2023 Nigeria Election: Inec akwụsịla kọmịshọna ntuliaka Abia steeti ọrụ n'ike?

Akụkọ na-ekwu na ụlọọrụ nhazi ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commison (Inec) akwụsịla Kọmịshọna ha na-ahụ maka ntuliaka n'Abia steeti bụ Ọkamụta Uzochukwu Chijioke ọrụ nwamgbenta.
N’akwụkwọ ozi Inec nyere Chijoke nke BBC hụrụ anya, ụlọọrụ Inec nyere nwa amadi ahụ iwu ka ọ ghara ịtụ ụkwụ n'isiụlọọrụ ha dị n’Ụmuahia, Abia steeti ruo mgbe ha ji kwụgharị nke a.
Akwụkwọ ozi ahụ nyekwara ọdeakwụkwọ ụlọọrụ ahụ bụ Clement Oha ikike ka ọ nọrọzịe n’isi ọrụ n’ụlọọrụ ha dị n’Abịa steeti ruo mgbe ha ji kwụgharị nke a.
Ozi a dere "Nke a bụ iji gwa gị (Ọkamụta Uzochukwu Chijioke) bụ Kọmịshịna ntuliaka Abịa steeti mkpebị ụlọọrụ a nke na-ekwu ka ịgharị ịtụ ụkwụ n'isi ụlọọrụ anyị ruo mgbe anyị kwụgharịrị nke a, ọdeakwụkwọ ụlọọrụ a ga-anọzị n'isi ọrụ ugbua ruo mgbe anyị kwụgharịrị"
O dobeghị anya ihe mere Inec ji mee mkpebị a dịka mbọ niile BBC Igbo gbara ịji nụ olu ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye amịtabeghị mkpụrụ.
Akụkọ dapụtara na nso nso a na nke ekwuru si n'aka otu Nigeria Association of Pharmacists in Academia (Napa) nke na-arịọ ọha ka hụ na ọkọ akọghị onye otu ha bụ Ọkamụta Chijioke Uzochukwu.
Ka bụ ozi gbara n'ọha nke A SỊ Ezekiel Olugbenga Akinkumi bụ onyeisi oche otu a binyereaka rịọrọ ndị ọrụ gọọmentị ka kpee ikpe ziri ezi n'isi Uzochukwu.
Ozi a kwuru:
"Akụkọ ntọrọ, jibido n'ike, ịtụ mkpọrọ n'ike nakwa iyi egwu a sị a na-eme otu onye otu anyị rụrụ ọrụ dịka Kọmịshọna ntuliaka na Abịa bụ nke a na-arụ ndị uweojii nakwa ndị ọrụ DSS aka na ya abịaruola anyị ntị."
"Dịka anyị na-akatọ mpụ so ntuliaka ọbụla, anyị na-ekwu na anyị anabataghị etu e si eso onye otu anyị dịka anyị na-akatọ ya."
"Anyị na-arịọ ndị nọ n'isi ọrụ ka ha jiri aka ziri ezi soro okwu a."
Cheta na ọtụtụ akụkọ dị aṅaa si Abịa steeti pụta n'oge ntuliaka nke bụ steeti Ukochukwu lekọtara.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ihe ndị mere na ntuliaka 2023 n'Abia steeti
Otu n’ime ihe dapụtara n’Abịa steeti n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala nakwa nke ndị ụlọomeiwu Naịjirịa e mere n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị, 2023 bụ na ụlọọrụ Inec n’Abia steeti kwugharịrị ihe ha kwuburu banyere imegharị ntuliaka n'ebe ụfọdụ na steeti ahụ.
Inec kwuru na akapịghị ntuliaka ọnụ n'ebe ụfọdụ n’ihi ọgbaghara nakwa nsogbu ndị ọzọ gbochiri ndị mmadụ ịtụ vootu dịka nsogbu enwetaghị akwụkwọ e ji atụ vootu nakwa abịaghị n'oge ndị ndị ọrụ Inec n'ọgbọ atumvootu ụfọdụ.
E mechara Inec pụta kpọta ndị nwetere mmeri na ebe ndị ahụ ekwubụrụ na akapịghị ntuliaka ọnụ.

Kedụ ka nke a siri mee?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onyeisi mgbasaozi Inec n’ihe gbasara ntuliaka na steeti ahụ bụ Rebecca Jimmy nọrọ n'abalị 27 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, (abalị abụọ e ji mechara ntuliaka) kwuo na Inec ga-ezipụta ozi nye ọha ụbọchị a ga-emegharị ntuliaka n’ebe ndị akapịghị ntuliaka ọnụ nke gunyere: Aba-North, Aba-South, Arochukwu, Obingwa, Osisioma, Ohafia nakwa Okpuru Ọchịchị Umuahia-North bụ ebe ndị emeghị ntuliaka ụbọchị ahụ.
Chetakwa na Clement Oha bụ odeakwụkwọ ụlọọrụ Inec na steeti ahụ kwuburu n’ime isi ụlọọrụ Ince n’ụbọchị 26 na a ga-emegharị ntuliaka n’akụkụ ndị ahụ n’ụtụtụ 27 Febụwarị malite n’Elekere Asatọ ụtụtụ ụbọcụ̄ị n’ihi na ha cheere na e megharịghi ya ga-apụta ngụpụ ndị mpaghara ahụ na ntuliaka.
Mana Inec Kọmịshọna ntuliaka steeti ahụ n’oge ahụ bụ Uzochukwu Chijioke mechara pụta kpọpụta mpụtara ntuliaka na steeti ahụ nke nyere ụfọdụ ndị mmadụ mmeri n’akụkụ ebe ndị ahụ emezughi ntuliaka emezu.
Ya bụ ihe gbara ọtụtụ ndị mmadụ gharị.
Ozi sịkwa n'aka ndị uweojii pụta nke gbara n'anwụ na awakpọrọ ụfọdụ akụkụ na steeti ahụ n'ụbọchị ntuliaka.
Ozi ha kwuru na ha nwụchiri otu nwoke ha sị kpọ ndị ojiegbe gaa kụsaa ntuliaka e mere n’ọgbọ ntulika dị n'obodo Itungwa nke dị n'okpuru ọchịchị Obingwa n'Abia Steetị.
Ihe ndị mere so n’ihe mere ọtụtụ ji na-ajụ ọ bụ gịnị mere n’ezie Inec jiri kwụsị kwụsị kọmịshọna ntuliaka Abia steeti ọrụ nwa mgbenta.








