Harrison Gwamnishu na Egbeigwe: Ihe mere James Ubulu ji si ka eweghachite ego ọ nyere Kingsley Orji
Akụkọ ọhụrụ apụtala n'okwu ego enyemaka nwoke akpọrọ James Onwordi Ibori Ubulu nyere nwaamadi na-eme ejije bụ Kingsley Orji site n'aka onye na-arụ ọrụ ikike dịrị onye bụ Harrison Gwamnishu.
N'ozi Harrison Gwamnishu zipụtara site n'akara Facebook ya n'ụbọchị Fraịdee, o kwuru sị na James Ubulu agwala ya ka ọ weghachịte ego ahụ ọ nyebụrụ Kingsley Orji.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ ya jụọ ya ihe kpatara ya bụ nwoke ji si ka e weghachịte ego ahụ, ọ kọwara anyị na Kingsley na James kpara n'izu a, mana na mkparịtaụka ahụ dị ka ogaghị nke ọma dịka James gwara ya ka ọ mee ihe onyonye ọhụrụ tinye na ịntanetị etu o si mee na mbụ gwa ọha na ya bụ Harrison abụghị onye oshi nakwa na orighị nde naịra ise (₦5,000,000) ahụ e nyere ya.
O kwukwara na ha gwara ya na ọ ga-eso usoro ha hiwere ịhụ maka njem ahụ nke otu n'ime ya bụ iwepụ aka hụ na haziri ya njem ahụ dịka ha kwuru na ha aghaghị inye ya ego ahụ n'aka.
Harrison kwukwara na Kingsley mere ihe onyonyo mgbe ha kpere udo n'izu gara aga mana omezughi ya ka ha si chọọ dịka akagbughị ihe ndị o kwuru na mbụ nke butere ya na James nghọteghe ọhụrụ nke kpatara o jizi si ka e weghachite ya bụ ego.

BBC Igbo kpọkwara Kingsley jụo ya nke bụ eziokwu n'ihe ọhụrụ a pụtara, ọ kwuru na n'ezia ya na James nwere mkparịtaụka maka ime ihe onyonyo ọhụrụ mana na ọ rịọrịọ ya arịrịọ ka e zitere ya ego ahụ tupu o mee ya bụ ihe onyonyo dịka oge ime njem a na-aganahụ ya nakwa ndị ọrụ njem na-akpọ ibịa mee ya bụ njem ahụike ya n'India.
O kwukwara na James gwara ya wepụ ma kagbuo ihe niile o dere na mbu gbasara Harrison na akara Facebook ya, n'okwu ya ọ sị na dịka ọ mere nke a na Harrison ewepụbeghị ihe ndị ọ dere gbasara ya bụ Kingsley.


