"Onye atakwala nwa m nwaanyị ụta maka ọnwụ Ikenna Erinne" - Francis Van-Lare

Ebe foto si, Amanda Chisom/Francis Van-Lare
Nna mụrụ nwunye dọkịnta Obinna Erinne a sị gbagburu onwe ya na mba Amerịka ekwuola ka onye ọbụla ghara ịta nwa ya nwaanyị Suzzette Chibuogu Van-Lare ụta maka ọnwụ nwamadị ahụ.
N'ihe nwoke a aha ya bụ Francis Van-Lare depụtara n'akara Facebook, o kwuru na Erinne gburu onwe ya ka ọ ghara ịkwụ ụgwọ otu puku dọla na narị itoolu ($1,900) kwa ọnwa dịka ego enyemaka maka ịzụ ụmụ ha.
O kwuru na o nweghi mgbe a sịrị ya kwụọ puku dọla iri na ise ($15,000) kwa ọnwa dịka akụkọ si na-efegharị.
"Ndị asị juru ebe niile. O gburu onwe ya ka ọ ghara ịkwụ otu puku dọla na narị itoolu ($1,900) kwa ọnwa dịka ego enyemaka maka ịzụ ụmụ ha.
"na o nweghi mgbe a sịrị ya kwụọ puku dọla iri na ise ($15,000) kwa ọnwa dịka akụkọ si na-efegharị.
"Onye atakwala nwa m nwaanyị ụta maka mmechu ihu o buteere mmadụ niile."
Van-Lare gara n'ihu kwuo na ọ bụghị eziokwu na a kpachiri akwụkwo ikike ọrụ nke Erinne, o kwuru na o nwere ikike ịrụ ọrụ n'obodo Illinois, New York, Virginia na Maryland.
Van-Lare gara n'ihu kwuo na ọ bụghị eziokwu na Dọkịnta Erinne si Naịjirịa kpọrọ nwa ya nwaanyị bịa na mba Amerịka.
O kwuru na a mụrụ nwa ya nwaanyị n'obodo New York dị na mba Amerịka na ọ gụrụ akwụkwọ ma nweta ọzụzụ na ngalaba ahụịke 'Medical Science'.
Etu a sị na Ikenna Erinna si gbuo onwe ya

Ebe foto si, Amanda Chisom
Dọkịnta Ikenna Erinne bụ dọkịnta na-ahụ maka obi na ọbara, ka anyị nụrụ na o gburu onwe ya ụbọchị Sọnde 26 Jenụwarị 2025 dịka ya na nwunye ya bụ Suzzette Chibuogu Van-Lare na-enwe esemokwu alụkwaghịm.
Akụkọ kwuru na Dọkịnta Ikenna Erinne bụ onye Anambra steeti na nwunye ya na-enwe esemokwu alụkwaghịm kemgbe nke mere ka ụlọikpe nye iwu ka nwunye ya kpọrọ ụmụaka ya abụọ.
A na-ekwu na ụlọikpe nyere iwu ka Dọkịnta Ikenna na-akwụ nwunye ya puku dọla iri na ise ($15,000) kwa ọnwa ọbụla maka nleta ụmụaka ya.
E kwuru na esemokwu a riri Dọkịnta Ikenna nnukwu ego ma mee ka a napụ ya ikike ya ịrụ ọrụ dịka dọkịnta, ọ bụ nke a mere ka o gbuo onwe ya.

Ebe foto si, Francis Van-Lare/Facebook
Van-Lare kwubuuru na "ọ bụ n'elekere atọ nke ụtụtụ ka m nụrụ na Dọkịnta Ikenna ji egbe kpochie nwa m nwaanyị na ụmụaka ya ihe ruru awa atọ dịka ụlọikpe nyere mkpebi ka nwunye ya kpọrọ ụmụaka ha".
"Ọ bụ onye na-eleta ụmụaka ha bụ onye kpọtụrụ ndị uweojii, ọ bụ oge ndị uweojii rutere ebe ahụ ka Dọkịnta Ikenna gbagburu onwe ya maka na ọ chọghị ka ndị uweojii nwụchie ya", ka Francis Van-Lare kwuru.
Francis Van-Lare gara n'ihu kwuputa mwute ya maka ọnwụ Dọkịnta Ikenna ma kwuo na ọbụghị nwa nwaanyị kpatara ọnwụ ya.
Otu onye bụ onye ezinaụlọ Dọkịnta Ikenna na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ụbọchị Mọnde 3 Febụwarị 2025 ka a ga-eli ozu Dọkịnta Ikenna Erinne na mba Amerịka.
Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo na-agba mbọ inụta n'ọnụ ezinaụlọ nwaamadị ahụ lara mmụọ.









