Gịnị mere gọọmenti Amerịka ji machie ndi be ha ime njem na steeti Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa?

Njiri mara gọọmenti Amerịka

Ebe foto si, Department of State Website

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọọmenti Amerịka amachiela ndị be ha bi na Naịjirịa ime njem na steeti dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa maka ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ndị ahụ.

Akwụkwọ ozi ha wepụtara na websaịti ha, dọrọ ndị be ha niile ime njem na Naịjirịa ọkachasi Steeti Borno, Yobe, Kogi, Adamawa, Bauchi, Gombe, Kaduna, Kano, Katsina, Sokoto na Zamfara.

Steeti ndị ọzọ gụnyere Abia, Anambra, Bayelsa, Delta, Enugu, Imo nakwa Riva Steeti.

Ozi ahụ Amerịka wepụtara kwuru na ha nyere ndị be ha ndụmọdụ a maka oke mwakpo, ntọrị, ohi nakwa ndị omekome na-akpa mkpamkpa na steeti ndị a.

Mana BBC Igbo kpọtụrụ gọọmenti Abia, Enugwu, Anambra nakwa Imo iji nụrụ ọnụ mmiri okwu ha banyere ndụmọdụ njem a Amerịka nyere ndị be ha.

BBC News Igbo amalitela ịgbasaozi n'ọba ozi Whatsapp Channel
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp

Ihe gọọmenti Enugwu Steeti kwuru

Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu steeti

Ebe foto si, Peter Mbah/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu steeti

Mkparịtaụka anyị na Dan Nwomeh bụ onye ndụmọdụ Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu Steeti, mere ka anyị mara na gọọmenti Gọvanọ Peter Mbah amaghị maka ndụmọdụ njem ahụ Amerịka nyere ndị be ha ime njem n'Enugwu Steeti.

O kwuru na ha ga-eme nchọpụta nke ha ma gwa anyị nchọpụta ha oge ha mechara.

Nzaghachi Abia na Anambra Steeti

Gọvanọ Chukwuma Soludo na Gọvanọ Alex Otti na-achị Anambra steeti

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook/Alex Otti/X

Nkọwa foto, Gọvanọ Chukwuma Soludo na Gọvanọ Alex Otti na-achị Anambra steeti

Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra Steeti bụ Law Mefor, kwuru na ọ bụ gọọmenti etiti Naịjirịa ka ọ dịịrị ịzaghachi ndụmọdụ njem ahụ n'aha steeti ndị o metụtara.

N'okwu ya "Anambra Steeti bụ steeti dị na Naịjirịa ma na-erbe isi nye gọọmenti etiti Naịjirịa. Ọ bụrụ na gọọmenti etiti Naịjirịa zaghachi akwụkwọ ozi ahụ Amerịka wepụtara, ọ bụ oge ahụ ka anyị ga-ama ihe ọbụla ọzọ anyị nwereike ime maọbụ kwuo banyere nke a.

N'aka nke ọzọ, odeakwụkwọ Gọvanọ Alex Otti na-achị Abia Steeti bụ Ukoha Njoku, kwuru ọ bụ gọọmenti etiti Naịjirịa ka ọ dịịrị ịzaghachi Akwụkwọ ozi ndụmọdụ njem ahụ Amerịka wepụtara.

Njoku gwara anyị na Gọvanọ Alex Otti na-agba mbọ iweta ezi nchekwa na steeti ahụ n'agbanyeghị ihe ụfọdụ na-echere ha aka mgba.

Ihe Amerịka kwuru banyere Imo Steeti abụghị eziokwu - Gọọmenti Imo Steeti

Gọvanọ Hope Uzodimma na-achị Imo steeti

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Declan Emelumba bụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Imo Steeti katọrọ ozi ndụmọdụ njem ahụ ma kwuo na Imo Steeti nwere ezi nchekwa zuruoke.

N'okwu ya "Anyị amaghị ebe mba Amerịka si weta ozi ahụ kwuru na Imo steeti enweghị ezi nchekwa, nke bụ eziokwu bụ na mba Amerịka enweghị ụlọọrụ n'imo steeti ọ bụ ya mere anyị ji ajụ ha ebe ha si nweta akụkọ ahụ kwuru zi nchekwa adịghị n'Imo Steeti."

Emelumba kwuru na ozi ahụ Amerịka wepụtara banyere ajọ ọnọdụ nchekwa n'imo steeti abụghị eziokwu.

Ọ gwara ọhanaeze ka ha ghara ige ozi ahụ Amerịka wepụtara nti ma kwe nkwa na gọọmenti Gọvanọ Hope Uzodinma kwụru chịm ichekwa ọhanaeze steeti.