Lee etu ọzọdimgba si eji mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ agwọ onwe ha ọrịa - Sayensị

Ọzọdimgba nọ n'ime ọhịa

Ebe foto si, Elodie Freymann

Nkọwa foto, ọzọdịmgba

Ndi sayensị kwuru na ọzọdịmgba na-ata ahịhịa nwereike ịgwọ ndị mmadụ ọrịa, nke na-akwụsị ihe ụfụ, na nke na-egbu nje n’ime ọhịa.

Ha mere nke a n’oge ha nyochara etu ọzọdimgba merụrụ ahụ nakwa nke dara n’ọrịa si eji mkpaakwụkwọ na-agwọ onwe ha ọrịa na mba Uganda.

Ndị sayensị na-eso ọzọdimgba ndị ahụ ma hụụ oge ha tara ahịhịa dị icheiche, ha weere ahịhịa ahụ ga mee nyocha ebe ha nọ chọpụta na ọtụtụ n’ime ahịhịa ndị ahụ nwere ihe na-egbu nje ma nwee ike ịgwọ ọrịa.

Ndị sayensi na-eme nyocha banyere ahịhịa ndị ahụ ọzọdimgba na-ata

Ebe foto si, Austen Deery

Nkọwa foto, Ndị sayensi na-eme nyocha banyere ahịhịa ndị ahụ ọzọdimgba na-ata

Ndị Sayensị ahụ bịputara nyocha ha na akwụkwọ a kpọrọ PLOS ONE JOURNAL nwere sị na ọzọdịmgba nwereike iyere ndị mmadụ aka ịchọpụta ọtụtụ ọgwụ ọhụrụ.

“Onyeisi ndị sayensị mere nyọcha ahụ bụ Dọkịnta Elodie Freymann bụ onye mahadum Oxford kwuru na ha enweghị ike inyocha ahịhịa niile dị n’ime ọhịa ahụ, mana ha nyọchara ahịhịa ndị ahụ ọzọdimgba tara, na nke ha hụrụ ka ọzọdimgba ahụ na-achọ.”

Dọkịnta Freymann jị ọtụtụ ọnwa n'ime afọ anọ nọrọ n’ime oke ọhịa Budongo ebe ọ nọ na-enyocha ọzọdimgba dị iche iche.

Freymann nyọchara ọzọdimgba ndị mere ahụ n'ụkwụ nọ na-azọjọ ụkwụ. Ha ji nsị na maamịrị ha wee lee ma o nwere nje maọbụ ọrịa.

Oge Dọkịnta Elodie Freymann na enweputa akụkụ osisi ọzọdịmgba tara

Ebe foto si, Austen Deery

Nkọwa foto, Dọkịnta Elodie Freymann

Ha tinyere uche ha n'oge ọzọdimgba ndị ahụ merụrụ ahụ wee taa ahịhịa maọbụ taa azụ osisi, na mkpụrụosisi dị iche iche bụ nke ha adịghị atabu na mbụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Freymann kwuru “anyi ji anya na-enyocha ihe nwereike igosi na ahịhịa ndị ahụ ọzọdimgba na-ata bụ ọgwụ”.

Ọ kọwara na e nwere ahịhịa ọzọdimgba merụrụ nnukwu ahụ tara.

“Ọzọdịmgba ahụ ejịghị ụkwụ ya aga ije. Oge ndị ọzọ na-eri nri, ọ hapụrụ ha ma gaa taa ahịhịa dị iche.

Ndị nyocha nwetara ahịhịa ahụ niile ọ tara ma ga mee nyoacha wee chọpụta na ahịhịa ọ traa bụ nke a kpọrọ 'Christella parasitica' nwereike ịkwụsị ụkwụ ọzịza.

Dọkịnta Fabien Schulz bụ onye mahadum Neubrandenburg dị na Germany mere nyocha ahịhịa ndị ahụ ọzọdimgba na-ata wee chọpụta na otu n’ime ha nwereike ịkwụsị ihe ọzịza ebe ndị ọzọ na-akwụsị ihe ịfụ ụfụ; nke a pụtara na ahịhịa ndị ahụ na-agwọ ọrịa.

Dọkịnta Freymann kwuru na ihe ruru pasenti 90 n’ọzọdimgba ndị ahụ meruru ahụ nwetechara ọgwụgwọ. Ma nke na-ete ụkwụ mechara were ụkwụ ya na-aga ije n'abalị ole ma ole.

Mana ọ kọwara na ha enweghi ike ikwu ma o nwere ihe ọzọ ọzọdimgba ndị ahụ riri maọbụ ka ha si taa ahịhịa ndị ahụ.

“Mana nke a na-egosi na e nwere ọgwụ mmadụ nwereike ịchọputa n’ime ọhịa site n’inyocha etu anụmanụ ndị ọzọ sị agwọ onwe ha ọrịa n'ime ọhịa.

Nke a gosiri na ọ dịmkpa na anyị chekwara ime ọhịa ndị a maka ichekwa ọgwụ ndị ahụ maka ndị mmadụ a ga-amụta n'ọdịnihu”