"Mụ na ezinụlọ m gbakpuru n'ime 'bunker' iji zere ndụ anyị n'Israel

Aha onyonyo, Etu mụ na ezinụlọ m si gbakpuo na 'bunker' iji zere ndụ anyị n'Israel
"Mụ na ezinụlọ m gbakpuru n'ime 'bunker' iji zere ndụ anyị n'Israel

Otu nwoke onye Ghana ya na ezinụlọ ya bi na mba Israel akọọrọla BBC etu ha si gbaa ọsọ ndụ ha gbakpuo n'ime 'bunker' dịka otu Hamas wakporo Israel n'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị asaa nke ọnwa Ọkụtoba 2023.

Nwa amadị a aha ya bụ Seth Cudjoe kwuru na ya bịara mba Israel maka agụmakwụkwọ, nọrọ ebe ahụ zute nwunye ya ma kpebizie ịnọ na mba ahụ rụwa ọrụ.

O kwuru na ọ bụ nnukwu ihe egwu dịka ha tetara ụra na-anụ ụda ogbunigwe ka ọ na-ada aghara aghara.

"Ngwangwa, akpọlitere m nwunye m na nwa ọhụrụ m, anyị wee gbara ọsọ gbakpuo n'ime 'bunker' dị nso n'ebe anyị bi," Cudjoe kwuru.

'Bunker' bụ ebe a rụrụ n'ime ime ala iji zere ndụ n'oge agha.

"Nke ahụ bụ nke mbụ m na-abanye n'ụdị ebe dị etu ahụ. N'agbanyeghị na anyị nọ n'ime ebe ahụ, anyị nwereike ịṅụ ụda ogbunigwe ahụ ma nwekwaa mmetụta oge ọbụla ogbunigwe dara na nso ebe anyị nọ, maka na ebe niile ga-ama jijiji."

"Ọ bụ nnukwu ihe ụjọ, ọ kachasị oge i nwere nwaanyị na nwa ọhụrụ nọ gị n'akụkụ."

Cudjoe kwuru na ugbua, ọnọdụ ọtụtụ ihe agbanweela n'Israel. Ndị mmadụ anaghị apụtacha etu ha si apụtabu. Ọtụtụ ụlọahịa anaghịkwa emepe.

"Mụ onwe m anaghịkwa m apụkarị apụ. Anaghị m aga ebe ọtụtụ mmadụ nwereike ịgbakọ. Ana m anọkarị nso n'igwe TV nakwa ebe e nwere ịntaneetị, iji na-ama ihe na-eme oge niile, marakwa ihe m ga-eme na ihe mụ ekwesịghị ime," ka o kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọgbaaghara a etinyekwala nnukwu ụjọ n'ime ndị ezinụlọ ya bi na Ghana, dịka ha na-akpọ ya n'ekwentị ugboro ugboro iji mara ma ya na ezinụlọ ya anọkwa ọfụma.

"Agaghị m achọ ka onye ọbụla gabiga ụdị ọnọdụ a m gabigara na ndụ ha."

Mwakpo a Hamas mere na mba Israel bụ mwakpo kacha njọ ha merela na mba ahụ.

Ọtụtụ ndị ọgụ Hamas si na mpaghara Gaza banye na mba Israel dịka ndị otu ha na-atụ ogbunigwe. Ha gburu ọtụtụ ndị mmadụ ma tọrọkwa ihe ruru mmadụ 150 gafee na Gaza.

Gọọmentị Israel ekwuola na ha ga-awakpo Gaza ma hụ na ha lara ndị otu Hamas niile n'iyi kpamkpam.