Onye bụ John Mahama meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala Ghana?

John Dramani Mahama

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, John Dramani Mahama
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

John Dramani Mahama ga-alaghachita dịka Onyeisiala mba Gana dịka Osote Onyeisiala Mahamudu Bawumia bụ onye ya na ya zọrọ ọkwa na ntuliaka ahụ, nabatara ma kwuo na ya kpụrụ afọ n'ala na ntuliaka ahụ e mere ụbọchị Satọde 7 Disemba, 2024.

John Dramani Mahama gbara afọ 65, bụbu Onyeisiala Gana site n'afọ 2012 ruo afọ 2017 ma bụrụkwa onye ndọrọ ndọrọ maara ihe ekwe na-akụ na mba Gana. Na mbụ ọ rụọla ọrụ dịka onye omeiwu, osote mịnịsta, mịnịsta, osote onyeisiala nakwa onyeisiala.

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ihe Mahama maara nke ọma maka na oge ọ dị afọ asaa (7), a tụrụ nna ya Emmanuel Adama Mahama mkpọrọ maka ebubo iwepụ ọchịchị n'ike.

Mahama edeela ọtụ akwụkwọ mana akwụkwọ ya 'My First Coup D'etat', bụ nke nwetara ọtụtụ ọtito n'aka Ngugi wa Thiong'o na Chinua Achebe.

Oge o depụtara ihe bụ ebumnobi ya maka ntuliaka a, Mahama gwara ndị nkwado na Gana chọrọ onye enyemaka maka na ihe niile emebiela.

Mana ọtụtụ na-ekwu na ọ bụghị na ọ bụghị kwesịrị ịbụ onyeisiala. Nke a bụ maka na e nwere ajọ ọnọdụ akụnaụba nakwa ọtụtụ nrụrụaka oge ọ nọ n'ọkwa dịka Onyeisiala.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị.
Pope Francis nwetara akwụkwọ memoir Mahama oge Mahama gara Vatican City n'afọ 2014

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Pope Francis nwetara akwụkwọ memoir Mahama oge Mahama gara Vatican City n'afọ 2014

A mụrụ John Mahama n'afọ 1958 n'obodo ugwu Damongo. Ka ọtụtụ afọ gara, ọ kwagara Accra ebe nna ya Emmanuel Adama Mahama bi.

N'akwụkwọ ya 'My First Coup D'etat', Mahama kwuru na ya bụ nwa anya ruru ala nakwa nwa chọrọ ịma ihe na-eme.

Ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ Achimota Boarding School, otu ụlọakwụkwọ a ma ama zụpụtara ọtụtụ ndị isiala Gana dịka Jerry Rawlings, Kwame Nkrumah onye bụ praịm mịnịsta mbụ Gana oge ha nwetara nwereonwe n'aka mba UK nakwa Robert Mugabe mba Zimbabwe.

N'afọ 1966, Mahama nụrụ na e wepụla ọchịchị n'ike. Ndịagha na ndị uweojii nwụchiri obi ọchịchị Gana ma napụ Nkrumah onye gara njem mba ofesi ikike ọchịchị.

Dịka akụkọ ahụ malitere ifegharị, o nwetaghị ozi ọbụla n'aka nna ya. Mahama dị naanị afọ asaa oge ahụ, malitere iche na e gbuola nna ya maka na ya na Nkrumah na-arụkọ ọrụ.

O mechara chọpụta na-atụrụ nna ya mkpọrọ otu afọ.

N'afọ 1981, e wepụrụ ọchịchị n'ike ọzọ, nke a mere ka nna Mahama gbaa ọsọ gbaga Naịjirịa.

Mahama nwetara asambodo na mgbasaozi na mahadum University of Ghana tupu ọ gaa mahadum Institute of Social Sciences dị na Moscow.

