'Ihe mere anyị ji 'lie' mmadụ na ndụ'

Igbo sị na Omenala ndị ga-adịrị ndị.

Ya mere ndị Alor jiri kwekọrịta ịli onye ọbụla chiri echichi onye dị ndụ maka na ihe onye ahụ n'akọwa bụ na onye ahụ o chiri echichi ya anwụọla.

Mana ka ha tichere ya bụ iwu n'afọ 2018, ha amaghị na 2022 na mmadụ ga-ada ya bụ iwu.

Olise Igbonwa bụ onye ya bụ Iwu mara.

Olise bụ onye e liri na ndụ, sị na ya apụtachabeghị na-iruuju na ọnụma so ya bụ ihe ụfọdụ ndị be ha hụrụ ka omenala ọhụrụ ha.

Ọ sị na ya ka na ebe akwa arịrị ruo echị maka na ụfọdụ ndị enyị ya ji ya akwa ya emu.

Mana ihe BBC Igbo chọpụtara bụ isi ahụrụ kwawa okpu na ya bụ ihe ihere mere ya bụ nwaamdị bụ na ndị obodo ya bụ Alọr nwere nsogbu gbaasara Igwe ha.

Oge Igwe obodo Aloh nwuru, gọọmentị Anambra steeti tụrụ anya ka ha nwepụta Igwe ọzọ ka otu afọ gachara a kwachara ya.

Dịka onyeisi ọgbakọ obodo ahụ bụ Uzọma Igbonwa siri kọọ, ọ sị na usoro ha ji enwepụta Igwe bụ na ndị Ogbe niile dị n'Alọr ga-ezukọ kwekọrịta onye ha chọrọ ka ọ bụrụ Igwe ha site na Ama ya bụ ọchịchị ruru.

Ka nke a neme, gọọmentị Anambra enyela Igwe Mcathony Okonkwo asambodo dịka Igwe ndị Alọr, mana ụfọdụ ndị mmadụ achọghị ya.

Nke a mere na Ichie Ngene nke mbụ bụ Ichie Samuel Udo jiri jụ ịga nabata Igwe Mcanthony mgbe gọọmentị nyechara ya ikike dịka Igwe Alor.

Nke a mere Mcanthony jiri chọwa onye ga-abụ Ichie Ngene nke ya, maka na Igwe ọbụla n'Alor kwesiri ịnwe Ichie Ngene.

Nke a kwakọrọ isi Olise na Samuel nke mere ka Olise ga-chie echichi onye dị ndụ.

Ya mere ha jiri mee Olise ihe nkwekọrịta ha kwuru na a ga-eme onye mere otu ahụ.

Samuel Udo na-akọwa na Olise so tie ya bụ iwu n'afọr 2018, mana Olise sị na ya esoghị nke ya ji ekweta na udiri iwu ahụ maka na onweela ndị ọzọ dara iwu ahụ n'obodo na ọnweghị ihe e mere ha.

Uzoma Igbonwa bụ Onyeisi nzụkọ ndị Alor bụ Alor People's Congress sị na ọ bụ nnletụ anya mere Olise bụ nwanne ya na nna mere o jiri ga kweta ka ndị achọghị ọchịchị ya rafuo ya.

Igwe abụọ e nwere n'Alọr mere ka ha nwee nzụkọ abụọ nke bụ Alọr People's Convention na Alor People's Assmbly.

Alor People's Convention bụ nke Uzoma Igbonwa nọ n'isi ya nke Igwe ha bụ Igwe Ebelechukwu Chukwumesili , mana Igwe ndị nke Alor People's Assembly bụ Igwe Mcanthony Okonkwo, nke Olise Igbonwa bụ Ichie Ngene nke ha bụ onye e liri na ndụ.

Akwụkwọ ikpe anyị hụrụ na-egosi na ụlọikpe ukwu dị n'Anambra steeti akagbuola ya bụ ikike e nyere Igwa Mcanthony ịbụ Igwe ndị Alọr.

Ya bụ akwụkwọ Ikpe nke e dere n'ụbọchị iri na asaa nke Febuwarị afọ 2022 nke ọkaikpe P.C. Obiorah nọ n'isi ya kwukwara na ọgbakọ Alor People's Assmbly abụghị ya.