You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị mere nwoke jiri nwụchie arụsị ndị Opi Nsukka?
Eze Willy Ezeugwu bụ Igwe obodo Opi Nsụka dị n'Enugwu steeti etinyela ọnụ n'ihe gbasara arụsị otu nwaokoroọbịa a kpọrọ Nnajiofor Donatus bupuru n'obodo ha.
O kwuru sị na onye ọbụla bupuru arụsị obodo Ibeku Opi Nsukka dara iwu.
Igwe Ezeugwu kwuru sị "onye ọbụla kwenyere n'arụsị ga-ekwenye n'arụsị, onye ọbụla kwenyere n'ụka ga-ekwenye n'ụka. Omenala dị dịrị na-aga. Ọ bụrụ na ị gakwuru arụsị sị ya na ị kwere ya nkwa, ị mezughi ihe o kwere, ọ gwụchaala etu ọ ga-esi metụta gị.
Ya mere, nwamadi ahụ kwesịrị iche echiche mara ma e nwere ihe o kwere arụsị na nkwa ọ na-emeghi."
Mana gịnị mere Nnajiofor ji maburu arụsị ahụ pụọ?
Akụkọ kọrọ na Nnajiofor kwuru na arụsị obodo ahụ na-egbochi ọganihu kwesịrị iru ndị obodo Ibeku Opi aka.
O kwuru na ya na onwe ya na-azụ ahịa mmanụ aṅụ, adaala n'azụmahịa ahụ n'ihi arụsị ahụ.
O jizi iwe buru arụsị ahụ gawa n'ụlọụka St.Theresa Katọlik dị na Nsụka, ebe ndị uweojii bịara kpara ya na arụsị ahụ aka ma kpọchie ha n'ụlọmkpọrọ.
Akụkọ ka na-abịa.