Onye bụ Mahamudu Bawumia na-azọ ọkwa Onyeisiala Ghana?

Mahamudu Bawumia

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Mahamudu Bawumia
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Mahamudu Bawumia bụbu onye ndọrọndọrọ ọchịchị a na-amaghị ma bụrụ Osote Onyeisiala Gana – a na-atụ anya na ọ ga-eme ihe iribaama ma bụrụ onye okpukperechi Alakụba nke mbụ ga-abụ Onyeisiala Gana n’ọnwa Disemba.

Otu New Patriotic Party nọ n’ọchịchị na Gana, họpụtara Bawumia onye bụ Osote Onyeisiala, dịka onye ga-eji aha pati ahụ zọọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka a ga-eme n’ọnwa Disemba.

Bawumia gbara afọ 61, gụrụ akwụkwọ na mahadum Oxford mba England ma bụrụ onye a maara dịka ‘Mr Digital’ maka na o kwere nkwa ịgbanwe mba Ghana ka ọ bụrụ mba na-eme ọfụma n’ihe gbasara teknụzụ.

Mana ụfọdụ na-ekwu na aka Bawumia dị n’ajọ ọnọdụ akụnaụba mba Gana maka na ọ bụ onyeisi otu na-ahụ maka ngalaba akụnaụba mba Gana.

Ọ bụrụ na o nweta mmeri na ntuliaka a, ọ ga-anọchi Nana Akufo-Addo dịka Onyeisiala Gana, onye oge ọchịchị ya na-abịa na njedebe.

Njirimara ntuliaka Gana BBC rụpụtara
A mụrụ Mahamudu Bawumia na Tamale. Nne na Nna ya bụ Hajia na Alhaji

Ebe foto si, Mahamudu Bawumia

Nkọwa foto, A mụrụ Mahamudu Bawumia na Tamale. Nne na Nna ya bụ Hajia na Alhaji

Bawumia pụtara ihe na ndọrọndọrọ ọchịchị n’afọ 2008 oge ọ dị naanị afọ 44. N’agbanyeghị na ọ rụbeghị ọrụ maọbụ jide ọkwa ọchịchị ọbụla, Nana Akufo-Addo họpụtara ya dịka osote.

Nna Bawumia bụ Alhaji rụrụ ọrụ na gọọmenti Gana oge ha nwetara nwereonwe ha n’aka mba Briten n’afọ 1957. Ya na onye bụbu Praịm Mịnịsta oge ahụ bụ Kwame Nkrumah rụkọrọ ọrụ.

Bawumia bụ onye maara ihe ekwe na-akụ n’ihe gbasara akụnaụba. Nke a mere ka a họpụta ya dịka osote Gọvanọ ụlọakụ etiti Ghana.

Ọtụtụ ndị pati NPP na-ekwu na ha aghọtaghị ihe mere Akufo-Addo jiri họpụta ya dịka onye ga-anọchi ya n’agbanyeghị ọtụtụ ndị isi kara aka nọ na pati ahụ.

Ọ bụ eziokwu na Akufo-Addo dara na ntuliaka ahụ, mana nkwado ya na ịhụnanya ọtụtụ nwere ebe ọ nọ bụ nke Clement Sefa-Nyarko bụ onye nnyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị kọwara dịka ihe anya na-ahụtubeghị na pati.

Nwunye Bawumia bụ onye ọnụ kara aka banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụ onye na-esonye na-achụnta vootu pati NPP.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nwunye Bawumia bụ onye ọnụ kara aka banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụ onye na-esonye na-achụnta vootu pati NPP.

N’okwu ya “O mere ka achụmnta vootu pati NPP chakee, enweghị onye ọbụla nwereike ime nke a ma ọ bụghị ya”.

N’afọ 2012, Akufo-Addo na Bawumia zọrọ ọkwa Onyeisiala mba Gana ọzọ mana ha enwetaghị mmeri.

Pati NPP gbara akwụkwọ n’ụlọikpe maka mpụtara ntuliaka ahụ ebe Bawumia nọ dịka onye akaebe nke mbụ.

Oge a gbara ya ajụjụ ọnụ n’ụlọikpe, ọ zara ajụjụ n’ụdị mere ka ọtụtụ malite ịjụ ‘Kedụ onye bụ nwoke a, o kwesịrị ka anyị kwado ya,” nke a bụ ihe Sefa-Nyarko bụ onye nkụzị na mahadum Kings College, London gwara BBC.

N’afọ 2016, Akufo-Addo gara n’ihu họpụta ya dịka osote ya na ntuliaka afọ ahụ, nke a bụ nke ugboro atọ ha na-azọ ọkwa ahụ.

Pati NPP ji vootu dị pasenti 51.3% nweta mmeri na ntuliaka ahụ, Bawumia mechara bụrụ osote Onyeisiala Gana.

Bawumia bụ nwa nke iri na abụọ n’ime ụmụaka iri na asatọ nna ya mụrụ.

Ndị nkwado Bawumia na-ahụ dịka 'Digital man'

Ebe foto si, Mahamudu Bawumia

Nkọwa foto, Ndị nkwado Bawumia na-ahụ dịka 'Digital man'

Achụmnta vootu Bawumia oge ọ na-azọ ọkwa dịka Osote Onyeisiala gbadoro ụkwụ na mwulite akụnaụba mba Gana, ọ bụ nke a mere ka ọtụtụ katọọ etu ajọ ọnọdụ akụnaụba Gana jiri kawanye njọ dịka osote onyeisiala.

Mana na nzaghachi o nyere, Bawumia kwuru na ọbụghị otu ọ nọ n'isi dịka onyeisi bụ ihe butere ajọ ọnọdụ akụnaụba na Gana maka na ọ bụ naanị ndụmọdụ ka ha nyere gọọmenti.

Okwu ya bụ nke ọtụtụ mmadụ na-egeghị ntị na ya.

Nwunye Bawumia bụ nwaanyị kara aka. Ha alụọla ihe ruru afọ 20. Nwunye ya bụ nwaanyị nwere ọtụtụ ịhụnanya ndị mmadụ.

Bamuwia na nwunye ya mụrụ ụmụaka anọ, ha bụkwa ndị okpukperechi Alakụba nke bụ okpukperechi dị ntakịrị na Gana.

Pati NPP enyela Bawumia nkwado n’agbanyeghị na ọ bụ onye okpukperechi Alakụba.

NPP na-atụ anya na Bawumia ga-enweta mmeri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala a ga-eme na Gana.

Njirimara ntuliaka Gana BBC rụpụtara