O nwere uru unyi baara ahụike mmadụ?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Unyi bụ ihe a na-enweta n'osisi maọbụ anụmanụ a kpọrọ ọkụ.
A na-enweta unyi ọtụtụ ebe dị iche iche ọkachasị n'useekwu ndị bi na mpaghara Afrịka.
Ọtụtụ mgbe, unyi na-abụ ureghure a na-emepụta n'ebe ọ buru ibu karịa ụdị ureghure ndị ọzọ n'ezinaụlọ dị iche iche.
Unyi dị ojii ma dịkwa fere fere. Ọ naghị amịkọrọ mmiri ngwangwa kama ọ na-emechu ihe ọbụla ọ metụrụ.
Ọtụtụ mmadụ na-ahụta unyi dịka ureghure mana e nwere ọtụtụ uru jupụtara n'ime ya, ọkachasị nke ndị ọrụ ahụike jiri aka ha hazie a maara dịka 'activated charcoal'.
Gịnị bụ 'activated charcoal'?

Ebe foto si, Getty Images
Activated charcoal abụghị ụdị unyi sitere na nkụ a na-ahụta n'useekwu dị iche iche.
Etu e siri rụpụta ụdị unyi a bụ activated charcoal mere ya ka ọ na-amịkọrọ mmiri na ihe ndị ọzọ dị mmiri mmiri ebe ọ dị ukwuu.
Nke a na-eme ya ka ọ nweeike ịmịpụta ụmụ ihe adịghị mma n'ihe ọbụla a gbazere agbaze.
Imepụta activated charcoal gụnyere itinye ihe ndị jupụtara n'akụrụngwa carbon [dịka osisi, mkpo aki Bekee maọbụ ntụ osisi (sawdust)] n'ezigbo ọkụ ma gbanye ya ikuku ndụ bụ oxygen.
Usoro a na-amịpụ ihe niile ha mịkọọrọ oge mbụ ma wepụta ohere maka ịmịbata ihe ọhụrụ.
Usoro a na-ebelatakwa oghere dị n'unyi iji mee ka obosara ahụ ya mụbawanye. Ọ na-adị ka ntụ ma bụrụkwa nke e ji eme ihe dị iche iche.
Uru 'activated charcoal' baara mmadụ

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) kwadoro activated charcoal maka naanị iji ya eme ihe n'oge gbatagbata maọbụ mgbe mmadụ riri nsị.
Mana n'ihi ikikere o nwere ikpochapụ nsị ọjọọ dị mmadụ n'ahụ, ụfọdụ ndị ọrụ ahụike akpọọla oku ka e were 'activated charcoal' na-agwọ ụdị ọrịa dị iche iche.
E mebeghi nchọcha zuru oke iji chọpụta uru niile activated charcoal bara mana ọtụtụ ndị na-emepụta ngwaahịa na-adabere naanị n'akụrụngwa chemical dị n'ime ya iji kwado ihe ha kwenyere.
Dr Dike Victor Okechukwu kwuru na e nwere ihe a maara dịka activated charcoal nke adịchaghị ka unyi a na-emepụta n'useekwu.
Dr Dike sịrị na ọ bụ onye riri nsị maọbụ onye ṅụrụ ọgwụ karịa ogogo kwesịịrị ya ka a na-enye ya bụ activated charcoal.
Dịka o siri kwuo "activated charcoal na-akpa ike megide ụfọdụ nsị, ọ bụghị nsị niile".
"E nwere ụfọdụ ihe ọjọọ dị iche iche mmadụ ga-eri maọbụ ṅụọ, enye onye ahụ activated charcoal dịka otu ụzọ e si amipụ ya n'ahụ onye ahụ," ka Dr Dike kwuru
Dabere n'ụfọdụ nchọcha e mere, uru ndị ọzọ activated charcoal baara mmadụ gụnyere;
Unyi na ahụike akụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Activated charcoal nwereike inyere akụrụ mmadụ aka site n'ịmịpụta nsị na ọgwụ na-agbarighị agbari.
