Bode George: Ndị na-agbasa ozi ịkpaoke agbụrụ gwa anyị ihe ha ga-eme ma ha banye ọchịchị Legọs

Aha onyonyo, Bode George: Ndị na-agbasa okwu akpamoke anyị ihe ha ga-eme ma ha baa ọchịchị Legọs
Bode George: Ndị na-agbasa ozi ịkpaoke agbụrụ gwa anyị ihe ha ga-eme ma ha banye ọchịchị Legọs

Bode George bụ otu onyeisi ndị otu patị People's Democratic Party (PDP) ji eme ọnụ.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ndị niile na-agbasa okwu akpamoke, ịkpaoke agbụrụ nakwa nkewa maka ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha pụta kwuo etu ya bụ ihe ga-esi baara Naịjirịa uru.

O kwuru na ha agwabeghị anyị ihe ha ga-eme ma ha banye ọchịchị Legọs.

O kwuru nke a mgbe ọ kpọkọrọ ndị ntaakụkọ na be ya maka mwute ya maka mpụtara ntuliaka onyeisiala 2023 nakwa etu ozi ịkpa oke si ewu na soshal midia nke na-emụta ntuliaka ndị gọvanọ nke 2023.

Bode George: Ndị na-agbasa okwu akpamoke anyị ihe ha ga-eme ma ha baa ọchịchị Legọs
Nkọwa foto, Bode George: Ndị na-agbasa ozi ịkpaoke agbụrụ gwa anyị ihe ha ga-eme ma ha banye ọchịchị Legọs

Bode George kpọkuru ndị niile na-ekwu okwu akpamoke ndị a ka ha kwụsị ya n'ihi na ndị Legọs na ndị si obodo ndị ọzọ na-ebịkọ n'udo na Legọs kamgbe ndị Pọtụgal bịara Legọs.

Ọ gakwara n'ihu maa ha aka n'ihu na-ekwu ka ha kọwaara anyị ihe ha ga-eme ka ha hapụ okwu akpamoke.

Gbasara uche ya maka ntuliaka nke Onyeisiala, ọ sị ka ndị Independent National Electoral Commission -(Inec) megharịa ya bụ ntuliaka ọkwa Onyeisiala 2023.