụ egwu onye obi kara

Ichi ọzọ bụ omenala dị oke mkpa n'ala Igbo.

Ọ bụ echichi a na-echi onye wepụtara onwe ya ikwu eziokwu na ị bụ onye aka ya kwụ ọtọ n'obodo na onye ga-akwụdoro ndị onweghị ka ọ hara ha.

Onye ọbụla nwereike ichi ọzọ mana ọ bụghị onye ọbụla ga-ekweta ịsọ nsọ dị n'ọzọ.

Nke a mere e ji akwanyere onye ọbụla wepụtara onwe ya ichi ọzọ ugwu n'ala Igbo.

Ichi ọzọ na-abụkaarị ihe nzuzo mana BBC Igbo nwere ohere isonye n'emume ichi ọzọ nke Ọzọ Meniru Nwakaranna n'Amansiodo, Enugu steeti.

Ọzọ Nwakaranna nyere BBC Igbo ohere isonye n'emume ichi ọzọ ya.

O kwuru na ichi ọzọ na "ebute ugwu na adịmasọ".

O kwukwara na onye ọzọ kwesiri ịdị ka Elijah onye amụma dị ndụ gbagoro eluigwe.

Ọ kọwara ịdị nsọ dịka "mmadụ anapụghị ibe ya ihe n'ike, ijekwu nwunye mmadụ, ịtụ asị".

N'okwu ya, o kwupụtara na o riri ya afọ atọ iji chie ọzọ maka ọtụtụ ihe o kwesiri ime.

Ọzọ Nwakaranna sị na onye chiri ọzọ tọrọ onye obula tọbụrụ ya mana na-echibeghi ọzọ.

O kwukwara na onye ọzọ kwesiri ịna-agọ ọfọ na-akpokukwa ndị ichie mgbe ọ na-eme nke a.

Igwe Ngoddy n'Atani, Anambra steeti kwuru na "ihe e ji mara ndị Igbo bụ ichi ọzọ".

O kwusiri ike na nwaanyị anaghị echi ọzọ n'ala Igbo makana "ọ bụ nsọ ala".

Igwe Ngoddy kwuru nke a n'isa okwu gbasara ụmụnwaanyị Igbo chiri ọzọ na London.

Ọ sị na ichi ọzọ bụ ihe e jiri mara ụmụnwoke Igbo.

O kwukwara na ụmụnwaanyị Igbo nwekwara echichi nke ha dị iche iche, mana ọ bụghị ọzọ.

Ọzọ Meniru Nwakaranna sị na "ugbua m bụzị Ọzọ, oriakụ m bụzị Lolo".

O kwuru na ọrụ Lolo bụ inyeaka ịchịkwa ụmụnwaanyị n'obodo ya na ilete ọzọ anya.

Lolo Onyinyechi Meniru sị na, "amaara m na oke ọrụ dịịrị ma dịka nwunye ọzọ, aga m eme ike m imezụ ya".

Amansiodo dị n'okpuruọchịchị Ezeagu dị n'Enugu steeti.