Lee ụfọdụ ikpe ndị wuru ewu nke metụtara mkpagbu ikike dịịrị onye na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Ka mba ụwa na-eme ncheta ikike ruru mmadụ nke afọ 2024 n'ụbọchị Dizemba 10, bụ ụbọchị otu jịkọrọ mba ụwa bụ United Nations (UN) hibere maka icheta ikike ruuru mmadụ.
Mana e nwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji aju kedụ etu ọnọdụ ikike dịara mmadụ sị dị na Naịjirịa ugbua?
Ndị ọnụ na-eru n'okwu na ngalaba ikpe ziri ezi nakwa iwu obodo zara ajuju a ma rụtụaka etu ọnọdụ iwu ikike ruuru mmadụ sị dị na Naịjirịa.
N'okwu António Guterres bụ odeakwụkwọ UN gbasara ụbọchị taa, ọ sị "n'ụbọchị ncheta ikike ruuru mmadụ, eziokwu tara akpụ bụ ihe nọ anyị n'ihu ma na-ekiri anyị".
Guterres bere akwa arịrị sị "a na-emebi ikike dịaara mmadụ. Nde pụrụ nde mmadụ nọ n'ihe ụkọ, usoro ahụike na agụmụakwụkwọ dara mba".

Ebe foto si, Getty Images
"Nkewa dị n'etiti ndị mmadụ na ọgbaaghara na-aga n'ihu ebe anaghị akwanyere iwu mba ụwa ugwu bụ ihe karịrị ugbua".
"Ọchịchị aka ike na-akpagbu ndị ọnụ n'eru n'okwu, ebe ịkpa oke na-akwalita nkewa na ọgbaaghara".
Guterres gara n'ihu kpọọ oku "ka mba ụwa kwado ọchịchị onye kwuo uche ya. Mee ka ndị nta akụkọ na-arụ ọrụ n'enweghị nsogbu ma mee ka ikike ruuru ndị ọrụ kwụrụ chịmchịm".
"Ikwalite ndị mmadụ ka ha nwee ikike ibi ndụ ha na-enweghị mkpagbu, ahụike nakwa ime ka gburugburu dị mma.
"ịnye ndị na-ahụ maka ikike ruuru mmadụ nkwado dịka ha na-arụ ọrụ ha ma chekwa ikike dịara mmadụ".
Gịnị bụ ikike ruuru mmadụ nke mba ụwa?
Ikike ruuru mmadụ nke mba ụwa bụ iwu UN meputara nke gosiri etu gọọmentị dị icheiche na mmadụ ga-esi akpa agwa, ihe ha ga-eme nakwa ihe ndị ụfọdụ ha ekwesighị ime.
Iwu ndị ahụ na-agbado ụkwụ n'ihe gọọmenti ga-eje kwado ikike dịara mmadụ nakwa nnwere onwe mmadụ na otu dị icheiche.
UN kọwara usoro niile gọọmenti ga-eji kwadoo ikike dịara mmadụ na ngaraba dị icheiche site n'omenaala, ruo na akụnụba, ọchịchị, ebe obibi na mmekọ mmadụ na ibe ya.
Iwu ikike ruuru mmadụ bidoro mgbe mba ụwa nwere nkwekọrịta n'afọ 1945 nakwa afọ 1948 bụ oge mba ụwa niile so na UN binyere aka ma kwekọrịta ahụ.
Kemgbe ahụ UN nweputara ikike ruuru mmadụ etu o siri metuta ụmụaka, ụmụnwanyị, ndị nwere nkwarụ, ndị na-adịghị ike na ndị ọzọ dị icheiche.
Ikpe wuruenwu n'afọ 2024 na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Afọ 2024 bụ otu afọ ụmụ amaala Naịjirịa agaghị echefu na ntabịanya maka ikpe dị icheiche gbasara ikike dịara mmadụ.
Ọtụtụ n'ikpe ndị ahụ bụ ikpe dị n'etiti ndị mmadụ na gọọmentị mana e nwekwara ọtụtụ n'ime ya metutara mmadụ na ibe ya.
Ọtụtụ ndị ọkaiwu BBC Igbo gbara ajuju ọnụ weputara ikpe dị icheiche ha hụrụ dịka ikpe wuruenwu nke a ga-eji cheta afọ 2024.
Ikpe Gloria Okolie na Gọọmenti etiti Naịjirịa
Otu ikpe agaghị echefu bụ ikpe ụlọikpe ECOWAS kpere n'etiti Glory Okolie na gọọmenti etiti Naịjirịa.
ECOWAS mara Naịjirịa ikpe n'ụbọchị Thọzde, abalị 21 nke afọ 2024, ma sị ha kwụọ Glory Okolie ego iti aka n'obi ruru iri nde naịra maka ịda iwu ikike dịara ya dịka mmadụ.
N'ikpe ahụ, ndị uweoji bọrọ Glory ebubo ịbụ onye otu ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ nke gọọmenti machiri n'oge ahụ. Ha kpụrụ Glory gaa ụlọikpe ebe e siri ziga ya n'ụlọnga ma taa ya ahụhụ oge ọ nọ n'ụlọnga.

