Aga m emezu nkwa niile m kwere unu - Ademola Adeleke
Ademola Adeleka nke pati Peoples Democratic Party (PDP) onye nwetere mmeri na ntuliaka Ọsụn steeti e mere n’ọnwa Julaị, 2022 akọwarala BBC Igbo etu obi dị ya na ndị pati ya maka mmeri pụrụiche a.
Nke a bụ na pati na-anọghị n’ọchịchị wepụrụ pati nọ n’ọchịchị n’oche.
Na mkparịtaụka a, Adeleke ji asụsụ Igbo owa etu e siri zụọ ya, ihe mere o jiri pụta ịzọ ọkwa, nakwa etu nne ya bụ nwaada Igbo ji zụọ ya n’Enugu steeti.
O kelere ndị niile kwadoro ya ma tunyere ya vootu. Adeleke kwuru ihe ọha kwesịrị ịchọ n'aka ya dịka Gọvanọ ebe ọ kwere nkwa imezu ihe niile o kwuru na ọ ga-eme n'oge achụmnta vootu.
Ọ kwupụtarakwara ọtụtụ ihe banyere ndụ ya, ezinụlọ ya, ọrụ ya dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa atụmatụ ole m ole ọ nwere banyere ịchị Ọsụn Steeti n’afọ anọ na-abịa abịa.

Cheta na Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) kwuputere na o ji mkpokọta vootu 403,371 merie Adegboyega Oyetola nke pati APC nwetara vootu 375, 027.
O meriri Okpuruọchịchị 17 n'ime 30 dị na steeti ahụ. Adeleke ji vootu 28344 merie gọvanọ Adegboyega Oyetola. Ihe dị etu a emetụbeghị mbụ na steeti ahụ.

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Twitter
Onye bụ Ademola Adeleke?
- Aha ya bụ Ademola Jackson Nurudeen Adeleke
- Ọ bụ Ojiegoachụego
- A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Mee afọ 1960
- Ọ dị Afọ 62
- Ọ bụ onye Ede dị n'Osun steeti
- N'afọ 2021, o nwetara nzere nke mbụ n'ihe gbasara Iwu na Ikpemkwụmọtọ na mahadum Atlanta Metropolitan State College, dị na mba Amerịka.
- Ọ zọburu ọkwa sineti na-anọchite Osun Westị n'afọ 2017 na ntuliaka mmegharị e mere, ka nwanne ya nwoke bụ Isiaka Adeleke nwụchara.
- Ọ zọkwara ọkwa gọvanọ Osun steeti na ntuliaka e mere n'afọ 2018, mana ọ zọtaghị ọkwa ahụ.
- Ọ bụ nwanne nna otiegwu a ma ama bụ David Adeleke (Davido)
- A na-etu ya "Imole de" (Ihe 'light' abịala) nakwa "dancing senator" n'ihi etu o si eme ndị mmadụ obi aṅụrị site n'ịgba egwu.
Kirie ihe onyonyo a ka ị nụrụ ihe dị mkpa ịmaghị maka Adeleke ebe a.



