Harrison Gwamnishu Murder case: "O nweghi onye m gburu, o nweghi onye m hụrụ ebe e gburu ya"
Harrison Gwamnishu agọrọla isi onwe ya na oku ndị uweojii kpọrọ ya bịa zara ọnụ ya maka otu okwu ọnwụ ha na-ekpe.
O depụtara ma facebook ya si "O nweghi onye m gburu, o nweghi onye m huru ebe egburu" ka o kwuru.
N'ozi ọzọ a wepụtara o kwuru sị "ha (ndị uweojii) kaara iche ka anyị gwa ọha mmadụ ihe anyị chọpụtara (maka Gloria Okolie) tupu ha akpọwa m oku".
Harrison bụ onye a ma ama na-achọ ikike ruru mmadụ, ọ bụ ya kwuputara maka Gloria Okolie nke ndị uweojii ji na mkpọrọ ma na-achọsị mmwereonwe ya ike.
O nyekwara Ada Jisos aka mgbe ọ dị ndụ na-arịa ahụ n'ụlọogwụ.
BBC Igbo ka na-agbalị ịnweta olu ndị uweojii gbasara okwu a.

Ebe foto si, Harrison Gwamnishu/Screenshot
Dịka ndị uweojii depụtara akwụkwọ ozi ha were sị na nwa aghọhọ Gloria Okolie na ndị otu Ipob na-arụ ọrụ, otu nwoke aha ya bụ Harrison Gwamnishu onye na alụrụ ndị na-eweghi ka ọ hara ha ọgụ ikike diri onye ezipụtala ozi nke ya .
Gwamnishu nọ n'isi okwu ịgbapụta Glorie Okorie kamgbe ọnwa ole ma ole ekwuola uche ya maka ozi ọhụrụ a ndị uweojii zipụtara site na akara Instagram ya n'ụbọchị Sọnde.
Ọ dere na akwụkwọ ozi a ndị uweojii zipụtara turu ya n'anya dịka ọ pụtaghai kemgbe uwa ma pụta ugbua e kwuru na ndị uweojii nwụchiri nwaada a n'ụzo n'ezighi ezi.
Ọ jụrụ ajụjụ ndịa n'akwụkwọ ozi ya -
- Gịnị mere ndị uweojii jiri nwuchie nwaada karịa nwaada a ụbọchị iri asaa ma ha edepụtaghị akwụkwọ ozi ha.
- Gịnị mere ha ji jiri ya mere onye odibo na-asara ha akwa ma na-esiri ha nri na "Tiger Base" nke dị n'Owerre ma ọ bụrụ na ọ dị njọ ka ha siri depụta?
- Gịnị mekwara ndị uweojii jiri nwuchie onye kwuru na Okolie nọ n'aka ndị uweojii.
- Ọ jụkwara na ọ bụ gịnịmere ha akpọpụghị ya ụloikpe kamgbe ha nwụchịrị ya maka iwu Naijirịa kwuru na ha enweghị ikike ijide ya karịa ụbọchị iri anọ na asatọ?
Na nchịkọta ya o kwuru na ozi a ndị uweojii zipụtara bụ ozi ikpuchi mpu ha mere n'isi nwaada a. Chetakwa n'ụbọchị Satọde, Maazị Gwamnishu gọsịrị foto ma zipụta ozi n'akara Facebook ya n'arịọ ọha ka ha tinye aka n'okwu mgbapụta nwaada Okolie dịka ndị ezinụlọ ya bụ nwaada bịara hụ ya ma lete ya n'okwu arịrịọ mgbapụta ya bụ nwaada.
Nwagbọghọ ndị uweojii kwuru na-atụpenyere ndị otu Ipob nakwa ESN azụ
Ndị uweojii kwuru na ha anwụchịela otu nwata nwaanyị ahụ ya bụ Gloria Okolie dịka nyocha ha kwuru na aka ya nọ na mwakpoo ole ma ole a sị ndị otu Ipob na ESN mere na mpaghara ọwụwa anyanwụ n'ọnwa ndị gara aga.
Mwakpo ndị a gụnyere mwakpo ụlọọrụ ndị na-ahụ maka ntụlịaka bụ Inec, na ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ mkpọrọ dị n'Imo Steetị.
Osote ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abuja bụ Aremu Adeniran bụ onye wepụtara akwụkwọ ozi a kwuru na nyocha ha gosiri ebe Nwaada Okolie kwupụtara na ọ bụ onye otu Ipob na ESN, ma na-enyere otu onye ndu otu a aka, ya bụ nwaokorobia ndị uweojịị nwụchịrela na mbụ e ji aha "Onye Army" mara.
Akwụkwọ ozi ahụ kwukwara na nwada Okolie na e ji ụzọ aghụghọ dịka ọ bụ nwata nwaanyị egosi onwe ya ka onye aka ya dị ọcha mana aka ya adịghị ọcha dịka o so e butere ndị otu a ego, ọgwụ ike nakwa ngwa agha di iche iche.