Ka ọ laghachitara Gana n'afọ 1996, Mahama sooro nzọ ụkwụ nna ya n'ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

John Dramani Mahama oge ọ na-achụ nta vootu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, John Dramani Mahama oge ọ na-achụ nta vootu

A họpụtara ya dịka onye omeiwu nke pati National Democratic Congress (NDC), ọ bụ etu a ka o si malite ịrịgo n'ọkwa dịka onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

N'ime afọ iri na atọ, Mahama gbagoro n'ọkwa ma bụrụ Osote Onyeisiala oge Onyeisiala John Atta Mills nọ n'ọchịchị.

John Atta Mills nwụrụ ka ọ nọrọ naanị afọ atọ n'ọkwa Onyeisiala. Ọ gbara afọ 68 tupu ọ nwụọ.

N'ime awa ole na ole, e duru Mahama dị afọ 58 oge ahụ n'iyi ọrụ dịka onyeisiala Gana. Oge e duru n'iyi ọrụ, Mahama kọwara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị dị mwute nye ya.

Ka otu afọ gara, e mere ntuliaka ọkwa onyeisiala. Mahama nwetara mmeri na ntuliaka ahụ.

Mana kedụ ụdịrị onyeisiala Mahama bụ?

John Dramani Mahama

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, John Dramani Mahama

Franklin Cudjoe bụ onye maara ihe ekwe na-akụ banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa onyeisi Imani Centre for Policy and Education, gwara BBC na Mahama bụ onye 'mgbasaozi doro anya'.

Mana onye ọzọ ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị doro anya bụ Clement Sefa-Nyarko kọwara Mahama dịka onye ime ihe doro anya.

Sefa-Nyarko na-akụzi African Leadership na mahadum Kings College dị na London, kwuru na Mahama bụ onye maara ka e si eme ihe ma bụrụ onye maara ka e si agabasaozi.

Mana ụfọdụ ụmụafọ Gana chọrọ onye bụ naanị nkwa ka o na-ekwe ha, nke a pụtara na Mahama nwereike ọ gaghị amasị ha, ka Clement Sefa-Nyarko kwuru.

Oge ọ chụrụ nta vootu n'afọ 2016, Mahama kwuru na ọchịchị ya arụọla ọtụtụ ọrụ na ngalaba njem, ahụike nakwa agụmakwụkwọ.

Maka e nwere nnukwu ajọ ọnọdụ akụnaụba mba Gana nakwa ọkụ latrịk ịda mba n'ọchịchị ya. Nke mere ka a malite ịkpọ ya "Mazi Dumsor" nke pụtara "ọchịchịrị" n'asụsụ Twi.

John Mahama na nwunye ya oge ha gara obi ọchịchị White House mba Amerịka

Ebe foto si, US Embassy in Ghana/Facebook

Nkọwa foto, John Mahama na nwunye ya oge ha gara obi ọchịchị White House mba Amerịka

N'ọchịchị ya, e nwere ọtụtụ nrụrụaka. Iji maa atụ, ụlọikpe UK na ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọelu bụ Airbus, nyere aka azụ iji nweta ọrụ maka ụgbọelu a zụtara ndịagha Gana n'afọ 2009 na 2015, mana ụlọọrụ ọkaikpe Gana kwuru na enweghị ihe akaebe ọbụla gosịrị na aka Mahama dị na nrụrụaka aụhụ.

Cudjoe kwuru na akwụkwọ nnyocha ụlọọrụ Transparency International's Corruption Perception Index (CPI) mere, gosịrị na nrụrụaka kawanyere njọ n'ọchịchị Onyeisiala Nana Akufo-Addo, onye meriri Mahama na ntuliaka ọkwa onyeisiala n'afọ 2016.

Mahama zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2020 mana Akufo-Addo meriri ya ọzọ.

N'agbanyeghi ịkpụ afọ n'ala ndị a, Mahama gara n'ihu ma nọsie ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma nọrọ dịka onyeisi ndị chọrọ inwere ọchịchị.

Mahama bụ onye odeakwụkwọ, o kwuru na ọ hụrụ otiegwu NaỊjirịa Fela Kuti n'anya onye o kwuru na ọ bụ ya mepere ya anya n'ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

John Mahama na nwunye ya Lordina, mụrụ ụmụaka asaa.