Rwanda Genocide: Alọghịchịrị m n'ụlọ kamgbe afọ 30 m gbara ọsọndụ n'ihi ogbugbu agbụrụ

Victoria Uwonkunda aged eight

Ebe foto si, Victoria Uwonkunda

    • Onye dere ya, Victoria Uwonkunda
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Kigali

M na ezinụlọ m hapụrụ n'Rwanda, obodo amuru m afọ 30 gara aga mgbe m dị afọ 12 Maka Ihe egwu mgbukpọ agbụrụ 'Genocide' nke afọ 1994.

Mgbe m n'eto na mba kenya na Norway mechee biri na London, m na echekarị ihe ọ ga-adị ka ya ịlaghachi azụ n'obodo wee mara ka ihe siri dị.

Mgbe e nyere m ohere ịga ebe ahụ ka m mee akwụkwọ akụkọ banyere isiokwu ahụ, enwere m obi ụtọ mana ọtụtụ echiche jụrụ m obi maka ihe m gaa achọpụta na otu ọ ga esi metutam.

Ịdọ aka ná ntị: Ụfọdụ ndị nwere ike ịhụ nkọwa n'akụkọ a na-ewute ha.

Ihe mmetụta uche nke ihe omume a dị n'ụdị nsogbu nrụgide post-traumatic (PTSD), bụ ihe nsogbu wee dịrị m.

Dị ka ọtụtụ ndị Rwanda ozo, ọtụtụ ndị ezinụlọ m nwụru.

m. N'ime naanị otu narị (100) ụbọchị, ndị isi agbụrụ Hutu gburu mmadụ 800,000 ndị otu obere obodo Tutsi, yana ndị mmegide ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha, n'agbanyeghị agbụrụ ha si.

Ndị isi ndị Tutsi bụ ndị were ọchịchị n'ihi mgbukpọ ahụ a na-ebokwa ebubo na ha gburu ọtụtụ puku ndị Hutu na mba Rwanda maka mmegwara.

Ihe Mmetụta ndị a bụ ihe mgbawa obi dịrị m mgbe m rutere n'isi obodo m bụ Kigali.

E nwere m Obi ụtọ ịnụ asụsụ Kinyarwanda na gburugburu m mana echetaram nnukwu ọgba aghara chịrị, na ọtụtụ ndi na-agba ọsọ maka ndụ ha oge ikpeazụ m nọ n'obodo ahụ.

Victoria Uwonkunda ka ọ na-elegharị anya na Kigali, Rwanda n'afọ 2024
Nkọwa foto, Ịhụ obodo Kigali ọzọ wetere m ọnọdụ ntụgharị uche

Ebe ole na ole guru m agụụ ịhụ n'ime obere njem m bụ ụlọ akwụkwọ praịmarị na ụlọ ikpeazụ m biri na Kigali - ebe mụ na ndị ezinụlọ m nọ ọdụ na tebụl nri n'abalị ahụ ihe dị egwu a n'ụbọchị 6 Eprel 1994. Ọ bụ oge ahụ ka anyị oku n'ekwentị na a gbaturu ụgbọ elu onyeisiala. Oku a tụgharịrị ndụ anyị niile.

Ihe kacha mwute m bụ na ahụghịm ụlọ mbụ nke ezinụlọ m. Mgbe m gbalịrị ugboro anọ, a kpọrọ m nne m nọ na mba Norway ka o nwee ike iduzi m.

Mgbe m rutere n'ihu ọnụ ụzọ anyị nke mechiri emechi, echetaram otu ehihie anwụ na-ekpo ọkụ nke anyị nọ n'mbara anyị na-akparịta ụka

Echetaram na ọ bụ nanị akwa atọ ka m chịkọta wee tinye n'ugboala tupu anyị gawa njem anyị na-atụghị anya maka ọgba aghara ahụ.

Victoria Uwonkunda foto ya n'akwa akwụkwọ ya n'afo 1987

Ebe foto si, Victoria Uwonkunda

Nkọwa foto, Ọ bụ ezum ike Ista mgbe mgbukpọ ahụ bidoro

Oke agụụ na-agụtụbeghị m gụrụ m, mana echetaghị m na o nwere onye n'ime anyị kwuru okwu ma ọ bu mee mkpesa, n'agbanyeghị na anyị bụ́ ụmụaka nọ n'azụ ụgbọala ahụ.