Ozi a kwupụtekwara na nwaada a bụ onye na e si na nzuzo na-ezịtere ndị otu Ipob na ESN ozi.
Dịka ha si dee ha na-achịkọta ọrụ nnyocha ha ọnụ ma na-akwado ikpụpụ ya ụlọ ikpe.
Site n'ozi a onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba kelere ndị ọrụ nchekwa maka mbọ ha na-agbasi ike na ọrụ ichekwa udo na ndụ ndị mmadụ n'ala Naijịrịa.
'Ndị uweojii boro nwanne m nwaanyi ebubo na ọ bu onye Ipob were kpọchie ya kemgbe ọnwa Juun'
Otu nwoke aha ya bụ Christian Okolie kwuru na ndị uweojii nwụchiri nwanne ya nwaanyị bụ Gloria Okolie kemgbe ọnwa Juun 2021.
Maazị Okolie sị na nwanne ya nwaanyị gbara afọ iri abụọ na otu kwesiri ịga ule Jamb tupu achọwa ya.
Dịka o si kọwa, ọ bụ ịhụ mmadụ ka nwanne gara tupu a nwụchie ya kpọrọ ya gawa ngige a na-akpọ Tiger Base dị n'Owere.
Maazị Okolie sị na ọ nọ abalị ole ma ole tupu ha mata ebe nwanne ya nwaanyị nọ.
Ọ sị: "Ekwentị Glory kụwara n'ụbọchị ahụ, ya agbaapụ sị na ya na-abịa."

Ebe foto si, Christian Okorie
Glory si otu ahụ baa ọkada pụọ.
Ọ lọtaghịzị ụbọchị ahụ ruo mgbe ekwentị ya nyụrụ ọkụ.
Ha malitere chọwa Glory n'ụlọọrụ ndị uweojii mana ọbaozu dị iche iche n'Owerri.
Ha gakwuru ụlọọrụ ndị uweojii ka ha were akụrụngwa teknụzụ ha chọpa "sim card" ekwentị Glory.
Ka ha kwụchara puku narị naịra iri ise n'ụlọọrụ steeti CID, ha nyeere ya aka chọpụta na sịm kadị fonu Glory dị na Tiger Base dị n'owerri.
Mana mgbe Christian chọrọ ịchọro ya gawa, ndị mmadụ gwara ya ka ọ ghara ịga maka na ebe ahụ dị egwu.
Ọ sị na, ọ teghị aka, onye ọkada aha ya bụ Izuchukwu okeke onye bu Glory mechara bata dịka a na-chọkwa ya achọ kemgbe izuụka abụọ.
Ọ bu nwaamadị ahụ kwuru na ya hụrụ Glory na Tiger Base, ọ bụ ha abụọ ka ejidere ụbọchị ahụ.
"Ruo taa onweghị onye gwara m ihe Glory mere".
E mechekwara jidegharịa ya bụ nwaamadị maka na ndị uweojii sị na ọ bụ ya gbara ama na Glory nọ ebe ahụ.
Ọtụtụ ndị uweojii nara ha ego iji gbapụta Glory mana onweghị isi.
Ọ sị na ndị be ha ji ọsọ gawa Tiger Base ịgbapụta nwa ha mana ekweghị ha hụ ya.
Ọ sị na ndị uweojii mechere zịga Glory Ụlọmkpọrọ ha dị n'Abuja bo ya na o so n'otu Ipob/ESN.
Otu onye na-emere ndị mmadụ gbata gbata bụ Harrison Gwamnishu bụ onye gbara okwu nwa ada n'anwụ site itinye ya n'akara Facebook ya.
Na ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara Gwamnishu ụbọchị Tọzde bụ taa, ọ sị na ọ bụ enyị Glory ka ndị uweojii na-eche na o so na otu Ipob, mere ha jiri kpụrụ ya.
Ọ sịkwa na ya amaghị ihe ha ka ji jide Glory kemgbe Juun agbanyeghị na ha ejidele enyi ya nwoke.
Ọnwebeghị ihe ndị uweojii gwuru maka ya bụ okwu.
Harrison Gwamnishu gwuru na ha na ndị uweojii nwere mkparịtaụka taa n'Abụja maka ịtọhapụ Glory.
Christian sịkwa na ndị uweojii Owerri na-akpọkwa ya ka ọ bịa ka ha kpezie.
Mana ọ sị na ọ gbagwojuru ya anya ihe mere ha ji akpọ ya ugbua.
Ọ sị, "gịnị mere ha akpọghị m kemgbe ọnwa atọ ha m na-achọ ha ka ha hapụ nwanne m".
Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa sị ka anyị kpọchie ya azụ n'awa abụọ na-abịa.


