Kenneth Dike: Ihe ị maghị maka onye isiojii mbụ bụrụ onyeisi Mahadum na Naịjirịa

Ebe foto si, Kenneth Dike Family
Taa bụ ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba afọ 2022, ka o mere afọ 39 Ọkammụta Kenneth Onwuka Dike ji laa mmụọ. Ọ bụrụ na odogwu a ka dị ndụ, ọnwa Disemba afọ a ka ọ ga-agba afọ 105.
Ọtụtụ ihe gbapụtara e ji mara Kenneth Dike, otu n'ime ha bụ na ọ bụ ya bụ nwa afọ Naịjirịa mbụ bụụrụ onyeisi n'ụlọakwụkwọ mahadum Ibadan, nke bụ mahadum mbụ Naịjirịa nwere.
Akụkọ a bụ iji tulee ndụ na oge nwa amadi a, onye aha ya na-ada ụda nke ukwuu na ngalaba mmụta akụkọ mere mgbe gboo, bekee na-akpọ 'history'.
Onye bụ Kenneth Dike?

Ebe foto si, Kenneth Dike Family
- A mụrụ odogwu a bụ Kenneth Dike n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Disemba afọ 1917, n'obodo ya bụ Awka, Anambra steeti.
- Nna ya bụ Nzekwe Dike, onye dibia mgbọrọgwụ na onye na-azụ ahịa, ebe nne ya bụ Nwudu Dike. Nne na nna ya nwụrụ oge ọ bụ nwata
- Ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị na 'Government School, Awka, tupu ọ banye 'Dennis Memorial Grammar School' dị n'Ọnịcha, mana ebe ọ nọ gụchaa sekọndịrị bụ na 'Achimota College' dị na Gold Coast, nke a na-akpọzi Ghana ugbua.
- Akwụkwọ Mahadum ya bụ na mba dị icheiche nke gụnyere Sierra Leone, England, na Scotland.
- Dike na nwunye ya, Ona, mụtara ụmụ ise, ụmụnwaanyị atọ (Nneka, Chinwe, Ona) na ụmụnwoke abụọ (Emeka, Obi).
- N'otu mkparịtaụka Ọkammụta Emeka Dike na ndị ntaakụkọ nwere, o kwuru na nna ya bụ Kenneth Dike bụ onye nkuzi ụka n'ụka Anglịkan. "Ọ chọbuuru ịbụ ụkọchụkwụ, mana ọ rụrụ ọrụ dịka 'cathechist' oge anyị bi n'Aba. Ọ na-akpọ 'organ' n'ụlọụka n'oge ahụ," ka Emeka kwuru.
Ọtụtụ ihe e ji echeta Kenneth Dike

Ebe foto si, Kenneth Onwuka Dike Library
Ihe ọtụtụ mmadụ ma gbasara Kenneth Dike bụ na ọ bụ ya bụ onye Naịjirịa nke mbụ bụụrụ 'Vice Chancellor' na Mahadum Ibadan bido na 1963 ruo 1966, mana nke ahụ bụ naanị otu n'ime ike ọ kpara oge ọ dị ndụ:
- Ọ bụ onye Afrịka mbụ bụ onyeisi mmụta 'history na Mahadum Ibadan
- Onyeisi otu jikọrọ mahadum niile dị na otu 'Commonwealth' - 1965
- Akwụkwọ o depụtara na nzere PhD ya: ‘Trade and Politics in the Niger Delta, 1832 -1885’, hibere ntọala maka ọmụmụ akụkọ mgbe gboo nke mpaghara Afrịka
- Ọ bụ ya bụ nwa afọ Afrịka mbụ nwetara nzere PhD na ngalaba akụkọ mgbe gboo nke Afrịka.
- Onye hibere otu 'Historical Society of Nigeria' n'afọ 1955
- Onyeisioche kọmiti haziri ọgbakọ 'International Congress of Africans' nke e mere na mba Ghana n'afọ 1963

Ebe foto si, NSAG (Nederlands studenten Afrika Gezelschap)
- Oge agha Biafra bidoro, Kenneth Dike sonyeere Biafra, ma bụrụ onye nnọchite anya mba ahụ n'ụwa niile.
- Oge agha kwụsịrị, ọ gbafere mba Amerịka ma bụrụ ọkammụta na mahadum Havard.
- Ọ bụ onyeisi na ngalaba mmụta maka Afrịka - 1971 ruo 1973
- Ọ bụ ya bụ onye mbụ e nyere ọkwa 'Mellon Professor' na mmụta akụkọ mgbe gboo nke Afrịka na Mahadum Havard
- Dịka nwa ya bụ Emeka si kwuo, Kenneth Dike bụ onye hibere Mahadum Tekịnụzụ nke mbụ e nwere na Naịjirịa, ya bụ 'Anambra University of Technology'. Ọ bụ Mahadum a mụtara Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka, nakwa Mahadum sayensị na Tekịnụzụ dị n'Enugwu (Esut).
- O so na ndị haziri egwuregwu Festac nke e mere na Naịjirịa n'afọ 1977.
- Ọ bụ ya hibere ngalaba nchekwa ihe mgbe gboo na Naịjirịa, nke a na-akpọ 'Nigerian National Archive
Gọọmentị Anambra steeti, n'oge ọchịchị Gọvanọ Peter Obi, rụrụ ọba akwụkwọ steeti ma kpọọ ya aha Kenneth Dike iji cheta ya ma kwanyere nnukwu mmadụ a ugwu.

Ebe foto si, Kenneth Dike