N'ụbọchị nke isii, anyị chọpụtara na o nweghị ebe dị nchekwa na Kigali. Ọ bụ ya mere anyị ji sonyeere ndị ahụ na-apụ apụ site n'uzo nke ndị agha ji mmaa mechiri. Ọ dika obodo Kigali n'ile, ọtụtụ n'ime anyị ji ụkwụ, ịnyịnya ígwè, ụgbọala, na gwongworo, na-ahapụ otu mgbe.

Anyị na-aga n'ugbo ezinụlọ anyị nke dị na Gisenyi, nke dị nso n'ókèala Democratic Republic of Congo nke a maara ugbu a dị ka ógbè Rubavu.

Mgbe m mere njem ahụ, echetaram na okporo ụzọ ahụ enweghị nsogbu ọ bụla, a nụghịkwa ụda égbè ma ọ bụ ndị mmadụ na-agba ọsọ n'okporo ụzọ. Ọ bụ ụbọchị dị mara mma nke anwụ na-acha na ya.

Victoria Uwonkunda na-Gisenyi, Rwanda n'afo 2024
Nkọwa foto, The family home in what is now Rubavu district has remained empty since July 1994

Achọtara m ụlọ anyị nwere ebe irahuụra atọ bụ́ nke ndị mmadụ 40 biri na ya n'ime ọnwa atọ ahụ e gburu ndị mmadụ. N'agbaghehi na enweghị onye bi n'ụlọ ahụ kemgbe ọnwa july afọ 1994, ụlọ ahụ ka kwụsịrị ike.

Enwekwara m obi ụtọ izute ụfọdụ ndị ikwu m ndị dị ndụ, gụnyere nwa nwanne m nwoke bụ́ Augustin, onye dị afọ iri mgbe ikpeazụ m hụrụ ya na Gisenyi.

Ọ na-adị m ka m nọ na nrọ mgbe m makụrụ ya. Ihe kasị amasị m banyere ya bụ mgbe anyị na-agba ọsọ n'ubi akwụkwọ nri n'amaghị ogbaaghara na-abịa n'ihu.

Ugbu a, Augustin bụ nna ụmụ anọ. Anyi bidoro ebe anyị kwụsịrị, kpa nkata masara ọtụtụ ihe kemgbe anyị gbagara DR Congo, nke a na-akpọ Zaire mgbe ahụ.

N'okwu ya "Agbapụrụ m nanị m n'enweghị nne na nna wee gafee ime obodo, ebe ndị nne na nna m gafere obodo Gisenyi gaa Goma [obodo dị n'ókèala dị na DR Congo]"

Ndị Rwanda gbara ọsọ ndụ gafere ókè na Goma ịgbapụru ndị agha Rwandan Patriotic Front (RPF) na-aga n'ihu n'obodo Gisenyi nke ugwu ọdịda anyanwụ n’onwa Julaị 19 afo 1994

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ọtụtụ iri puku mmadụ si Gisenyi gafee ókè-ala Goma na onwa Julaị a'fo 1994
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Echiche m enweghị ike ị kọwa ihe ọ gabigara dịka nwata nwoke n'enweghị nne na nna ya n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na Kibumba. Nkem ka mma maka na ndị ezinụlọ m so m gbapụ.

Enwetere m ozi na ụfọdụ ndị agbata obi ya zigara nne na nna ya ozi n'ihi n ekwentị adịbeghị oge ahụ. Ha niile nọrọ na Kibumba ruo afọ abụọ.

Ọ gwara ma na "Na mbido, ihe isi ike di n'ebe ahụ. E nwere ntiwapụ nke ọrịa ọgbụgbọ 'Cholera'. Ndị mmadụ malitere ịrịa ọrịa, ọtụtụ puku mmadụ nwụrụ n'ọrịa ahụ n'ihi adịghị ọcha na enweghị nri kwesịrị ekwesị.

Akụkọ ya yiri nke m ruo n'ọtụtụ uzo. Echetaram ọtụtụ izu m gbara ọsọ ndụ na Goma mgbe ọtụtụ ndị mmadụ na-agbakọta n'okporo obodo ahụ tupu ezinụlọ m enwee ike ịhazi ebe mgbaba na Kenya.

Mana na Rwanda, nwa agbọghọ ọzọ bụ Claudette Mukarumanzi dị afọ 13, nọ na-ahụ na-awụ akpata oyi sitere na-mwakpo mere ugboro ugboro.

