Chaatị na-egosi ebumnobi ụmụafọ mba Gana na ntuliaka ọkwa Onyeisiala ha na-abịa

Ebe foto si, AFP
- Onye dere ya, Brian Osweta, George Wafula & Damian Zane
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Mba Ghana ga-eme ntuliaka kamgbe otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị bidoro ịzọ ọchichi n'afọ 1992.
Kamgbe ahụ e nwere mgbanwe ọchịchị n'udo ugboro atọ. Otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ kachasị na mba ahụ bụ National Democratic Congress (NDC) na New Patriotic Party (NPP) achịala mba ahụ afọ iri na isii.
Okwu a kpụụ n'ọnụ ugbua bụ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị NPP chọrọ ị nọ n'ọchịchị nke ugboro atọ.

Ọnụahịa gbagoro elu nke ukwuu na mbido afọ 2022 ruo pasenti iri ise na anọ (54.1%) karịa etu ọ dị kamgbe afọ iri abụọ gara aga.
Akwa na tomato so ngwa nri ọnụahịa ha riri elu.
Mana nri ndị mba ahụ a mara nke ọma bụ GA kenkey sọ na ndị ọnụahịa ya arịghị elu mana e weturu aka n'etu ọ na aha. Otu isi kenkey na-epezi mpe ugbua.
Ụlọakụ mbaụwa kwuru na ọtụtụ mmadụ danyere n'ọnọdụ agụụ maka ọnọdụ akụnaụba mba ahụ.

N'afọ 2022 ka mba Ghana dara mba ịkwụ ụgwọ ha ji nke mere ha na ndị ọchịchị na mbaụwa ha ji ụgwọ jiri banye n'ịkparịta ụka etu ha ga-esi kwụọ ụgwọ ha gi.
Ebe ndị bi na Ghana gọọment ji ụgwọ ka ha manyere ka gọọmenti na-akwụ ha ụgwọ obere obere.
Gọọmenti na-arịọ kwa International Monetary Fund ka e mere ha ebere maka ụgwọ ha ji ma.
Onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo-Addo kwetere na mba ahụ nọ na-ezigbo nsogbu ma boo ndị na-agba gọọmenti ya ụkwụ dịka ndị aka ha dị na ya.
N'afọ 2019 na 2022 ka gọọmenti mba Ghana ji pasenti iri asaa (70%) n'ego ha nwetere were na-akwụ ụgwọ ha ji.

Enweghi ọrụ na-arịwanye elu so n'ihe na-akwalị ajọ ọnọdụ akụnaụba.
N'ịlaghachị azụ n'afọ iri abụọ gara aga, otu onye n'ime ndị Ghana mmadụ iri abụọ dị njikere ịrụ ọrụ mana ha enweghi ọrụ - ọnụọgụgụ ahụ bụzị otu onye n'ime mmadụ asaa ugbua.
Ebe ihe karịrị ọkara ndị bi na Ghana - ihe dịka nde mmadụ 24 - ndị na-erubeghị afọ 35, ndị ntoroọbịa enweela ihe isi ike.
Maka ndị dị afọ 15 ruo 24, ọnụọgụgụ ndị na-enweghị ọrụ bụ okpukpu abụọ , ya na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 30% enweghị ọrụ.
Echiche nke ndị na-eto eto nwere ike inwe mmetụta dị ukwuu na nsonaazụ ntuliaka ahụ a ga-eme maka onyeisiala.

Ọlaedo bara nnukwu uru n'akụnụba mba Ghana dịka mba iri n'ụwa kachasi emeputa ọlaedo.
Ngwuputa ọlaedo so n'isi okwu n'ime ụnwa ole na ole ugbu a ka ntuliaka na-ebido nakwa ka ndị na-egwu ọlaedo n'ụzọ adịgboroja si emebi gburugburu na mpaghara ahụ.
Mana ka ọnụ ahịa ọlaedo n'ụwa si arịelu, ọ mere ọnụ ọgụgụ ndị chọrọ iso na-egwuputa ọlaedo n'ụzọ adịgboroja ana abanwaye.

Ịtụ mgbere olaedo bụ nnukwu ahịa kacha enye mba Ghana ego, n'afọ 2023 ka ha retere ego ruru $5.2bn (£ 4.1bn).
Tinyere ọlaedo, mba Ghana nwere akụ mmanụ, mmanụ gaas, bauxite na lithium na ihe ndị ọzọ.
Ghana so na ndị kacha azụ ahịa koko n'ụwa niile. Ha nọ dịka ndị nke abụọ kacha n'ụwa.
Ihe ọnatarachi ha nwere gbanwere akụnaụba mba ahụ n'afọ iri atọ garaaga ma mee ka mba ahụ nwee ike ịba ụba nke ukwuu n'oge ahụ.

Afọ iri atọ gara aga ahụla usoro ntuli aka e mere n'udo.
N'ihi ya, Ghana na-emekarị ka ọ bụrụ ihe e ji ama atụ maka ọchịchị onye kwuo uche ya mepere emepe.
N'ọnọdụ ụfọdụ, a na ejiri naani puku votu ole ma ole nwere merie ntụlịaka. Onye e meriri na-anabatakarị nsonaazụ ya hara ịga ụlọikpe.
Anyị na-atụ anya ka anyị chọpụta nsonaazụ asọmpi nke afọ a n'ime ụbọchị atọ nke ntuliaka a ga-eme n'abali asaa n'ọnwa Disemba.











