Onye bụ nwoke ahụ nwara ịnapụ ọchịchị n'ike na DR Congo?

Ebe foto si, Marcel Malanga Instagram
Mbọ agbara ịkwatụ onyeisiala mba Democratic Republic of Congo na abalị ole ma ole garaaga na ebute ọnọdụ egwu na gbatagbata na mba ahụ.
Ọchịagha Sylvain Ekenge bụ ọnụ na ekwuru ndị agha na DR Congo kwuru na ụbọchị Maay ọtụtụ ndị agha wakpọrọ ụlọ onyeisiala.
O kwukwara na e nwere nwakpo ọzọ e mere na ụlọ Vital Kamerhe bụbụ onyeisiọlụ ma bụrụ onye ya na onyeisiala mba ahụ dị na mma.
Kemgbe e mechere nwakpo ahụ, a nwụchiri mmadụ 50. Mmadụ atọ n'abụghị ndịagha sọ na ndị a wuchiri.
Ọtụtụ chere na ịkwatụ ọchịchị ahụ achọrọ ime si na aka ndị agha na echekwa onyeisiala ha.
Mana e mechere a chọpụta na ọ bụ Christian Malanga bụ onye na akatọ onyeisiala ha kemgbe afọ 2012 bụ onye gbapụlụ na mba ahụ gbalaga na mba US ebe ọ nọ nwere nwete ikike ịbụ nwa amaala mba US.
Ndị agha kwụrụ na a gbagburu Malanga na ụlọ onyeisiala ha ka ọ jụrụ na ndị agha ama wuchi ya.
A hụịrụ ya na soshal mịdịa X, Facebook na ndị ọzọ ebe ya na ndị agha gbara ya gburugburu nọ na ekwu okwu.
Na sochal mịdịa ahụ ka ọ nọ sị “Felix ga apụ n’oche. Anyị na abịa ịwakpọ gị; nwere na eme ka ụwa mara na ya chọrọ ịkwatụ gọọmenti Tshisekedi”.
O kwụrụ na ike agwụgọ ndị agha mba ahụ ịkwadọ Kamerhe na Tshisekedi

Ebe foto si, getty image
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Christian Malanga dị afọ 41 ka a ma dịka otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị nọ na mba ofesi aha ya na ada ụda.
A mụru ya na Kinshasa, na ezinaụlọ Malanga. Ezinaụlọ ya hapụrụ DR Congo oge amụrụ ya gaa Swaziland nwere mecha gaa Salt lake City na afọ 1998.
Ka ọ gụchara akwụkwọ na US, ọ gara mepee ụlọ arụ dị icheiche na nke ọ kpọrọ Africa Helpline Society bụ nke ọ jị enyere ndị mmadụ aka ịgụ akwụkwọ na efu na Afrịka.
Na afọ 2006 ka ọ lọhachịtara DR Congo nwere nwete ọrụ, bụrụ onye agha. Ọ mechere bịdọ ụlọọrụ na enyere aka na ọrụ-ọha na nke na atụ mgbere ịzụta ihe eji arụrụ gọomenti ọrụ.
Na afọ 2011 ka ọ zọrọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwere sọrọ na ndị ga eme ntụlịaka nke ndị omeịwụ. Mana tupuu ebịdọ ntụlịaka, a wụchịrị ya ma jide ya n’ụlọ nga. Ọ nọrọ n’ebe a kpọchịrị ya ịzụụka olemaole”.
E kwuru na oge a tụhapụrụ ya na ebe a kpọchịrị ya, Malanga jụrụ na ya ama bụ onyeịsị ịmụ ọkọrọbịa ma gaa n’ịhụ nweputa otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke ya.
Malanga lọhachịrị mba US na afọ ọzọ nwere weputa otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ kpọrọ United Congolese Party (UCP) . Otu ndọrọndọrọ ọchịchị o gị nwere na akpọkọta ndị Congo Dr nọ na mba ofesi ọnụ.
Ọ bụkwa onyeisioche otu a kpọrọ Nouveau Zaïre’ (New Zaïre) dị na Brussels, n’ ime Belgium.
Ọ bụkwa onye ụka amaala ama. E mere ya Night nke Saint Peter na Paul na Vatican na afọ 2017.
Ọ mere ka ndị DR Congo nọ na mba ofesi dị ịke ma nwere sọshal mịdịa ya na akatọ ọchịchị Tshisekedi.
Na X nke bụbụ Twitter, onye nnọchịta anya ndị US na DR Congo bụ Lucy Tamlyn kọwara akụkọ na efehari na nwa amaala mba US kpara nkata ịjị ndị agha kwatụọ ọchịchị na DR Congo dịka ihe ịtụ na anya.

Ebe foto si, AFP
“Anyị ga enyere ndị ọchịchị DR Congo aka nwere me nyọcha ma taa nwa amaala mba US ọbụla aka ya dị na ịkwatụ ọchịchị”.
Onyeisiala mba DR Congo bụ Tshisekedi enwebeghi ihe ọ kụwrụ maka ndị agha nwakpọro ya ma chọọ ịkwatụ ya n’ọkwa.
Tshisekedi meriri na ntụlịaka e mere na Desemba afọ garaaga. Mmadụ 20 nwụrụ na ntụlịaka ahụ maka ọgbaghara mere na tigbuo zogbuo mere oge ahụ.
Na ọnwa Epril na a họpụtara onye mara ihe dị na akụnụba bụ Judith Tuluka ka ọ bụrụ Praịm Mịnịsta nke mere ya nwanyị mbụ ịnọrọ na ọkwa ahụ na mba DR Congo. Mana Judith Tuluka enyebeghi ndị ọzọ ga anọ na gọọmentị ya ọkwa.
Dr Congo bụ otu obodo nwere nnukwu ihe ọnatarachị ma nwee mmadụ ọnụ ọgụgụ ha rụrụ ‘100million’.
Mana ihe iche aka mgba ha nwere bụ tigbuozogbuo, ihe ụkọ na nghọtahe dị na etiti ndị nọ na ọchịchị na ndị na anọghị na ọchịchị.
Mbọ a gbara ịjị ndịagha wepụ onyeisiala ha bụ ihe na emetuta ohanaeze n’obi. Afrịka enweela ọnọdụ eji ndịagha nwere gbawe ọchịchị n’ike ihe dịka ugboro isii; ụgboro abụọ na Mali, ugboro abụọ na Burkina Faso nakwa otu mgbe na Guinea na Niger.

Ebe foto si, Christian Malanga/Reuters









