Ụlọikpe Ecowas ekwuola ka ndị uweojii kwụọ Gloria Okolie N30m ego itiakanobi

Gloria Okolie

Ebe foto si, Gloria Okolie

Nkọwa foto, Gloria Okolie
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ụlọikpe nke ọgbakọ mba ndị ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas n'ịchafụ amaala ndị uweojii Naịjirịa ikpe ịkwụ Gloria Okolie naira nde iri atọ maka imegide ikike ruru ya dịka mmadụ.

Nke a pụtara ihe n'ụbọchị Tọzde dịka Ọkaikpe Ricardo Cláudio Monteiro Gonçalves kwuru na o doro anya na ndị uweojii megburu Okolie site n'ijichi ya karịa abalị iri isii dịka iwu si nye n'akpụpụghị ya ụlọikpe.

Cheta na anwụchiri Okolie a ma dịka Biafra spy girl n'ọnwa 2021 n'Orlu maka ebubo na ọ na-enye ndị Ipob na ESN ozi ma na-agbaziri ha ụzọ.

Alaka pụrụiche nke ndị uweojii a kpọrọ Intelligence Response Team bụ ndị nwụchiri Okolie jichiri ihe ruru abalị narị abụọ na iri anọ na asatọ ma na-emegbu ya dịka ọ na-agba odibo site n'ịsụ akwa ma isi nri n'ebe e ji ya.

Samuel Ihensekhien Jr bụ ọkaikpe Okolie gwara ụlọ ntaakụkọ FIJ na gụnyere nha N30m nke ụlọikpe dara ndị uweojii Naịjirịa, ha dakwara gọọmentị Naịjirịa nha otu nde naira ma si ha kwụọ Okolie nke ahụ maka omume ha n'ụlọikpe ahụ.

Ụlọikpe Ecowas kwuru na gọọmentị etiti gburu oge n'ikpe ahụ maka na ha jụrụ itinye akwụkwọ ga-eme ka ya bụ ikpe gaa n'ihu.

Cheta na ndị ezinụlọ Okolie malitere ịchọ ya n'ụbọchị 17 nke ọnwa Jun 202; ha chọrọ ya gaa ụlọọgwụ nakwa ụlọekpere dị icheiche mana ha ahụghị ya.

Ọ bụ mgbe ndị mmadụ malitere ịme mkpọtụ na soshal midia ka ndị uweojii kwetara na ha ji nwaagbọghọ ahụ dị afọ 21 mgbe ahụ ma bozie ya ebubo ịzụtara ndị ESN na Ipob ngwa agha.

Etu Gloria Okolie ga-esi nweta nde naịra 60 ụlọikpe kwuru ka ndị gọọmentị kwụọ ya

Usman Alkali Baba, Gloria Okolie na Abubakar Malami

Ebe foto si, Nigeria Police/Gloria Okolie/Abubakar Malami

Nkọwa foto, Ụlọikpe nyere iwu ka ndị uweojii nakwa ụlọọrụ AGF kwụọ Gloria Okolie nde naịra 60

Ndị ọkaikpe akọwaala etu Gloria Okolie nwere ike isi nweta nde naịra iri isii (N60 million) bụ nke ụlọikpe nyere iwu ka gọọmentị Naịjirịa kwụọ ya.

Gloria Okolie bụ nwaada ndị uweojii nwụchiri n'ọafọ 2021 n'ihi ebubo na ọ bụ onye otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob), nke bụ otu a machiri amachi na Naịjirịa.

Ọkaiwu Aloy Ejimakor, onye bụkwa ọkaiwu na-anọchite anya ndị otu Ipob, kwuru na gọọmentị Naịjirịa ga-akwụrịrị nwa ada a ụgwọ ya, ma ha achọrọ ya ma ha achọghị ya.

