You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe anyị ma maka ọnwụ George Smith, onye si Malaysia lọta e gburu n'Aba
"E kpesarala ndị uweojii, anyị na-esikwanụ imi n'ala ịnwụchi ndị mere ihe a, ka ha bịa zaa ajụjụ dịka iwu si chọọ", ka Geoffrey Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa steeti kwuru maka ogbugbu George Smith.
Ogbonna kwuru nke a iji saa ajụjụ a jụrụ ya maka mgbagbu a gbagburu Smith bụ nwaamadi ka si mba Maleshia lọta ndị omekome gbagburu ebe ọ gara ịkpụ isi na mpaghara Ohanku dị n'Aba, Abịa steeti n'ụbọchị 27 nke ọnwa a.
Ogbonna kwuru na ha na-agbasi mbọ ike dịka ndị uweojii ịhụ na ha chọtara ndị kpara arụ a, ma kwuo na ọ bụ n'ihi igbochi ụdịrị ihe a ka ha jiri na-agwa ndị mmadụ ka ha nyere ha aka site n'ịgbara ha ama ndị bụ ndị ọjọọ n'agbataobi ha.
BBC gara n'ihu jụọ ndị agbataobi ahụ site n'ọnụ onye ntaakụkọ kwuru na ndị ogbe ahụ na-ahụta ya ka mmegwara nke ndị otu nzuzo.
Ha gwara onye ntaakụkọ ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya na ọ ga-abụ na ndị otu nzuzo chọtara Smith nke ụfọdụ foto o sere na mbụ gosiri na ọ bụ onye otu nzuzo.
Ha kwuru na nke a abụghị mbụ a na-egbu mmadụ etu a n'agbataobi ahụ, na e gbukwara otu nwaokorobịa n'izu gara aga.
Smith ka mere ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Septemba a dịka ihe o tinyere na Facebook gosiri.