Ihe ị kwesịrị ịma maka Ademola Adeleke zọtara ọkwa gọvanọ Osun steeti

Ademola Jackson Adeleke nke ji ọkọlọtọ pati People's Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa gọvanọ Osun steeti, abụrụla gọvanọ steeti ahụ dịka o meriri ya bụ ntuliaka.
Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) kwuputere na o ji mkpokọta vootu 403,371 merie Adegboyega Oyetola nke pati APC nwetara vootu 375, 027.
O meriri Okpuruọchịchị 17 n'ime 30 dị na steeti ahụ.
Onye bụ Ademola Adeleke?
- Aha ya bụ Ademola Jackson Nurudeen Adeleke
- Ọ bụ Ojiegoachụego
- A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Mee afọ 1960
- Ọ dị Afọ 62
- Ọ bụ onye Ede dị n'Osun steeti
- N'afọ 2021, o nwetara nzere nke mbụ n'ihe gbasara Iwu na Ikpemkwụmọtọ na mahadum Atlanta Metropolitan State College, dị na mba Amerịka.
- Ọ zọburu ọkwa sineti na-anọchite Osun Westị n'afọ 2017 na ntuliaka mmegharị e mere, ka nwanne ya nwoke bụ Isiaka Adeleke nwụchara.
- Ọ zọkwara ọkwa gọvanọ Osun steeti na ntuliaka e mere n'afọ 2018, mana ọ zọtaghị ọkwa ahụ.
- Ọ bụ nwanne nna otiegwu a ma ama bụ David Adeleke (Davido)
- A na-etu ya "Imole de" (Ihe 'light' abịala) nakwa "dancing senator" n'ihi etu o si eme ndị mmadụ obi aṅụrị site n'ịgba egwu