Akụkọ ndị yitere nke a:
Alloy Ejimakor
Nkọwa foto, Aloy Ejimakor bụ okaiwu na-anọchite anya ndị Ipob nakwa onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu

Ejimakor kwuru sị: "Ọ brụ na AGF maọbụ ndị uweojii jụ ịkwụ ụgwọ ahụ, e nwere ụzọ a ga-agbaso iji napụta ha ya bụ ego."

"E nwere usoro iwu a na-akpọ 'garnishee proceedings', nke ụlọikpe ga-eji manye ụlọakụ ọbụla ebe ego ndị uweojii dị, ka ha kwụọ nwa ada a ụgwọ ya."

"Ọ bụrụ na ụlọikpe nye mkpebi a bụ 'garnishee order', iwu ka ọ bụ na ụlọakụ ga-eruberiri isi."

"Ọ gaghịzi abụ okwu gbasara ndị uweojii, ọ ga-abụzi okwu gbasara ụlọikpe na ụlọakụ."

Gịnị bụ 'Garnishee Proceedings'?

Akara iwu

Ebe foto si, Getty Images

"Garnishee proceeding" bụ otu usoro iwu nke mmadụ ga eso iji napụta ụgwọ mmadụ ji ya.

Iji maa atụ: "Ọ bụrụ na mmadụ ji gị ụgwọ ma jụ ịkwụ ya, ụloikpe nwere ikike inye ụlọakụ ebe ego onye ahụ dị ikike ka ha si n'ego onye ahụ dị n'ụlọakụ ha kwụọ gị ụgwọ onye ahụ ji gị," Ọkaiwu Felix Jonathan kọwara.

Felix Jonathan bụ odeakwụkwọ ndị otu 'Association of Igbo Lawyers', ngalaba nke Abuja.

"Ọ bụ n'ụzọ dị otu a ka nwa ada Gloria Okolie nwere ike iji nweta ego ya, maka na onweghị onye karịrị iwu obodo."

Etu e si nwuchie Gloria Okolie

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị uweojii nwụchiri Gloria Okolie n'Orlu, Imo steeti n'ọnwa June afọ 2021.

Gloria kwuru na ọ na-aga ozi mgbe ndị uweojii nwuchiri ya.

Ndị ezinụlọ ya malitere ịchọ ya n'ụbọchị 17 nke ọnwa Jun; ha chọrọ ya gaa ụlọọgwụ nakwa ụlọekpere dị icheiche mana ha ahụghị ya.

Ndị uweojii mechara buru Gloria gaa Abuja ma kpọchie ya n'ụlọ mkpọrọ ha ihe karịrị ụbọchị 240.

Ha boro ebubo na Gloria bụ onye na-ewetara ndị Ipob na ESN ozi ha ji awakpo nakwa egbu ndị ọrụ nchekwa.

Ndị uweojii kwukwara na ọ bụ nwa ada a na-azụtara ndị ekperima ọgwụ ike, mgbọ egbe nakwa ngwaọgụ ndị ọzọ.

Mana Gloria gọrọ agọ na ebubo niile ndị a bụ asị.

Ọkaiwu Gloria bụ Samuel Ihensekhien gbara ndị uweojii akwụkwọ, ụlọikpe wee kpebie na njichi e jichiri nwa ada Gloria Okolie megidere ikike dịịrị ya dịka mmadụ nke bekee na-akpọ 'Fundamental human rights'.

Na Juun 23, 2022, Ọkaikpe Y. Haliyu, nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja, nyere iwu ka ụlọọrụ 'Attorney General of the Federation' nakwa nke ndị uweojii, kwụọ Okolie nde naịra 60 iji kasie ya obi maka imekpa ya ahụ.

Mana gọọmentị erubeghị isi na ya bụ iwu, nke mere ka Gloria na ndị ọkaiwu ya gakwaa ụlọikpe ọzọ.

N'ụbọchị Tọzde, abalị iri na asatọ nke ọnwa Ọgọst 2022, ụlọikpe nyekwara iwu ọzọ ka gọọmentị Naịjirịa, site n'ụlọọrụ AGF na nke ndị uweojii, kwụọ nwaada Gloria ya bụ ụgwọ.