Na ọ dị ndụ taa bụ ọrụ ebube. Ọ dị afọ 43 ugbu a, nwee ụmụ ụmụ ma kweta ịkọrọ m ụfọdụ n'ime ahụhụ ọ gabigara - tinyere otu n'ime ndị kpatara ọnyá dị ya n'ahụ.

Otu mwakpo ndị ọ kọwara mere nanị mita ole na ole site n'ebe anyị zutere na Nyamata, obodo dị na ndịda ọwụwa anyanwụ Rwanda.

O kwuru na ọ mere na Chọọchị Katọlik bụ́ ebe ọtụtụ narị mmadụ gbabara, ma bụrụ ndị a chụgharịrị ma gbuo site n'aka ndị ji mma.

N'okwu ya "Ọ nọ n'ime ụlọ uka ahụ mgbe o merụrụ m ahụ́. Ọ na-abụ abụ mgbe ọ ji mma na-egbu m n'ahụ.

O merụrụ m ahụ́ n'ihu, ọbara bido ịgba m n'ihu m. "Ọ gwara m ka m dinaa ala. Mgbe ahụ, o ji ube maa m n'azụ nke m nwere ọnyá ya ruo taa".

Ka m nọ na-ege ntị, o juru m anya ịhụ na anyị abụọ gbara afọ mgbe ụwa anyị kewara.

Ọ gara n'ihu kwuo "O ji ike were mma ya maa m, o wee chee na ube ahụ erutela n'ala".

Claudette Mukarumanzi showing one of the scars on her has on her head in Nyamata, Rwanda
Nkọwa foto, Claudette Mukarumanzi nwere ọtụtụ ọnyá site na ọtụtụ ọgụ

Ọ jisiri ike wepụ ube ahụ dị n'azụ ya wee gba ọsọ. Ọ gbaghara n'ụlọ onye agbata obi ya, na-eche na ọ dịghị ihe ga-eme ya ebe ahụ.

Mana onye ahụ nọ n'afọ iri na ụma zutere Jean Claude Ntambara, bụ́ onye uweojii dị afọ 26 n'oge ahụ.

"Ọ na-ezo n'ụlọ onye nwe ya kpọrọ anyị ma kwuo na e nwere 'inyenzi' n'ebe ahụ", Maazị Ntambara gwara m.

Okwu a pụtara "Uchicha" bụ nke ndị Hutu na ndị mgbasa ozi na-eji ya akọwa ndị Tutsi.

"Achọtara m ya ka ọ dinara ala n'akwa, bụrụ onye merụrụ ahụ nke ukwuu ọbara jụrụ ahụ. A gbaram ya égbè n'ubu iji gbuo ya. "Echere m na e gburum ya n'ihi na e nyere anyị iwu ka anyị ghara ịhapụ onye ọ bụla ndụ".

Ka ụfọdụ oge gachara, ọ gbapụrụ n'ụlọ ahụ, na-awagharị nanị ya ruo mgbe ọ hụrụ onye ọ maara bụ́ onye lekọtara ya.

Igbake ofuma siri ya ike n'ihi na ọ na-afụ ndị wakporo ya n'okporo ámá.

Ibu ọnyá dị otú ahụ miri emi - ndị a na-ahụ anya na ndị a na-adịghị ahụ anya - olee otú ndị mmadụ pụrụ isi gaa n'ihu?

Nwaada Mukarumanzi na mazzi Ntambara so na ndị ahụ chọtara ụzọ. n'ụzọ dị ịtụnanya.

Jean-Claude Ntambara na Claudette Mukarumanzi na-Nyamata, Rwanda
Nkọwa foto, Claudette Mukarumanzi ekwetala ịgbaghara onye kara-igbu ya bụ Jean Claude Ntambara

Ka m na-agagharị, o juru m anya ịhụ ka ha nọ na-achị ọchị n'okpuru osisi nwere akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Mana ịchị ọchị ha mere ka ha ghara ịghọta otú ihe si sie ike.

Mgbe m jụrụ onye ahụ bụbu onyeuweojii ma ọ̀ maara mmadụ ole o gburu n'oge ahụ a na-egbu ndị mmadụ n'Agha Ụwa Mbụ, ọ mara isi ya n'ọnụ.

E mechara bo nwa okorobịa ahụ ebubo ma maa ya ikpe ịga ụlọ mkpọrọ ihe karịrị afọ iri '10' maka òkè ya n'igbu ọtụtụ mmadụ.

