Igbo culture: Gịnị jịkọrọ ụmụnwaanyị na mmọnwụ?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

N'ala Igbo mgbe gboo, mmọnwụ bụ otu na-ahụ maka ikpezi okwu na ịkpa udo n'obodo.

A na-agba mmọnwụ n'emume pụrụ iche ọkachasị ma e wechaa ihe ubi, akwamozu nnukwu mmadụ maọbụ okenye.

A na-ahụta ya dịka mmụọ ndị nna nna nke mere e ji akwanyere mmọnwụ na ndị bara mmọnwụ nnukwu ugwu.

Naanị ụmụnwoke bara mmọnwụ na-eti mmọnwụ.

Mana ugbua, ụfọdụ ụmụnwaanyị agba ọhụrụ na-ajụ ihe mere e ji enye ụmụnwaanyị oche azụ n'ihe gbasara iti mmọnwụ.

Dịka ndị omenala doro anya siri kọwa, ịba mmọnwụ bụrụ ụmụnwoke, ihe ịbanye otu ụmụada bụ nye nwaanyị.

Otu n'ime ha bụ Ọzọ McGinger Ibeneme sị: "Mmọnwụ bụ otu nzuzo. Ọ bụ naanị nwoke bara mmọnwụ na-eti mmọnwụ."

"Mmọnwụ abụghị nwaanyị anaghị."

"Mmọnwụ abụghị ụzọ imegide ụmụnwaanyị"

"Mmọnwụ abụghị ụzọ imegide ụmụnwaanyị, kama ọ bụ maka ichekwa obodo."

"Oge gboo, e nwere ọtụtụ otu; otu ụmụnwoke, otu ụmụnwaanyị, otu ntoroọbịa."

"Ụmụnwoke anaghị azọ ụzọ ịbanye n'otu ụmụnwaanyị."

Nwaanyị nwere ike ịba mmọnwụ

Agbanyeghị na mmọnwụ dịrị ụmụnwoke, o nwere ogogo nwaanyị ga-eru, ọ baa mmọnwụ.

McGinger gara n'ihu kọwaa, "Nwaanyị bụ agbara nwaanyị maọbụ oke nwaanyị enye ya ohere ọ baa mmọnwụ."

Ụdị mmọnwụ dị iche iche

  • Mmọnwụ maka ihe nkiri iji maatụ; Adamma
  • Mmọnwụ maka ichekwa obodo dịka Achịkwụ, Ọgbọagụ

Akụkọ ndị ga-amasị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị: