Friday the 13th: Mkpọbi ụkwụ na ọdachi ndị mmadụ kwenyere nwereike ime taa

Ụmụnwaanyị na-eme omenala

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị na-eme omenala
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọtụtụ ndị kwenyere na ụbọchị ọbụla Fraịde danyere n'ụbọchị 13 (Friday the 13th) n'ọnwa bụ ụbọchị ihe ọjọọ dị iche iche na-eme, mana ọ bụ eziokwu?

E nweghị onye ma etu nkwenkwe agbadoghị ụkwụ na nnyocha nke Bekee kpọrọ 'superstition' nke ụbọchị Fraịde a si bido, mana ọtụtụ ndị kwenyere na ya.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe kpatara Fraịde danyere n'ụbọchị 13 ji bụrụ ihe a na-ahụ dịka ihe ọjọọ sitere n'akwụkwọ nsọ; maka na Judas bụ onye mere ihe e ji kpụrụ Jesus Kraịst, bụ onye 13 nọdụrụ ala iri nri ikpeazụ Kraịst na ndị ụmụazụ ya riri nke Bekee kpọrọ 'Last Supper'.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ihe ọjọọ dịka mmerụ ahụ na ụfọdụ oge ọnwụ, bụ ụdịrị ọdachi na-eme maka ụbọchị a.

Ụfọdụ ụlọ oriri na nkwari dị na mba ofesi na-eji maka ụjọ ghara inwe ọnụ ụlọ a kpọrọ 13, ụfọdụ ụlọ ogologo anaghị enwe 13, ebe ụfọdụ ụgbọelu anaghị ekwe etinye 'row 13' n'ụgbọelu ha.

N'ala Igbo, o nwere ihe nrụbaama na-eyi ndị Igbo egwu ma ha mee.

Ụfọdụ ha bụ ndị a:

1. Ikwuikwi ibe n'abalị

Ikwuikwi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Igbo na-ahụta ikwuikwi ibe n'abalị ka igosi ọdachi mere maọbụ ga-eme eme

Ikwuikwi bụ otu nnụnụ anaghị ele anya ọma n'ala Igbo.

O bee n'abalị, a na-ewe ya na ọ na-egosi ọnwụ mmadụ maọbụ ọdachi ndị ọzọ.

2. Egbeigwe ịgba ma mmiri anaghị ezo

Amúma

Ebe foto si, Getty Images

A na-ewe ya ka oke odachị emeela maọbụ na ọ chọrọ ime ma ọ bụrụ na egbeigwe gbara na-enweghị mmiri ọbụla zoro.

3. Chi iji ehihe ji

Chi iji ehihie jie (sunset at dawn) na-egosi oke ihe dịka ọnwụ oke mmadụ, ọnwụ okorobịa.

4. Ikpo ụkwụ aka ekpe na mbido njem

N'ọdịnala Igbo a na-ahụ mmadụ ịkpọ ụkwụ akaekpe na mbido njem dịka ama ihe ọjọọ ga-eme.

Ụkwụ akaekpe kpọọ onye nwere nkwenye a, ọ ga-alaghachi be ya, hapụ njem ọ kwadoro.

Ikekwe ọ bụrụ mgbaama ihe mberede okporoụzọ maọbụ na ije onye ahụ agaghị enwe isi.

Ị ma na afọ 'leap year' nwere Fraịde 13 atọ?

Afọ niile na-enwerịrị otu 'ụbọchị Fraịde 13', ụfọdụ na-enwekarị otu ọkachasị afọ bụ 'leap year'.

Bekee kpọrọ ụjọ Fraịde 13 'paraskevidekatriaphobia.'.

Ndị BBC One dere ihe ọ dị ka ya ma ị nọrọ n'ụlọ naanị gị ma nụ mkpọtụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Ụfọdụ ndị mmadụ na-atụ ụjọ ime ụfọdụ ihe ụbọchị ọbụla Fraịde manyere na 13 nke ọnwa ọbụla.

Ụfọdụ na-agbachido onwe ha n'ime ụlọ ka ha nwee ike ghara ịdabanye n'ihe ọjọọ ha na-eche ga-eme ụbọchị ahụ, ebe ndị ọzọ na-agara onwe ha na-atụfughị uche maka ihe ọjọọ ọbụla.

@RogerCraigSmith kwuru sị "asala ahụ, awala nkụ, agala chọpụta 'ihe bụ mkpọtụ ahụ'...nọrọ n'ụlọ lee ihe nkiri na-atụ ụjọ."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@BeverleyTemplem kwuru na o nwere ike ịbụ Fraịde 13 mere Instagram anaghị arụ ọrụ ugbua.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@WoodGreenAndy kwuru na ụbọchị a gara were were n'ebe ọ nọ.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

@Akn3773Stanton na-ekele ndị mmadụ

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