IShowSpeed: Onye bụ nwaamadị a na-ewu ebe niile na Naịjirịa?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nwamadị a ma ama n'ụwa niile na-eme ihe nkiri Bekee kpọrọ 'content creation', onye a maara dịka IshowSpeed, abụrụla onye ọtụtụ ndị ntoroọbịa na ndị nkwado ya n'Afrịka na-ekwu maka ya dịka ọ na-eme njem na mba Afrịka iri abụọ (20).

Oge IshowSpeed, onye ezigbo aha bụ Darren Watkins gara mba Angola bụ mba Afrịka mbụ ọ gara, o kwuru na obi dị ya ụtọ etu ọtụtụ ndị nkwado ya na ndị ntoroọbịa si nabata ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ hụrụ Afrịka n'anya nke ukwuu ma kwuo na ya atụghị anya ụdịrị ịhụnanya a na-enye ya n'Afrịka.

IShowSpeed na ndị otu ya ga-eme njem na mba iri abụọ n'Afrịka gụnyere Naịjirịa, Liberịa, Gana, Aịvri Kost nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

O kwuru na ọ chọrọ iji ohere njem a legharịa anya n'Afrịka ma gaa ọtụtụ ebe dị iche iche, mee ụfọdụ egwuregwu dị iche iche nke gụnyere ihe Bekee kporọ 'stunts' nke bụ ihe e ji mara ya, rie nri dị iche iche, zute ọtụtụ ndị nkwado ya. Dịka ọ na-eme ihe ndị a niile, IShowSpeed kwuru na ọ ga na-egosi ya n'ịntanetị iji nye ndị na-eso ya na soshal midịa ohere ikiri ihe ọ na-eme.

N'okwu ya oge ọ gara mba Saụt Afrịka IShowSpeed kwuru na ọ chọrọ igosi ụwa niile Afrịka.

E nyere ya aha 'Logijimako' oge ọ gara Eswatini nke pụtara 'onye na-agba ọsọ'.

Ụfọdụ ndị mmadụ akatọọla njem ya n'Afrịka ma kwuo na ọ bụ naanị ya na-erite uru ihe ọ na-egosi n'ịntanetị nke Bekee kpọrọ 'livesream'.

Oge ọ bịara Naịjirịa, IShowSpeed zutere ọtụtụ ndị na-emepụta ihe nkiri na Legọs ma gaa ebe dị iche iche, rie nri dị iche iche nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

O mekwara emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya n'ụbọchị Wenezde 21 Jenụwarị, 2026 na Legọs. Ọtụtụ ndị nkwado ya nyere ya onyinye dị iche iche gụnyere uwe na ihe ndị ọzọ.

IShowSpeed kwupụtara ezi ịhụnanya o nwere n'ebe Naịjirịa nọ.

Onye bụ IShowSpeed?

  • Ezigbo aha ya bụ Darren Jason Watkins Jr.
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 21 Jenụwarị 2005.
  • Ọ malitere dịka onye na-eti okwe Bekee kpọrọ 'Gamer' ma bụrụ onye a ma ama n'afọ 2022 tupu ọ malite ime ihe ọzọ gụnyere egwuregwu bọọlụ. O nweela ọtụtụ ihe dị aṅaa na ndụ ya.
  • N'oge gara a, ụlọọrụ YouTube machiri ya ruo otu izuụka maka ihe ngosi gbasara mmekọọahụ o gosiri.
  • A maara ya maka ụfọdụ ihe egwuregwu ọ na-eme nke gụnyere ịwụfe ụgbọala nakwa okwu ụfọdụ ọ na-ekwukarị dịka "What the..." na Siuuu" nke ọ bụ ọgbaa bọọlụ Cristiano Ronaldo na-ekwukarị ya oge ọbụla ọ sụnyere goolu.
  • Ọtụtụ ndị GenZ na ndị ntoroọbịa hụrụ ihe ọ na-eme n'ịntanetị n'anya nke ukwuu.
  • IShowSpeed ezutela ọtụtụ ndị a ma ama mana nke kachasị wuo ewu bụ oge o zutere ọgbaa bọọlụ bụ Cristiano Ronaldo.