Ụfọdụ nchọcha e jiri ụmụ anụmanụ mee chọpụtara na activated charcoal nwereike ịkwalite ọrụ akụrụ ma belata afọ ọzịza na mmebi maka ndị nwere ọrịa akụrụ.
Ịgbado mmiri
O teela aka ndị mmadụ malitere iji unyi agbado mmiri ọṅụṅụ. Etu ahụ o si eme n'ime afọ nakwa n'eriri afọ, activated charcoal nwereike metụta ma mịkọrọ nsị dị iche iche, ọgwụ, nje virus, bacteria, fungus na akụrụngwa chemical a na-ahụta na mmiri.
Ịgwọ ọrịa otoro
Dabere n'enyemaka activated charcoal oge mmadụ riri nsị maọbụ ṅụbigara ọgwụ karịa ogogo kwesịrị ya, ụfọdụ mmadụ nwereike kpọọ oku ka e were ya na-agwọ ọrịa otoro bụ diarrhoea.
Na nchọcha e mere n'afọ 2017, ndị ọkanchọcha kpebiri na activated charcoal nwereike igbochi ahụ mmadụ ịmịkọrọ ọgwụ na nje bacteria na-ebute ọrịa otoro site n'iji aka ya mịkọrọ ha n'onwe ya.
Ndị ọkanchọcha ahụ rụtụkwara aka na activated charcoal nwere obere mmetụta ọjọọ n'ahụ mmadụ tụmadị ma e jiri ya tụnyere ọgwụ ndị e ji egbochi ọrịa otoro.
Ịsa eze na ịkwalite ahụike nke ọnụ
Ọtụtụ ihe ndị e mepụtara maka iji asacha eze nwere activated charcoal n'ime ha.
Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị nwere ikikere ibu agha megide nje virus, bacteria, fungus na nsị ọjọọ dị iche iche.
Ịlekọta akpụkpọahụ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọkanchọcha ekwuola na activated charcoal nwereike ịdọpụta ureghure, ụzụzụ, kemikal, nje na nsị ọjọọ n'elu akpụkpọahụ nke ga-eme ka ọ dị mfe ịsachapụ ha.
Usi ọma
Ụfọdụ usi ọma (deodorant) dị iche iche e ji activated charcoal mepụta juru eju. Unyi nwereike ịmịkọrọ usi ọjọọ na ikuku ọjọọ.
Nke a mere o ji bụrụ ọkachamma maka usi ọma ndị a na-agba n'ogwe aka, akpụkpọụkwụ na igbe njuoyi.
E kwukwara na activated charcoal nwereike ịmịkọrọ mmiri na igirigi ma belata ogogo mmiri dị gburugburu mmadụ.
Ịgwọ ọnya ahụ
Gburugburu ụwa, ọtụtụ ndị dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ na-eji ntụ unyi e mepụtara na mkpo akị Bekee agwọ nje akpụkpọahụ.
Activated charcoal nwereike ibu agha megide nje bacteria site n'ịmịkọrọ ụmụ ihe adịghị mma dị n'ọnya.
Ibelata abụba ọjọọ bụ cholesterol
Nchọcha e mere n'oge ochie chọpụtara na activated charcoal nwereike ịrapara n'abụba bụ cholesterol dị n'ime afọ mmadụ iji gbochie ahụ mmadụ ịmịkọrọ ha.
Otu nchọcha e mere n'oge ochie chọpụtara na ịṅụ activated charcoal dị n'agbata gram anọ na gram iri atọ na abụọ (4 - 32 grams) nyere aka belata abụba ọjọọ cholesterol ruo n'agbata pasenti iri abụọ na itolu na pasenti iri anọ na otu (29% - 41%) n'ime mmadụ ndị ogogo abụba cholesterol ha dị elu.









