Ọ bụ gịnị butere agha dara na Kongo?

Foto na-egosi aka mmadụ ji mgbọ egbe ise.

Ebe foto si, AFP

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Mpaghara ọwụwa anyanwụ mba Kongo akụrụngwa ọnatarachi jupụtara n'ime ya nọ na nnukwu ọgbaaghara kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ (30), bụ oge e gbuchara ndị mmadụ n'igwe na mba Rụwanda n'afọ 1994.

Ọtụtụ ndị ekperima amaala ndị nchekwa aka maka ikike ọchịchị na ịlekọta ọtụtụ akụ ndị Chukwu ji chọọ mba ahụ mma.

Gịnị na-eme na Goma?

Dịka ha banyere na mpaghara ahụ ọsọọsọ, ndịagha nnupụisi M23 abanyela Goma, nke bụ obodo a ma ama nwere mmadụ karịrị ọkara nde na mpaghara ọwụwa anyanwụ Kongo.

Mba nọ n'okeala Rụwanda na akụkụ iyi Lake Kivu, ọ bụ mpaghara dị oke mkpa ,aka azụmaahịa na ime njem nke dị n'akụkụ obodo ndị na-atụbata igwe na akụrụngwa ọnatarachi ndị a na-achọsi ike dịka ọlaedo, tin na koltan, nke bụ otu ihe dị ezigbo mkpa e ji emepụta ekwentị na batịrị ụgbọala.

Ndị agha nnupụisi ahụ kwuru na obodo ahụ nọzị ha n'aka mana Gọọmenti Kongo na-ekwu na ndịagha ha ka na-elekọta ụfọdụ mpaghara a ma ama.

Olee ndị bụ M23?

M23 bụ otu ndị agbụrụ Tutsi nọ n'isi ya, ndị kwuru na ha kwesịrị iburu egbe iji chekwaa ikikere agbụrụ ndị ebuchaghị ibu.

Ha kwuru na eruwebeghị isi n'ọtụtụ nkwekọrịta e nwere mgbe gara aga iji kwụsị ọgụ ahụ. Ha nwetara aha ha site na nkwekọrịta udo ebinyere aka n'abalị 23 Maachị 2009.

N'ime obere oge e kepụtara ya n'afọ 2012, M23 nwetara ume ma jichie Goma dịka mbaụwa katọrọ ha ma boo ha ebubo ime mpụ agha na ịmetọ ikikere mmadụ.

A manyere ha iwepụ aka na Goma dịka ndịagha Kongo meriri ha tinyekwara ndịagha UN jiiri ike chụpụ ha na mba ahụ.

N'oge ahụ, ndịagha M23 kwetara isonye ndịagha naanị ma ọ bụrụ na ha ga-ekwe nkwa ichekwa ndị Tutsi.

Ma n'afọ 2021, ndị otu ahụ buuru ngwaagha ọzọ, kwuo na emezughị nkwa e kwere ha.

Rụwanda eso n'ọgụ ahụ?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mba Rụwanda gbara ha agbataobi nọọrọ mgbe gara aga gọọ agụgọ na ha anaghị akwado ndị otu M23 mana kemgbe 2012 ndị ọkachamara UN eboola ha ebubo ịrọpụta ngwaagha, nkwado njem nakwa inye ndị agha nnupụisi ahụ iwu.

Gọọmenti Kongo, Amerịka na Fransị ahụtala Rụwanda dịka ndị na-akwado otu ahụ. N'afọ gara aga, ndekọ onye ọkachamara UN kwuru na ihe ruru ndịagha Rụwanda puku anọ (4,000) so ndị otu M23 alụ ọgụ.

N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Sọnde 26 Jenụwarị 2025, Rụwanda agọpụghị onwe ha kpọmkwem na ha na-akwado ndị otu M23 kama ha kwuru na ọgụ a na-alụ n'akụkụ okeala ha bụ "ezigbo ihe iyi egwu" maka "nchekwa na nkwụdosiike nke mba ha".

Ozi ahụ gbakwunyere na e ji Rụwanda egosi ịmaatụ ma taa ndị ọchịchị Kongo ụta gbasara ọgụ ahụ a malitere ịlụ na nso nso a dịka ha kwuru na ọ bụ maka na ndị ọchịchị Kongo jụrụ ka ha na ndị M23 nwee mkparịtaụka.

Usoro udo Angola malitere bụ nke gụnyere Rụwanda na Kongo mere ka a binye aka gbasara ịkwụsị nkwarịta mgbọ n'afọ gara aga mana ka o sinadị nke ahụ anọteghị aka dịka ha maliteghachiri ịlụ ọgụ.

Kedụ ihe jikọtara ha na Rụwanda?

Ọ bụrụ ma e nyochaa ọgụ a na-alụ ugbua, e nwere ike chọpụta na e nwere ihe jikọtara ya na mmadụ e gburu n'igwe na mba Rụwanda n'afọ 1994.

Ndịagha nnupụisi si n'agbụrụ Hutu gburu ndị agbụrụ Tutsi ruru narị puku asatọ (800,000).

Ogbugbu mmadụ ahụ kwụsịrị dịka e hibere ndịagha nnupụisi Tutsi nke onyeisiala Paul Kagame bụbu ọchịagha ha.

Dịka ha na-atụ ụjọ maka agha mmegwara, ndị Hutu ruru otu nde gbafere okeala ebe a maara ugbua dịka DR Kongo.

Ndịagha Rụwanda wakporo Kongo ugboro abụọ kwuo na ha na-achụso ụfọdụ ndị aka ha dị na ya bụ igbu mmadụ.

Dịka ọ gachara afọ iri atọ (30) ọgbaaghara ahụ dara, otu n'ime otu ndị Hutu a kpọrọ Democratic Forces for the Liberation of Rwanda (FDLR) nke gụnyere ụfọdụ ndị aka ha dị n'igbu mmadụ ahụ ka na-akpakwa ike n'ọwụwa anyanwụ Kongo.

Rụwanda nwereike ọ gaghị apụta na Kongo ruo mgbe o doro ha anya na FDLR abụghịzi ihe iyi egwu nyere ha maọbụ ndị Tutsi bi n'ọwụwa anyanwụ Kongo.

Gịnị ka ndị omee udo UN na-eme?

Atụmatụ ime udo nke otu UN malitere kemgbe 1999. Ndịagha nke ugbua a maara dịka Monusco bụ nke ndịagha karịrị puku iri (10,000) mejupụtara.

Ka o sinadị, n'ime ndị a, naanị ndị Force Intervention Brigade ka e kwere ka ha buo agha megide ndị ekperima ahụ bu egbe. Ọ bụ ndịagha a nyere aka merie M23 n'afọ 2013.

Iwe na-ewe ndị Kongo gbara ndịagha Monusco n'ihi na ha chere na ha anaghị arụ ọrụ ha. Onyeisiala President Félix Tshisekedi hụtara ọrụ ha dịka nke kụrụ afọ n'ala ma gwa ha ka ha pụọ na mba ahụ na ngwụcha afọ gara aga.

Mana ọpụpụ ha hụtara ndọghachiazụ nke mere e ji were otu afọ gbatịkwuo oge ọrụ ha n'ọnwa Disemba.

Maapụ na-egosi Rụwanda na Kongo