Ihe anyị ma maka ogbugbu nwataakwụkwọ Mahadum Alex Ekwueme dị n'Ebonyi Steetị

Ebe foto si, PRO ALEX EKWUEME UNIVERSITY
Ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na ha anwụchiela mmadụ anọ a na-enyo na aka ha dị n’ogbugbu nwataakwụkwọ Alex Ekwueme Federal University bụ Magnus Okeke.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu kwuru na a nwụchiri mmadụ anọ ndị ahụ a na-enyo enyo n’oge ha na-eme nnyocha gbasara ọnwụ nwataakwụkwọ ahụ.
Ukandu sịrị na “anwụchiela mmadụ anọ a na-enyo enyo na aka ha dị n’ọnwụ Magnus Okeke. Anyị ka na-eme nnyocha ịchọpụta ma a tọọrọ ya maka ego, ma e gburu ya egbu ka ọ bụ n’ihi esemookwu ndị otu nzuzo.”
Cheta na Magnus Okeke bụbu nwataakwụkwọ Alex Ekwueme Federal University nọ n’ogogo 400 na ngalaba Accountancy tupu a tọrọ ya n’abalị mbụ nke ọnwa Juun 2024 n’oge ọ na-alaghachi ebe obibi ya dị n’Ohankwu Ndufu Alike mana ka e mesịrị, a chọtara ozu ya n’akụkụ iyi dị n’obodo ahụ.
Etu e si tọrọ ma gbuo Magnus Okeke

Ebe foto si, PRO ALEX EKWUEME UNIVERSITY
Ozi sitere n’aka ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ bụ Iyke Ubochi kọwara na a tọọrọ Okeke n’abalị mbụ nke ọnwa Juun, afọ 2024 n’oge ọ na-alaghachi n’ebe obibi ya dị n’Ohankwu Ndufu-Alike.
Ọ sịrị na ndịisi mahadum ahụ nọ kemgbe agbakọọrọ ndị uweojii na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ aka iji napụta nwataakwụkwọ ahụ n’aka ndị tọọrọ ya mana ka e mesịrị, a chọtara ozu ya n’akụkụ iyi dị n’obodo ahụ.
Dịka Ubochi siri kwuo, nnyocha ndị ọrụ nchekwa mere na-egosi na ọ bụ ndị omekoome si n’Ohankwu gburu Magnus Okeke nke onyendu ha bụ Ogobuchi Uhuo a maara dịka OG Royal.
Ọ sịrị na ndị ọrụ nchekwa anwụchiela ụfọdụ ndị a na-enyo enyo aka ha dị n’arụ ahụ ma gbakwunye na a chọtara ozu yaka ọ na-ere ure n’ụbọchị Mọnde 17 Juun 2024 n’okpuru akwammiri iyi Ako dị na Nwakpu n’okporoụzọ siri Ikwo gawa Abakaliki.
Onyeisi otu jikọtara ụmụakwụkwọ mahadum ahụ bụ Comrade Johnpaul Eze sịrị na enyi nwataakwụkwọ ahụ nwụrụ anwụ kwuru na enyi ya nwoke agbaghị isi akwara oge ndị ntọ jiiri ọgbaatumtum tọọrọ ya.
Onye 'President General' ndị obodo Ohankwu bụ Chibuike Igwe siri na ndị obodo ahụ na-enyere ndị ọrụ nchekwa aka iji chọpụta ihe butere ya bụ ọnọdụ ọjọọ.
Ka osiladị, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu kwuru na adọnyela ozu Okeke n’ọbaozu ebe nnyocha ka na-aga n’ihu.