Kama ịnọ n'ụlọ mkpọrọ, o mere ọrụ obodo mgbe o gosipụtara nchegharị na njikere ịrịọ mgbaghara.

Ọ gara hụ Nwaada Mukarumanzi. Ọ bụ nanị n'oge nke asaa ọ rịọrọ mgbaghara ka o kwere ịgbaghara ya.

"Ekwesịrị m ịnagide omume m, mata ọrụ m rụrụ, ọ bụghịkwa naanị iwu ndị ahụ e nyere m", ka o kwuru.

Alexandros Lordos, onye ọkà n'akparamàgwà mmadụ nke rụworo ọrụ na Rwanda, kwuru na ọ na-ewe ọgwụgwọ nke ìgwè iji malite ọgwụgwọ nke onwe.

Ọ gwara m na "Ime ihe ike ahụ dị nnọọ n'etiti onwe onye, ebe ndị agbata obi na-awakpo ndị agbata obi, ndị òtù ezinụlọ na-awakpo ndị òtù ezinụlọ. N'ihi ya, ọ na-adị m ka amaghịzi m onye m ga-atụkwasị obi ọzọ".

"Ọgwụgwọ kacha mkpa bụ ịmalite ichefu onye e mejọrọ na onye ahụ mejọrọ ya".

Maka Nwaada Mukarumanzi, ọ bụ ihe gbasara echiche maka ezinụlọ ya.

"Ọ dị m ka ọ bụrụ na m nwụọ n'agbagharaghị ya, ibu ahụ nwere ike ịdị n'ahụ ụmụ m. Ọ bụrụ na m nwụọ na ịkpọasị ahụ ka dịgidere, anyị agaghị enwe ike inwe Rwanda m ga-achọ ka ụmụ m hụ, ọ ga-abụ Rwanda m tolitere n'ime ya.

"Enweghị m ike ịnyefe ụmụ m ihe ahụ."

Victoria Uwonkunda ya na ụfọdụ ndị ezi na ụlọ ya na Kigali n'afo 1980s

Ebe foto si, Victoria Uwonkunda

Nkọwa foto, Foto Victoria Uwonkunda na ụfọdụ ndi ezinụlọ ya na Kigali n'afọ ole na ole tupu ogbugbu ahụ

E mewo ọtụtụ ihe ndị ọzọ iji mee ka ihe di mma. Otu n'ime ha bụ ọrụ Ndị Kraịst nke na-eme ka onye na-eme ihe ike na onye ọ na-emegbu jikọọ ọnụ site na ehi 'cow', nke dị ezigbo mkpa na Rwandan.

Site n'ịkpakọ ọnụ na-elekọta otu ehi - nakwa site n'inwe mkparịta ụka banyere ime udo na mgbaghara - ha na-ewulite ọdịnihu ka mma, nwee olileanya na otu ụbọchị ha ga-aghọ ìgwè ehi.

Rwanda agbaala mbọ ime ka obodo n'otu - n'eziokwu ọ bụ iwu akwadoghị ikwu maka agbụrụ.

Ndị nkatọ na-arụtụ aka na gọọmentị nwere ntakịrị nkwenye - a na-ebo ndị na-emegide ya ebubo ịgọnarị mgbukpọ. Ha kwuru na nnwere onwe adịghị. nke a nwere ike igbochi ọganihu obodo.

Enwere ike ịnwe ụzọ iji merie oge gara aga, nke na-eme ugbua - dịka m gbara akaebe na njem m.

O werela ndị Rwanda afọ iri atọ iru n'ebe a na-emekọrịta ihe.

Ka m mechaa laghachi; maka Nwaada Mukarumanzi na Mazi Ntambara ibikọ ọnụ ọzọ dịka ndị agbata obi.

Ka anyị niile chọta ebe mmerụ ahu dị, oghere anyị ga eji nwere ọgwogwo n'otu n'otu nakwa na ọnụ.

Nghọta na-atụ m n'anya bụ na Rwanda, nwere obi m mgbe niile mana ọ naghị adịkwa ka ụlọ m.

Emewo m udo na nke ahụ na njem a, bụ́ nke nyere m aka ịnwete ogwogwọọ ma mee ka m kweta ịnakwere ihe funahụrụ m.

Victoria Uwonkunda bụ onye ntaakụkọ BBC na onye na-eweta Newsday na BBC World Service.

Can duplicate and include IDT2 graphic rwanda box(Copy) if desired.