Ekposaala otu ndị uweojii 'Scorpion Unit', tigburu Tyre Nichols

Ebe foto si, MPD
Ngalaba ndị uweojii mba Amerịka a kpọrọ 'Memphis Police Department' ekposaala otu 'Scorpion Special Unit' bụ ndị a na-ebo ebubo itigbu nwata nwoke aha ya bụ Tyre Nichols dị afọ 29.
Nke a na-abịa dịka onyonyo pụtara etu ndị uweojii ise si n'otu a bụ 'Scorpion Unit' si wakpo nwa okorobịa ahụ n'okporoụzọ ma kụọ ya akụ akụ, tupu e buga ya n'ụlọọgwụ ebe ọ nọrọ nwụọ.
Ya bụ ihe mere n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị 2023, mana ọ bụ abalị abụọ gara aga ka onyonyo etu o si mee pụtara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Dịka ndị uweojii si kwuo, ihe 'Scorpion' pụtara bụ "Street Crimes Operation to Restore Peace in Our Neighborhoods", e hibere ya n'ọnwa Ọktoba 2021.
"Scorpion unit' bụ otu anyị hibere n'ụzọ pụrụ iche iji gbochie mwakpo ndị ojiegbe n'okirikiri anyị, mana o doro anya na ihe ndị uweii ise a mere jọgburu onwe ya," CJ Davis, onyeisi ndị uweojii Memphis, gwara BBC.
Aha ndị uweojii e boro ebubo igbu Tyre Nichols bụ Tadarrius Bean, Demetrius Haley, Desmond Mills Jr, Emmitt Martin III na Justin Smith, ha ncha bụcha ndị isi ojii dịka Nichols.
Anyị nabatara mkposa otu 'Scorpion Unit' - Ezinụlọ Nichols

Ezinụlọ Nichols, ndị ọkaiwu ha na ndị na-eme ngagharịiwe n'ihi ọnwụ ya, kwuru na ha nabatara mkposa otu ndị uweojii ahụ gburu nwanne ha.
"Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ime iji kasie ezinụlọ Tyre Nchols obi maka ọnwụ nwa ha, nakwa maka ọdịmma nke ndị niile bi na Memphis," ndị ọkaiwu ezinụlọ Nichols kwuru.
N'agbanyeghịmmiri na-ezo n'ụbọchị Satọde, ọtụtụ ndị mmadụ pụtakwara ime ngagharịiwe maka ogbugbu Tyre Nichols.
Oge akụkọ pụtara na ekposaala otu ndị uweojii 'Scorpion Unit', ndị na-eme ngagharịiwe ṅụrịrị ọṅụ.
"Nke a gosiri na anyị na-eme ihe dị mma site n'iweli olu anyị katọọ ihe ọjọọ," Casio Montez, otu onye so ahazi ngagharịiwe ahụ, kwuru.
Tyre Nichols: Etu ndị uweojii ise si tigbuo ya

Ebe foto si, Reuters/MPD
Ndị uweojii ewepụtala ihe onyonyo etu ndị ọrụ ha mmadụ ise si tigbuo nwoke gbara afọ 29 maka ebubo ịkwọ ụgbọala waawaawaa na mpaghara Memphisi dị n'a mba Amerịka.
N'abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023, ndị uweojii kwụsịrị Tyre Nicols dịka ọ nọ n'ụgbọala ya, kpụpụta ya, ma kụọ ya dukaduka merụrụ ya nnukwu ahụ ma butere ọnwụ ya ka ọ nọchara n'ụlọọgwụ abalị atọ.

Ebe foto si, Reuters
Ọnwụ Nichols na-abịa ka ọ gachara otu afọ ndị uweojii pịgburu George Floyd na Minnesota dịkwa n'Amerịka.
Ihe dị iche n'ọnwụ Nichols bụ na ọ bụ ndị uweojji ịisi ojii kpatara ọnwụ nwa amadi a bụkwa onye ojii ,ebe ndị ọcha gburu Floyd bụ onye isi ojii.
N'ihe onyonyo ahụ, a hụrụ ka ndị uweojii ise ahụ bụ ndị a chụọrọla n'ọrụ ma kpụpụ ụlọikpe na-eti ya ihe ma na-akụ ya ọkọ , ebe nwa amadi ahụ ji otu nwa na-eti mkpu na-akpọ nne ya.
O nweghị ihe gosiri na Nichols jụrụ ka a nwuchie ya oge a na-eti ya ihe a karịa oge ọ zọrọ onwe ya oge ha gbara ya ose n'anya(pepper spray).

Ebe foto si, MPD
Nne Nichols bụ Row Vaughn Wells, kkwuru na nwa ya nwoke bụ ebe dị mita 70 site n'ebe ha bi ka ndị uweojii "gburu ya".
Ndị na-anọchite ezinaụlọ ya kọwara Nichols dịka nwoke ji nwa dị afọ anọ nakwa onye na-arụ ọrụ n'ụlọrụ FedEx.
Ọkaiwu ezinaụlọ ahụ bụ Antonio Romanucci, kwụrụ sị, "E yiri nwoke okorobịa egwu dịka iwu steeti a si kọwaa ụdị agwa a."