Ebe foto si, Gloria Okolie
Ụmụaka a wuchiri na ngagharịiwe oke agụụ n'ọnwa Ọgọst 2024

Okechukwu kwuru na ikpe megidere ikike dịara mmadụ dị na Naịjirịa gunyere mkpagbu ndị mmadụ mee ka ha hara ikwu obi ha, iji ndị uweoji na ejide ndị na-eme ngagharịiwe ọkachasị nke a kpọrọ #EndBadGovernance, nwuchi na iti ndị mmadụ ihe".
Cheta na e jidere ọtụtụ ndị mere ngagharị iwe maka gọọmentị ọjọọ ahụ a kpọrọ "(#EndbadGovernance Protest)" bụ ndị uweoji jidere ziga ha ụlọikpe ebe e si tinye ha n'ụlọ mkpọrọ ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ịrị na asatọ.
Oge e dutere ụmụaka ahụ n'ụlọkpe dị elu nke Federal High Court, dị n'Abuja ka ndị mmadụ tiri mkpu maka ọnọdụ ụmụaka ahụ nọ dịka ndị na-erighị nrị, ndị a kpọrọ agụụ n'ụlọnga bụ nke mere gọọmentị etiti jiri kwuo ka akwụsị ikpe ha.
Ikpe Sikiru Alade na Gọọmenti etiti Naịjirịa
Ọkaikpe Ricardo Cláudio Monteiro Gonçalves kpebiri ikpe sị na ijide Glory nọtee aka karịa ka iwu si kwuo kemgbe ọnwa Juun 2021 dara iwu dịara ikike mmadụ nke "Article 7 of the African Charter" na ndị ọzọ.
N'okwu ọkaiwu bụ Ogbachalu Abuchi Goshen "ikpe dị n'etite Sikuru Alade na gọọmenti Naịjirịa bụ otu ikpe a ga-eji cheta ikike dịara mmadụ n'afọ 2024".
"Ndị uweoji jidere Alade n'abalị itoolu n'ọnwa maachị afọ 2003 jide ya n'ụlọọrụ ha ma mechaa kpụrụ ya gaa n'ụlọikpe magie bụ ebe ha nọ tinye ya n'ụlọnga nchere oge ebe ọ nọrọ afọ itoolu".
"Ụlọikpe ECOWAS kpebiri ikpe ahụ ma nyekwa Naịjiria ntaramahụhụ sị ha kwụọ Alade ego iti aka n'obu bụ nke ha gbakọrọ kwa afọ kwa afọ".
Ikpe Dele Farotimi na onyeisi ndị uwe ojii gbasara Ọkaikpe Afe Babalola

Ebe foto si, Dele Farotimi / Instagram
N'afọ 2024, ọkaiwu Ogbachalu Abuchi Goshen na ndị ọkaiwu ndị ọzọ anyị gbara ajuju ọnụ kọwara na e nwere ọtụ ikpe bidoro n'afọ a bụ nke wuruewu.
N'okwu Ogbachalu "ugbua anyị nwere ikpe dị n'etiti ọkaiwu Dele Farotimi na onyeisi ndị uweoji".
Ogbachulu kọwara ikpe ahụ dịka otu ikpe na-egosi etu e si emebi ikike dịara mmadụ.
Cheta na ndị uweoji jidere Dele Farotimi maka ebubo imetọ aha ọkaiwu Afe Babalola n'akwụkwọ ọ dere bụ nke ndị uweoji siri na ọ megidere iwu Naịjirịa ma metọọ aha Babalola.
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Okechukwu Nwanguma bụ onyeisi ụlọọrụ Rule of Law and Accountability Advocacy Centre (RULAAC) na-ahụ maka ikike dịara mmadụ.
Ikpe Speed Darlington na Burna Boy

Ebe foto si, Speed Darlington and Burna Boy / Intagram
Ikpe ọzọ dara ụda n'afọ a bụ ikpe ndị na-eti egwu mmadụ mmadụ abụọ bụ Speed Darlington (Darlington Okoye Achakpo) na Burna Boy (Damini Ebunoluwa Ogulu)
Nikpe ahụ okaiwu Darlinton bụ Deji Adeyanju kwuru na "ndị uweojii wuchiri Speed Darlington n'Owerri n'ihe dịka elekere 2:30 n'ụtụtụ ụbọchị 23 Novemba 2024 n'ụlọ ezumike ọ na-ehi ụra ka o tichara egwu."
N'ikpe ahụ a na-ekwu na ndị uweojii jidere Speed Darlington n'ụzọ na-adịghị n'iwu.
Ikpe Pigdom na ndị uweojii
Ikpe oti mkpu Naịjirịa bụ Isaac Bristol, onye a na-ekwu na ọ bụ ya na-ahụ maka PIDOM Naịjirịa na gọọmenti etiti Naịjiriịa bụkwa otu ikpe wuruewu.
E kpere Bristol ikpe maka ebubo ịgba Naịjirịa mgba okpuru nke gụnyere ebubo ịkpọkọta ndị mmadụ ma na-akpọ oku nkwado ịkwanye gọọmenti ọkụ n'ahụ site na ngagharịiwe #EndBadGovernance.
E bokwara ya ebubo ikwu okwu ụgha megide Onyeisiala Bola Tinubu gbasara nrụrụakaego tinyekwara inweta na ikesa ozi bara oke uru n'ụzọ iwu megidere.
Ndị ọkaiwu na-ekwuchitere ya bụ Abubakar Marshal na Deji Adeyanju gbara ụkwụ megide ụfọdụ mpaghara ebubo ndị ahụ ma kwuo na ebubo ịgba Naịjirịa mgba okpuru bụ nke na-enweghị ebe ọ gbakwasara ụkwụ.
Kedụ usoro a ga-esi hazie inweta ikpe ziri ezi?
Ọkaiwu Ogbachalu kwuru na otu n'ihe ga-eme ka ọnọdụ ịkịke dịara mmadụ dị mma na Naịjirịa bụ ka ndị isi ọrụ nchekwa ọkachasi ndị uweoji nwe ntara m ahụhụ oge ọbụla e metọrọ ikike dịara mmadụ.
Ọ kwuru na ndị ọkaikpe nakwa otu jịkọrọ ndị ọkaiwu bụ Nigeria Bar Association (NBA) nwekwere ọrụ dịara ha.
Ọ kpọrọ oku ka gọọmenti steeti dị icheiche na-enyere aka na-akwado ndị e megidere ma ọ bụ kpagbuo ka ha nweta ikpe ziri ezi n'ụlọikpe.
"Ọ bụrụ na steeti dị icheiche ga-enyere aka gbaara ndị niile e megidere ikike dịara ha akwụkwọ n'ụlọikpe, nke a ga-enyere aka beleta imegide ndị mmadụ".
N'aka nke ọzọ, Okechukwu bụ onyeisi ụlọọrụ RULACC kwukwara na "ime ka ndị ọkaikpe nwere onwe ha ga-eme ka iwu Naịjirịa kwụrụ chịmchịm ma hazie usoro iweta ikpe ziri ezi"








